Ammonium Nitrate: Ihe ọ bụ nakwa etu o si ememina mmadụ

Ọkụ ọgbụgba Beirut

Ebe foto si, Reuters

Mba Lebanon ka na-eru uju dịka oke ọkụ gbachara n'isi obodo mba ahụ bụ Beirut gbuo mmadụ kaịrị 100 ma merụọ mmadụ kaịrị puku anọ ahụ (4000) n'ụbọchị Tusde.

Obodo Beirut niile mara jiji maka oke ọkụ ahụ malitere n'ọdọụgbọmmiri tupu ọ gbawa ka ogbunigwe.

Onyeisiala mba ahụ bụ Michel Aoun kwuru na ọ bụ ammonium nitrate ruru tonne 2,750 a na-edozighị ọfụma kamgbe afọ isii n'ụlọ a na-edowe ngwongwo butere ya bụ mgbawa ọkụ.

Gịnị bụ ammonium nitrate?

E nwere ọtụtụ ihe e ji ammonium nitrate eme, mana ihe abụọ a kachasị e ji ya eme bụ iji ya wulite ihe akọrọ n'ugbo ma bụrụkwa ihe mgbawa.

Ọ na-aka agbawa ma ya na ọkụ jekọọ, ọ gbawa o wepụta gasị jọgburu onwe ya a na-akpọ nitrogen oxides nakwa ammonia.

Aha onyonyo, "Now I dey shake, all di way from up to down" - Eyewitnesses describe di power of di explosion

Maka etu o si agbawa, enwere usoro dị oke mkpa eji edowe ya:

Nke mbụ bụ ị ga-edowe ebe ọkụ agaghị agbali ya, agaghị enwe ihe dịka ọwa mmiri maọbụ paip dị n'akụkụ ya makana ihe ndị a nwereike ibute ọkụ mgbawa di egwu.

Akụkọ na-ekwu na 2,750 tonnes a edozighị ọfụma na Beirut bụ nke otu onye tụbatara na mba ahụ n'afọ 2014 mana gọọmenti Lebanon jichiri ya, ma bido inyocha nkwa kpụpụ onye ahụ n'ụlọikpe.

Okwu ka dị n'ụlọikpe tupu ọkụ ọgbụgba a eme.

Ammonium nitrate na nke nke

  • E ji ya akọ ugbo
  • E ji ya egwupụta ọnatarachi n'ala
  • Ọ bụghị ihe mgbawa kama ya na ọkụ jekọọ nsogbu adị
  • Ọ gbawa, o na-ewepụta gasị nwereike igbu mmadụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: