Nigeria Vs Benin: Ugo Nigeria atụgbuola ọsa Benin Republic

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Super Eagles nke Naịjirịa gosiri na ha ka sokwa n'ihe a na-eme ka ha ji goolu abụọ a satara otu merie Bene Repọblik.
N'asọmpi e ji akwado ntozuoke ndị ga-eso sọọ mpi Iko Mba Afrịka nke 2021 a gbara n'ọgbọegwuregwu dị n'Uyo, Akwa Ibom steeti, ndị Super Eagles ekweghị ezu ike ruo mgbe ha nwetara mmeri.
Stephane Sessegnon nke Bene bu ụzọ dọpụta ọbara ka o nyere goolu na nkeji atọ e ji malite bọọlụ.
Mana goolu Victor Osimhen ji penariti gbanye na nkeji 45 iji saa ya na nke Samuel Kalu nyere na nkeji 63, zuru iji gwa ndị Bene bụ ọbịa ha 'kwakọrọ lawa'.
Mmeri ndị Super Eagles abụghị naanị ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ makana ụfọdụ ihe na-atọ ọchị mere maka ndị na-egere egere.
Ọmụmaatụ bụ etu onye na-akọwa ihe na-eme n'ọgbọegwuregwu si kwuo na Alex Iwobi ka na-agbara Arsenal bọọlụ kama Everton.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọzọ tọrọ ọchị bụ etu onye ahụ sikwa kwuo sị: "Super Eagles 2, Naịjirịa 1".
Mana ọ ghọtara onwe ya, rịọ mgbaghara maka nkwuhie o kwuhiere.
Ọzọ bụ na etu ha si lee bọọlụ n'elu ihe onyonyo amasịchaghị ha.
Ọtụtụ kwuru na etu igwe na-ese foto si na-eseta ọgbọegwuregwu ahụ nakwa ihe na-eme n'ime ya, dị ka nke ndị mgbe ochie.
Ihe nkiri a ga-amasị gị:











