Ebonyi State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara na steeti a

Galena

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Galena
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Nchọpụta kwuru na Ebonyi steeti so na steeti kacha daa ụbịam na Naịjirịa, mana nke ahụ nwere ike ịgbanwe n'oge na-adịghị anya.

Nke a bụ maka na steeti ahụ nwere ọtụtụ ihe akụ ọnatarachi nke ha nwere ike ileba anya na ya iji bugharịa ọnọdụ obodo ha.

Ka anyị leba anya na ụfọdụ n'ime ha dịka 'Raw Materials Research & Development Council' si kwupụta:

1) 'Nnu (Salt)'

Aha onyonyo, Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a.

Ebọnyị nwere oshimiri ndị gbara ya gburugburu nke nnu bara ụba n'ime ya.

Ụmụnwaanyị ndị ime obodo n'Ebọnyị nwere ụzọ ọdịnala ha si ewepụta nnu n'ime mmiri oshimiri.

Mana ọ dịịrị gọọmentị ileba anya ịmata ụzọ ọgbara ọhụrụ nakwa Teknụzụ nke nwereike ime ka mmepụta nnu bawanye ma na-ewetawanye nnukwu ego.

Nnu bara ụba na mpaghara Afikpo North nakwa Ohaozara.

Ewepụ na e ji nnu esi nri, ihe ndị ọzọ ejikwa ya eme buru ibu.

Ha gụnyere nke bekee kpọrọ 'dyeing' na 'bleaching' dgz.

2) 'Galena'

Galena

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Galena

Galena bụ okwute ojii a na-egwupụta n'ime ala.

Ọ na-adị ka nke bekee kpọrọ 'lead', mana ya na 'lead' abụghị otu ihe.

A na ahụkwa kịrịrị ọla ọcha n'ime Galena, nke mere ọnụ ahịa ji adị elu.

A na-ere otu tọn Galena otu puku dọla, narị asaa na iri abụọ.

E ji 'Galena' arụpụta ihe na-enye ụgbọala maọbụ igwe ekwentị ike nke a kpọrọ 'battery'

Akụkụ Afikpo North na South nwere Galena n'ụbara.

3) 'Limestone'

Igwe e ji akwọri 'limestone'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Igwe e ji akwọri 'limestone'

Limestone bụkwa nkume ọcha e ji emepụta ntụ e ji arụ ụlọ nke Bekee kpọrọ 'cement'.

E jikwa ya emepụta 'Marble'.

O juru eju na mpaghara dị iche iche n'Ebọnyị.

Ha gụnyere, Abakiliki, Ishielu, Afikpo North na South, nakwa Ohaozara.

4) 'Granite'

Aha onyonyo, Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu

Granite bụ nkume siri ike na-acha ọcha. Mana enwekwara ụdị granite na-eji oji.

Ọ bụ ịrụ ụlọ, akwa mmiri, nakwa ịchọ ụlọ mma ka e ji ya eme.

Ị gaa na mpaghara Ivo, Ọnicha, Afikpo, Ebonyi nakwa Ohaozara, ebe ahụ ka e nwere granite n'uju.

5) 'Marble'

E ji 'marble' achọ ụlọ mma dị ọgọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E ji 'marble' achọ ụlọ mma dị ọgọ

Marble bụ nkume na-esi na 'Limestone' dị ọkụ apụta.

Ọkụ ala nwere ịkụ ghekpọọ 'limestone' n'ime ala, mezie ya ka ọ ghọọ marble, dịka ndị ọkacha mara si kwuo.

E ji marble a arụ ụlọ, jirikwa ya achọ ụlọ mma.

E jikwa ya akpụ ihe ọkpụ dị iche iche.

Marble na-ada oke ọnụ ahịa.

Abakiliki, Afikpo na Ohaozara bụ mpaghara Ebọnyị e nwere Marble.

6) 'Laterite'

Laterite

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E ji laterite arụ ụzọ

Bụ aja ụrọ na-acha mmeemmee.

Ihe e ji ya emepụta dị ọtụtụ dịka ịrụ ụzọ nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ.

E ji ya emekwa nkume pụrụ iche e ji arụ ụlọ nke Bekee kpọrọ 'Bricks.

Na mpaghara Afikpo ka a na-enweta 'laterite' nke kacha mma.

7) 'Ball Clay'

Ball clay

Ebe foto si, naturalindiaminerals.com

'Ball clay' bụ ụdị aja ụrọ na-acha ọcha.

E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics'.

"Ceramics' bụ ihe e ji emepụta ihe dị ịcheiche dịka efere nakwa iko a chọrọ mma, na-akụwa akụwa.

E jikwa ya akpụpụta ihe ndị e ji achọ ụlọ mma.

Ọbụ n'akụkụ osimiri ka a na-enwetakarị ya.

N'akụkụ ụfọdụ n'Afikpo South ka e nwere 'Ball Clay'.

8) 'Shale'

Shale

Ebe foto si, Getty Images

'Shale bụ okwụte ojii si n'aja ụrọ apụta.

Ọ bara urunke ukwuu maka mmepụta 'cement', 'ceramics', 'tile' nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ.

A na-agawakọ 'shale' na 'limestone' iji mepụta 'cement'

Na mpaghara Ọnịcha ka e nwere 'shale' n'Ebọnyị steeti.

Ebonyi bụkwa otu steeti na Naijiria e ji ịkọpụta osikapa mara.

Osikapa Abakiliki magburu onwe ya ma na adakwa ụda n'Afrịka niile.

Ihe ndị a nwere ike inye aka ka Ebọnyi steeti wulie akụnụba ha.

Akara ntụ-ntụ

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru