Olaudah Equiano: Ndị Igbo anọ si na mmegbu ghọrọ ndị ọchịchị

Olaudah Equiano

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Olaudah Equiano
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Mgbe ochie, mgbe a ka na-ere ndị mmadụ n'ohu, ọtụtụ ndị Igbo bụ ndị erepụrụ n'ohu.

N'agbanyeghị na erepụrụ ha n'ohu, ha gosipụtara akọnauche Chineke jiri gọzie ha.

Edemede a ga-egosi gị ụfọdụ ndi Igbo erepụru dịka ọhụ ma sitekwa n'ọhu, nwere onwe ha ma bụru mmadụ.

ARCHIBALD JOHN MONTEITH

Archibald Monteith bụ onye na-agbasa ozi nke Kraịst

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Archibald Monteith bụ onye na-agbasa ozi nke Kraịst

Monteith bụ onye e repụrụ n'ohu n'ihe dịka afọ 1802.

Dịka akwụkwọ ụkọchukwu Joseph Horsfield Kummer dere maka Monteith na-ekwu, o kwuru na aha Igbo ya bụ Anaeso.

Anaeso sị na ọ bụ onye 'Eboe' nke bụ etu ha si ede Igbo oge ahụ.

O kwuru na nna ya lụrụ naanị otu nwaanyị n'agbanyeghị na ọtụtụ ụmụnwoke na-alụ ụmụnwaanyị karịa otu oge ahụ.

O kwuru na aha nne ya bụ Dirinejah, onye mụrụla nna ya ụmụ anọ nke bụ ụmụnwaanyị atọ na otu nwoke.

Anaeso sị na ọ bụ 'Tschuku' ma ọ bụ 'Tschuku-damma' ka ha na-ekpere tupu atọrọ ya mgbe ọ dị afọ iri.

Ikenga
Nkọwa foto, Chukwu na Ikenga so n'ụfọdị chi ndị Igbo na-efe

Anaeso sị na ọ bụ onye chọro ịlụ nwanne ya nwaanyị repụrụ ya n'ohu.

Ihe ikpeazụ ọ gwara nwoke ahụ bụ "Biko keleere m nna m ma gwakwa ya ebe m nọ".

Njem ya n'oke osimiri

Ndị ejidere achọrọ ire n'ohu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụgbọmmiri ka e ji ezupu ndị e jidere n'ohu

Anaeso sị na ihe tụrụ ya n'anya bụ mgbe ọ hụru otu nwoke aka ya na ụkwụ ya nakwa ntutu isi ya na-acha ọcha.

O kwuru na akpọbatara ha bụ ụmụaka n'ụlo onyeisi ụgbọmmiri ebe ndị okenye nọ n'okpuru ụgbọmmiri ahụ.

Ọ kowakwara na ọ bụ ji na mmanya 'Rum' ka a na-enye ha, kama ọtụtụ ndị mmadụ ekweghị iri nri ma o bụ ịṅụ mmanya maka obi adịghi ha mma.

Etu "Anaeso" si bụrụ "Toby"

Ọtụtụ ndị mba Ameríka nwere ohu mgbe ochie

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mba Ameríka nwere ohu mgbe ochie

Ugbọmmiri bu Anaeso na ndị ohu ndị ọzọ buru ha gaa mba Jamaịka.

Ọ bụ ebe a ka nna ya ukwu bụ Maazị Monteith zụtara ya n'ahịa ohu.

Anaeso bụ nwata nwere 'ihuọma' dịka nna ya ukwu kpọbatara ya n'ime ụlọ ya ka o biri ma baa ya aha ọzọ; "Toby".

Nna ya ukwu zigara ya ka ọ gụọ akwụkwọ, kama Anaeso sị na o nweghị uru ọhụrụ akwụkwọ bara mgbe ahụ.

Mgbe nna ya ukwu nwụrụ, nwa ya nwoke ketara ya n'oke were mee ya onyeisi ihe niile o nwere.

Mgbe o bidoro zawa Archibald Monteith

David Monteith na ndị ụmunna ya

Ebe foto si, @úkpúrú/Twitter

Nkọwa foto, David Monteith onye nna ochie ya bụ Anaeso, chọpụtara ebe nna ya ochie si.

Anaeso sị na ọ kwụrụ onye ụkọchukwu shịlịn asatọ ka o mee ya mmiri nsọ.

O kwuru na ihe o jiri mee ya bụ na o kwenyere na ọ ga-eme ka ọ gaa ebe mara mma mgbe ọ nwụrụ.

Ihe ndị Jamaica ji mara Archibald Monteith

Anaeso busoro ịgba ohu agha ma jiri izisa oziọma nke Kraịst megide ịgba ohu na mba Jamaịka.

Anaeso sị na o nwere ala sara mbara nke ukwuu nke ọ gbatara na mbọ.

Ọ mụtara otu nwa nwaanyị.

Ihe gbasara mgbasa oziọma Kraịst na-anụ ya ọkụ n'obi.

Olaudah Equiano (1745 - 1791)

Olaudah Equiano

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Olaudah Equiano

Olaudah Equiano bụ nwa afọ Igbo nke erere ya na nwanne ya nwaanyị n'ohu.

Equiano kọwara na ọ dị afọ iri na otu mgbe e rere ya n'ohu ma sịkwa na a mụrụ ya n'ihe dịka afọ 1745.

O kwuru na ụgbọ ohu bu ha gawa 'West Indies'.

E si ebe ahụ buga ya obodo Virginia ebe onyeisi ụgbọmmiri bụ Michael Henry Pascal zụtara ya.

Ihe onyonyo na-egosi ka esi eme ndị ohu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe onyonyo na-egosi ka e si eme ndị ohu

Ọ bụ nna ya ukwu bara ya 'Gustavus Vassa' nke bụ aha eze ochie ndị mba Swidin.

Equiano mụtara etu e si agụ ma na-ede ihe, nke mere ka o dee akwụkwọ ya bụ 'The Interesting Narrative of the Life of Olaudah Equiano or Gustavas Vassa, The African.'

Akwụkwọ ya kpataara ya nnukwu ego.

Nna ya ukwu nke ikpeazụ bụ onye gwara ya na ya kwụọ ya paụnd iri anọ ka o nwere onwe ya.

Equiano gbara mbọ were nweta ego a n'afọ atọ.

O mechara bụrụ onye nke Kraịst n'afọ 1759.

Equiano so na ndị gbara mbọ ịhụ na mba Briten kwụsịrị igba ohu site n'akwụkwọ o dere.

N'afọ 1786 na Lọndọn ka Equiano sonyere n'otu a kpọrọ 'Sons of Afrika' ndị na-agba mbọ ịhụ na mba Briten kwụsịrị igba ohu.

Equiano nwụrụ n'afọ 1797, ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụ ya nwaanyị abụọ.

Ahebi Ugbabe - Ezenwaanyị Igbo n'ọchịchị ndị ọcha

Ihe esere ka o yie Ahebi Ugbabe
Nkọwa foto, Ugbabe lụrụ otutu ụmụnwaanyị ọkachasi ụmunwaanyị dị ha na emegide

A mụrụ Ahebi Ugbabe n'obodo ụmụida nke dị n'Enugwu-Ezike.

Nna ya bụ onye na-ete nkwụ ma na-akọkwa ugbo.

Ugbabe si ala nna ya gbapụ dịka ndị obodo ha chọrọ ka ọ bụrụ ohu nye agbara nwaanyị ha na-efe.

Ọ gbagara obodo Igala were bụrụ onye akwụnakwụna.

Etu a ka o si mata Eze Igala na onye na-anọchite ndị mba Briten mgbe ahụ.

Ọ mụtara etu esi asụ Bekee egbujiri egbuji, Nupe na Igala.

Mgbe ndị Briten wakporo ndị Enugwu-Ezike ka ha mere ya eze n'ihi na o nwereike ịnụ asụsụ ndị Briten.

Ugbabe mere ọtụtụ ihe ime ka ụmụnwaanyị nwee ikike n'ala Igbo mana ụfọdụ atụmatụ ndị a butere esemokwu.

Ọ lụrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị ọkachasị ụmụnwaanyị ndị di ha na-emegide, nwa ọbụla ha mụrụ n'ụlọ ya na-aza aha Ugbabe.

Ọ bụ ezie na Ugbabe abụghị ohu, kama o si na ihe mperi dị ukwu wee bụrụ eze n'ala Igbo.

Jaja nke Opobo

King Jaja of Opobo

Ebe foto si, Getty Images

A mụrụ Jaja n'obodo ụmụduruoha, Amaigbo nke dị n'Imo steeti, n'afọ 1821.

Mbanaso bụ aha Igbo ya, mana eji Jugbo Jugbo mara ya n'Opobo.

Ndị ọcha enweghị ike ịkpọ Jugbo Jugbo nke mere ha ji kpọwa ya 'Jaja of Opobo'.

E jidere Jaja dịka ọ na-egwu egwu were resi ya Eze Iganipughuma Alison nke Bonny.

Jaja gbara mbọ n'ịzụ ahịa were nweta nnukwu akụnaụba.

Jaja nke Opobo
Nkọwa foto, Jaja ji aka ya chọta ma bulie obodo Opobo

Ike jaja mere ka onye Briten jiri kwuo na ọ bụrụ na egbughi jaja na o nweghị onye ya na Jaja ga-amanwu aka.

Esemokwu mere ka Jaja gbapụ Bonny were nweta obodo nke ya ma nwekwa ndịagha siri ike.

Ike Jaja mere na ndị mba Briten na-akpọtụrụ ya ma nata ya ikike tupu ha azụọ ahịa n'Opobo.

Mgbe ndị Gana na-enye ndị Briten nsogbu, ọ bụ Jaja nyere ndị Briten aka merie ha.

Ike Jaja na-akpa mere ka ndị Briten chọwa etu ha ga-esi napụ ya ike; ha mechara mee ka Jaja gaa biri n'ala ọzọ.

Jaja hụkwara Ezenwaanyị Briten mana enweghị onye ma ihe ha abụọ kpara.

Ndị be ya mechara mata na Jaja ka dị ndụ na mberede.

Aha onyonyo, King Jaja of Opoba: Ndị ntọ tọọrọ ya mgbe ọ gbar afọ 12

Jaja nwụru dịka ọ na-alaghachi Opobo n'afọ 1891.

Ka akụkọ si kwuo, e ji nsị gbuo ya n'ime ụgbọmmiri bu ya ala.