Africa's longest snake: Anyị gburu Eke ogba ọ bụghị Eke Idemmili - Ndị Oba

Ọ bụ eziokwu na ndị Idemmili dị n'Anambra steeti anaghị egbu eke kama ha na asọ ya asọ dịka omenala ha siri dị.
Mana ha gburu nnukwu eke dịka o lochara atụrụ abụọ dịka Nairaland siri gbaa n'ama.
Onye isi Okpuno Oba town Union bụ Christian Igwilo gwara BBC na Eke ha gburu bụ ajọ Eke ogba nwere ike igbu mmadụ n'ihi ya osoghi na eke Idemmili na-asọpụrụ.
Igwilo Kọwara na otu nwoke Onyeka Emole na achọ atụrụ ya abụọ n'obere ọhịa dị n'ihu ụlọ ya mgbe ọhụrụ ya bụ eke karịrị feet 15 ebe oloro atụrụ ya ma tọgbọrọ.

Onyeka Emole gwara BBC na kemgbe nne ya jiri mụọ ya rute tata na anya ya ahụbeghị ụdịrị eke ahụ mbụ.
Ọ kọwara ma ọ bụ nwunye ya bu ụzọ hụ eke ahụ mana ọ mataghị ihe ọ bụ.
Ngwa ngwa ọ kpọrọ ya ka ọ chọpụtara na ọ bụ eke ọgba, nke a mere o jiri tikuo ndị obodo ka ha bịa gbatara ya ọsọ enyemaka.
Onyeisi Okpuno Oba town union kọwara na ọ bụzị ndị nche Neighborhood watch gbakatara ya bụ eke ọgba egbe tupu ọ nwụọ.
Mgbe ụmụ okorobịa Oba buzi ozu Eke ahụ gaa na junction Oba, ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ụgbọala gbakọrọ na agbara anya ha ekeresimesi.
Akụkọ ga-amasị gị:









