Xenophic attack: 'Ọnweghị ezigbo ihe mere e ji wakpọ ndị be anyị ọzọ na Saụt Afrịka' - Onowu na Saụt

Ụlọahịa agbara ọkụ na Saụt Afrịka

Ebe foto si, Jonas Ezeani

Nkọwa foto, Ụlọahịa agbara ọkụ na Saụt Afrịka

Na mwakpo ọhụrụ e nwere na Witbank na Mpumalanga Province dị na Saụt Afrịka akụkọ na-eru anyị ntị bụ na e meruru mmadụ anọ ndị Naịjirịa ahụ ma gbakwa ụfọdụ ụlọ ha ọkụ.

Onowu ndị Igbo na Saụt Afrịka bụ Ezeali Udeji Jonas gwara BBC Igbo na ya na onyeọrụ Naịjirịa akwụkwọ ikike njem dị n'aka gara ebe ya bụ ihe mere were anya ha hu.

Ezeali sị na ha hụrụ ụlọ ndị mmadụ ndị omekome ahụ gbara ọkụ ya na ụlọahịa nwafọ Igbo Obinna Nwanaji so n'ihe ya bụ ọkụ gbara.

Ọ sị na ozi ya nwetere tupu ha agawa njem nlete ahụ bụ na ndị isi ọkwọụgbọala na Province ahụ malitere ịgba ụlọ ndị mmadụ ọkụ n'ụtụtụ ahụ.

Mgbe ha ruru ebe ahụ, "a gbara ụlọ ise ọkụ, atọ n'ime ha bụ nke ndị Naịjirịa' ma merụọ ndị Naịjirịa anọ ahụ, dịka Ezeani si kwuo.

Ọnowụ ndị Igbo na Sawụt Afrịka

Ebe foto si, Ezeali Udeze Jonas

O kwukwara na "ha zukwara ngwaahịa ndị be anyị ọkụ tupu ha agba nke fọrọ ọkụ".

Ọ sịkwa na ha gara ụlọọrụ ndị uweojii ije jụọ ha ebe ya bụ mmiri sị baa opi ụgbọghịrị.

Ụlọahịa agbara ọkụ na Saụt Afrịka

Ebe foto si, Jonas Ezeani

N'olu ya, ụsa ha nyere ha bụkwa otu ihe ha kọọrọ ha n'afọ gara aga mgbe ụdị ihe a meburu.

BBC ka agbalịri ịnwete ndị uweojii Saụt Afrịka ka ha zara ọnụ ha mana ha ebughị ekwenti ha.

Lee ihe nkiri a

Aha onyonyo, Mama Jessie Onuigwe: Mama dị afọ 104 ji ọrụ ugbo zụọ ụmụ ya

Akụkọ ka amasị gị