Ile anya n'ara nwaanyị ọ na-agbati ndụ nwoke ?

- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
Ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta ahụ nwoke na nwaanyị ekwuola hoha na o nweghị mgbe nchọpụta sayensi ji kwuo na nwoke ịchado nwaanyị anya n'ara ga-adọtị ndụ ya.
Otu onye n'ime ha aha ya bụ Pamela Udoka, BBC Igbo jụrụ maka ya bụ nchọpụta sị na ọ bụghị eziokwu n'ogo sayensi kwuru na onye ọbụla buputere nchọpụta ahụ mere ya ka aha ya wuo ewu.

Mana onye ọzọ bụ Mmirimmasinachi Ekechukwu kwuru na ọbụrụ ma uche nke ya, ya bụ ihe nwekwara ike ịbụ eziokwu.

Ebe foto si, Mmirimmasinachi Ekechukwu
Lee ihe Ekechukwu kwuru:
- O nweghị mgbe ya bụ atụmaatụ a ji bụrụ nke e dere n'akwụkwọ.
- O kwuru mana n'anya nke ya eziokwu dị na ya bụ atụmaatụ maka na ụmụnwoke ji anya eri.
- Ụmụnwoke na-elelekarị ụmụnwaanyị mara mma makana ọ na-akwụsị ha ọbara mgbalielu.
- Ọ ga-adị mma ka ụmụnwaanyị lụrụ dị na-ejike onwe ha ọfụma maka di ha ka o wee na-ele ihe niile dị na-ahụ ha ka ndụ ya gbatikwuo.
- Nwaanyị ọbụla mara mma kwesiri ịghọta na nwoke ga-elelerịrị ya anya, nke a ekwesighi ịgbakasị ya ahụ.
- Obi na-aka nwaanyị ọbụla nwoke na-elerikarị maka na ọ matala na ọ mara mma

Ebe foto si, PAMELA UDOKA
Lee ihe Pamela Udoka kwuru:
- O nweghị eziokwu dị na nchọpụta ahụ.
- Onye obi ụtọ bụ onye obi ụtọ.
- Onye mere nchọpụta ahụ chọrọ ka ụwa nwee ihe ha ga-eji na-ekwucharị ọnụ.
- "I na-ele m anya n'ara ịbụ di m"?





