Gas Explosion: Anwụrụ agbagbuola ụmụaka abụọ n'Ajegunle

Ebe foto si, LASEMA
Na Legọs, gaasị gbara n'ụlọọrụ a na-ere gaasị egbuola ụmụaka abụọ ma merụọ mmadụ iri abụọ na atọ ahụ na Ajengunle Legos, dịka ndị ọrụ gbata gbata si kwuo.
Ha kwukwara na a gbachiela gburgburu ahụ ịji malite nnyocha banyere ihe butere ya bụ ihe gbaranụ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga Equatorial Guinea
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
N' aka nke ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga njem ọrụ na mba Equatorial Guinea echi.
Buhari na-aga ebe ahụ ịnọchị anya Naịjirịa na nzụkọ mba ndị na-ebupu Gaasị mba ndị ọzọ.
N'ofesi

Ebe foto si, Ghana Presidency
Mba Gana enyela ihe ruru mmadụ otu narị na iri abụọ bụ ndị mbịarambịara biri ọtụtụ afọ ikike ịbụ ndi ala ahụ.
Onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo gwara ndị ahụ ha gbaa mbọ hụ na ha emeghị ihe ga-ebutere mba ọhụrụ ha ajọ aha.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, AFP
Ọkwa Naịjirịa arịala ogogo anọ na ndekọ egwuregwu boolu nke FIFA mere na mba ụwa niile n'ọnwa Novemba
Nke a pụtara na Super Eagles nọzi n'ọkwa iri atọ na otu n'ụwa nakwa ọkwa atọ n'Afrịka.
Akụkọ ụwa n'otu nkeji
Super Eagles: 'Ọnweghị ihe obiụtọ dị n'ọrụaka Gernot Rohr' - Fashanu

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu otu n'ime ndị isi na Football Federation Board nke Niajirịa bụ John Fashanu sị na onweghị ihe na-eme ya obi ụtọ na ọrụ Gernot Rohr.
Anyị nụrụ na ọ si na Rohr enweghị ike ịzụpụta ndị egwu bọọlụ ga abụ ọkaibe na mba Afrịka.
APC Edo ka nọ n'ihu ọkụ

Ebe foto si, Getty Images
Ihe na-ebe ka na-ebe na APC Edo state ka ha jụrụ na ha agaghị aga ọgbakọ ndị ngalaba nke Ọdịda anyanwụ pati ha kpọrọ.
N'ozi ozipuru n'ụtụtụ Tọzde, onyeisioche pati ahụ n'Edo steeti bụ Anselm Ojezua sị na akpọturughị ha tupu e hibe ọnọdụ ya bụ ọkpakọ.
Ortom emeriela an Benue

Ebe foto si, AFP
N'ozi ozipuru n'ụtụtụ Tọzde, onyeisioche pati ahụ n'Edo steeti bụ Anselm Ojezua sị na akpọturughị ha tupu e hibe ọnọdụ ya bụ ọkpakọ.
Gọvanọ Benue steeti bụ Smuel Ortom amaliela elu ka ụlọikpe mgbegharị sị ya chiri gawa.
N'ikpe ha kpebiri ụbọchị Tọzde, ha bụ ụlọikpe wezugara akwụkwọ onye APC bụ Emmanuel Jime gbara ị sị na ya ekweghị na mmerị Inec nyere Ortom.
Onyeisiala Benin Republic sị EU puo n'ala ha

Ebe foto si, Getty Images
Gọmenti mba Benin enyela onyenọchịta anya EU na mba ahụ ụbọchị mbu n'ọnwa Disemba ka ọkwara lii n'mba ahụ.
Ha sị na Ambassador Oliver Nette na-etinye ọnụ n'okwu agbasaghị ya bụ nke nwere ike ịbute ọgbaaghara na be ha.
Ụmụnwoke 47 agọrọla ụkwụ na aka ha n'ebubo banyere mmekọ ahụ nwoke na nwoke nke bụ agwa megidere iwu Naịjirịa.
Iwu Naịjirịa kwuru na onye ikpe mara maka ihe a ga-aga mkpọrọ afọ 14.
Ụmụnwoke ndị pụtara n'ụlọikpe dị na Legọs ụbọchị Wenesde bụ nke 28 n'ọnwa Nọvemba so n'ime 57 ndị uweojii nwụchiri n'afọ 2018 n'obodo Egbede dị na Legọs.
Ndị uweojii sị na a na-eche ndị iyi ọnụ maka ịba n'otu "ụmụnwoke na-edina ibe ya", mana ndị a eboro ebubo sị na ọ bụ emume ncheta ọmụmụ mmadụ ka ha gara.
Ikpe bụ nke a ga-eji nwaa iwu megidere alụmndị maọbụ mmekọ nwoke na nwoke ehibere mgbe Goodluck Jonathan na-achị Naịjirịa n'afọ 2014.
Nhibe iwu a butere Jonathan ajọ aha n'etiti ndị na-achị mba ụwa ọkachasị David Cameron nke mba Briten.
Onwebeghi onye a mara ikpe site n'iwu a, mana ụfọdụ ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye dịka "Human Rights Watch" sị na-eji ya amaja ndị mmadụ ma nara ha ego n'ike.
Ndị na-ekpe ndị a ikpe gwara ụlọ ntaakụkọ Reuters na ha ga-achọ ịkpụta mmadụ iri ndị ọzọ so n'ime mmadụ 57 amara ikpe ka ha bịa soro zaara ọnụ ha.
Ikpe ndị a ga-amalitekwa n'ụbọchị 11 nke ọnwa Decemba.
Ndị Customs mba ọdịda anyanwu zukọrọ maka bọda

Ndị isiọrụ Customs Ọdịda anyanwu mba Afrịka e nweela nzụkọ N'Abuja ụbọchị Tuzde maka okeala Naịjirịa e mechiri ọnwa atọ gara aga.
Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed na-akọwa na ha ekwekọrịtabeghị ịmeghe ya maka na mba ọdịda anyanwụ ndị ọzọ anaghị edowe iwu ụtụisi ha.
Najirịa na-esi ọnwụ ịlawa utuisi n'elu ngwaahịa ọbụla na abata be ha.
Ndịisi Customs mba atọ a bidebere onwe ha zukọtara itinye ọnụ na ya bụ okwu bụ nke Naịjirịa sị na ọ na ebutere ha njọ ahịa.
Cheta n'ọnwa July, Naịjriịa tinyere aka na akwụkwọ maka nkwado azụmahịa n'etiti mba atọ a bụ agbata obi.
Mana Naịjrịa n-atụ egwu na ndị ejizi be ha mere ikpoahịhịa ebe ngwongwo sị mba ndị ọzọ na enubata na be ha maghara ịtụ ụtụisi, ma na-akụkwara ndị ọrụaka Naịjriịa ọrụ.
Naịjrịa sị na ha ga-emechi okeala a ruo ọnwa Jenuwarị, ebe ha ritagoro uru ruru pasenti iri atọ maka mmanụ fuel ndị mmadụ na-ezupu, dịka Lai Mohammed kwuru.
Trump etinyela aka n'akwụkwọ maka Hong Kong

Ebe foto si, Reuters
Ka anyi ga na mba mba Amerịka ebe Onyeisiala Donald Trump tinyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka mba Amerika na-etinye anya na ikike diiri onye na Hong Kong.
Ebe ndị ọchịchị China na Hong Kong na-akatọ ya bụ iwu, ndị na-azọ mnwereonwe na Hong Kong sị ọ magburu onwe ya.
Liverpool a na-agba ọnyụpaa?

Ebe foto si, AFP
N'egwuregwu, Liverpool bụ ndị bu iko Champions League nke afọ gara aga ka na-akpụakpụ na sizin a site na otu ọkpụ onye nawa onye nawa ha na ndị Napoli gbara onwe ha ụnyaahụ.
Nke mere na Liverpool abanyenwughị gba nke ebe otu egwu boolu iri na isi ga-achipụ ya.











