Fire in Yaba: E menyụola ọkụ na-agba n'ọdọahịa dị na Yaba

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo & Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Akụkọ na-eru anyị ugbua bụ na ndị ọrụ gbatagbata emenyụọla ọkụ na-agba n'otu ọdọahịa dị n'ahịa Yaba dị na Legọs n'ehihie Tọọzde.
Ndị nọ ebe ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọkụ ahụ bidoro n'ọnụ ụlọ otu onye, mana etu ọ dị, onweghị onye nwụrụ.
Ha kwuru na ọ bụ ngwa igwe ọkụ a kwụnyere n'ọkụ latrik nwuru ọkụ ka e wetara ọkụ.
Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ bịara mana ha ahụb=ghị ohere gbanyụ ọkụ ahụ ngwangwa n'ihi igwe mmadụ gbakọtara ebe ahụ.

Mana ha mechara gbanyụọ ọkụ ahụ.
Ụlọọrụ gbatagbata Legọs a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ kwuru na o nweghị onye nwuru n'ọkụ ọgbụgba, naanị mmadụ abụọ merụrụ.
Ha gbara ama n'ọkụ ahụ kpara ike nke mere ụlọ ahụ jiri gbawacha aja ụlọ ahụ mee ka ọ daa.

Burna Boy ga-arịọ anyị mgbaghara - ndị ntorobịa South Afrịca

Ebe foto si, Instagram/Burnaboy
Ọtụtụ ndị ntoroọbịa mba Saụt Afrịka ekwuola na Burna Boy ga-arịọ ha mgbaghara tupu ọ bata obodo ha ọzọ.
Nke a bụ maka ihe Burna Boy kwuru n'oge a wakporo ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka.
Burna Boy bụ onye otiegwu Naịjirịa aha ya na-ewu ewu n'ụwa niile.
N'oge ahụ, o kwuru na ya agaghịzị atụ ụkwụ na Saụt Afrịka ọzọ ruo mgbe gọọmentị mba ahụ ga-akwụsị ogbugbu a na-egbu ụmụ Naịjirịa ebe ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Burna na onye otiegwu Saụt Afrịka aha ya AKA, sere nnukwu okwu n'ihi ya bụ ihe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ugbua, Burna kwuru na e nwere emume a kpọrọ ya ka ọ bịa kụọ egwu na Saụt Afrịka.
O kwuru na ego a ga-akwụ ya n'emume ha agaghị aba n'akpa ya kama ọ ga-agara ụmụ Naijirịa e mebiri ihe ha na mwakpo Xenophobia n'oge gara aga.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mana ndị ntorobịa Saụt Afrịka na-ekwu na soshal midia na Burna ga-arịọrịrị ha mgbaghara tupu ha ekwe ya ịbata obodo ha ọzọ.
Ụfọdụ kwuru na ha edegarala gọọmentị akwụkwọ ka Burna Boy ghara ịtụ ụkwụ na be ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4

End of X post, 5

End of X post, 6
Atọhapụla ọkaikpe ndị ntọrị ji
Ọkaikpe Chioma Nwosu-Iheme enwerela onwe ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii na Edo steeti bụ Chidi Nwabuzor gwara BBC Igbo na nke a bụ eziokwu.
Mana okweghị ekwu etu ọkaikpe ahụ si nwere onwe ya.
Cheta na ndị ntọrị nwụchiri Ọkaikpe Nwosu-Iheme na Benin, isi obodo Edo Steeti n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba.
Ndị ekperima ahụ gbagburu onye uweojii na-eche ya nche tupu ha akpụrụ ya.
Sowore na ndị DSS

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook
Ndi ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ State Security Service ka na-ekwusị ike na ha agaghị atọhapụ Omoyele Sowore ganye na ndị gbaara ya aka ebe abịa ịkpọrọ ya.
Peter Afunanya, onye okwuru ọra ndị DSS kwuru na Femi Falana, bụ onye ọkaiwu Sowore, ma ihe o kwesịrị ime tupu atọhapụ ya, mana ọchọghị ime ya.
Bayelsa aghọọla ọgbọ agha

Ebe foto si, Alambo Datonye
Mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' mere ịchụ nta vootu na Bayelsa Steeti n'ụbọchị Wenezdee.
Nke a mere n'obodo Ogbolomabiri nke dị n'okpuru ọchịchị Nembe na steeti ahụ.
Ụmụokorọbịa anya na-acha ọkụ bucha egbe dabata n'ama egwuregwu 'King Koko Square' ma chụsasịa ndị mmadụ.
Ndị mmadụ ka nọ na-eche onye Douye Diri bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ na pati PDP mgbe ya bụ ọgbọaghara malitere.
Onye ọkwọụgbọala nke Radio Bayelsa na otu onye ọzọ bụ ndị mgbọ tụgburu.
Ọtụtụ ndị ọzọkwa merụrụ ahụ. Ha nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, US Embassy
N'otu aka ahụ, mba Amerịka ekwuola na ha ga-ata ndị ọbụla tinyere aka n'ọgbaaghara na Bayelsa Steeti ahụhụ.
Onye nnọchiteanya mba ahụ na Naịjirịa bụ Claire Pierangelo kwuru na onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla aka ya dị n'ọgbaaghara agaghị enwe ike ịba Amerịka ọzọ.
Pierangelo kwuru na anya Amerịka na-eke ka ọkụ na ya bụ ntuliaka a ga eme n'ụbọchị Satọdee.
Akwa mmiri 'Third Mainland' a na-ama jijiji?

Ebe foto si, Getty Images
Ụjọ atụla ụnụ. Gbachịnụ ndị asịrị nkịtị. Akwa mmiri 'third mainland' siri ike, ọ naghị ada.
Nke a sị n'ọnụ gọọmentị etiti gbasara asịrị na-efegharị na akwa mmiri ahụ na-amazi jijiji nke na o nwere ike ịda.
Ebola enweela ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, WHO
Otu ahuike mba ụwa akwadola otu n'ime ọgwụ ndị arụpụtara maka iji gbochie ọrịa ebola.
World Health Organisation kwuru na nke a ga-enye aka iji hụ na ọrịa ọjọọ a kwụsịrị ịgbasa n'ọtụtụ mba Afrịka dị icheiche ebe ya bụ ọrịa na-akpa mkpamkpa ugbua.
WHO kwuru na a ga-amalite ịgba ndị mmadụ ọgwụ ahụ n'aafọ 2020.
Super Eagles enwetala mmeri

Ebe foto si, Twitter/Super Eagles
Mmeri ka Naịjirịa ji malite asọmpi e ji akwado maka iko mba Afrịka nke afọ 2021 n'ama egwuregwu dị n'Uyo, Akwa Ibom Steeti ụnyaahụ.
Benin Repọblik bu ụzọ gbaa aka ahịa mana Victor Osimhen na Samuel Kalu nyetere goolu abụọ Naịjirịa ji wee merie.
England na Montenagro

Ebe foto si, PA Media
Mba England na ndị Montenagro ga-ezute onwe ha taa n'asọmpi nkwado maka egwuregwu Euro 2020.
Naanị otu akara ka ọ fọdụrụ ka Ịngland tozuo oke iso na ya bụ egwuregwu.
Ndị ọzọ ga-agba bọọlụ n'abalị taa gụnyere:
Tọkị na Aịsland, Pọtụgal na Lithuania, Fransị na Mọldova

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: