Hollywood: Ndị Igbo nọ ebe ahụ

Ụzọ Adụba so na ihe onyonyo 'Orange is the new black'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụzọ Adụba so na ihe onyonyo 'Orange is the new Black'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Igbo so n'otu ndị a kacha mara n'ụwa niile n'ihi na aga njem n'ebe niile ụwa sọtụrụ.

Ugbua anyi ga-etinye anya wee hụ ihe ndị Igbo wetara tinye n' ihe gbasara ihe onyonyo na egwu na Hollywood.

Ha bụ ndị eji eme ọnụ na Hollywood

Ndị Igbo nọ na Hollywood

Ebe foto si, Getty Images

Nonso Anozie, Ashley Madekwe na Chinwetel Ejiofor bụ mmadụ atọ na-eme ihe onyonyo na Hollywood.

Ha emela ihe onyonyo ama a ma dịka "12 Years a Slave", "Revenge" na "Game of Thrones".

Mmanwụ Mgbedike

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

E gosiri ihu mmanwụ a kpọrọ 'Mgbedike' bụ njirimara Ndigbo. Ọ bụghị sọsọ Igbo na-ekpu mmanwụ mana e ji nke a mara anyị.

Okpu mme

Ọkpụ mme ndị Igbo

Ebe foto si, Kendrick Lamar/Youtube

Onye oti egwu Kendrick Lamar gosiri okpu mme bụ njiri mara ndị Igbo n'ihe onyonyo egwu ya bụ "All the stars"

Aha na asụsụ ndị Igbo

Danai Gurira na Winston Duke

Ebe foto si, Getty Images

N'ihe onyonyo "Black Panther", Danai Gurira zara 'Okoye' bụ aha Igbo ebe Winston Duke mere ka M'baku sụrụ asụsụ yiri asụsụ Igbo

'Igbo Landing'

Beyonce n'ime ihe onyonyo "Love Drought"

Ebe foto si, Beyonce/Vevo

Ụnụ ama na n'oge ndịọcha n'akpụrụ ndị isi ojii ndị Igbo dịka ndịohu, ọtụtụ ndị Igbo dagbunyere n'ime mmiri kama ha ga-ekwe bie ndụ ha dịka onye ohu?

Ya ka bekee kpọrọ "Igbo Landing", eji ya ama atụ n'ụwa niile ma na a sọpụrụ ndị Igbo maka ụdị mmụọ ha nwere.

Beyonce megharịrị ihe a n'ime onyonyo egwu ya bụ "Love Drought" nke pụtara n'afọ 2017.