Lawyers' Wigs: Gịnị kpatara ndị ọkaiwu ji ekpu 'wig'?

Ebe foto si, Twitter/@ProfOsinbajo
Ịbụ onye ọkaiwu so n'otu ọrụ kacha nwee ugwu n'ụwa.
Ndị ọkaiwu bụ ndị a ma dịka ndị ma oke akwụkwọ ma burukwa iwu obodo niile n'isi.
Ekike e ji mara ndị ọkaiwu na-apụkwa iche ma nwekwaa mpụtara dị icheiche.
Ekike ndị a gụnyere uwe ogologo ojii na okpu ọcha a na-akpọ 'wig'.
Gịnị ka okpu ndị ọkaiwu pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta BBC Igbo mere gosiri na ọbụ na mba Ịngland ka ụdị ekike ahụ malitere.
N'oge ahụ, ọbụ naanị ndị ọgaranya na-ekpu okpu pụrụ iche iji gosi akụnụba ha.
Ọbụkwa ndị ọgaranya na-abụkarị ndị ọkaiwu n'oge ahụ, nke a mere na ha na-eyi uwe ogologo ma kpurukwa okpu pụrụ iche.
Mana ugbua, n'obodo ndị mepere emepe n'akụkụ ụwa niile, ndị ọkaiwu anaghịzi ekpu ụdị okpu ahụ.
Ọ ka mma ka emelaa okpu ndị ọkaiwu a na Naịjirịa?
BBC Igbo gbara otu onye ọkaiwu aha ya bụ Amara Nwabueze ajụjụ ọnụ.
Nwabueze bụkwa onye nkuzi na ngalaba iwu na Mahadum Abiịa Steeti.
O kwuru na ọbụ eziokwu na ekpomọkụ buru ibu na Naịjirịa, mana nke ahụ ezughị iji sị ka akwụsị ya.
O kwuru sị: "Ịbụ ọkaiwu bụ ọrụ nwere nnukwu ugwu, o kwesịrị ka a na-akwanyere ya ugwu."
"Ọbụrụ na a sị onye ọbụla yiri ihe dị ya mma bịawa n'ụlọikpe, ndị mmadụ ga-emechu ugwu a na-akwanyere ọrụ ọkaiwu."
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia
Ụfọdụ na-ekwu na Naịjirịa ekwesịla ịgbajọ okpu nakwa uwe ogologo ndị ọkaiwu na eyi.
Ọkaiwu Chidi Odinkalu kwuru okpu ahụ adịghị mma maka ahụike mmadụ n'ihi oke ekpomọkụ dị na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ike Aguata kwuru na ihe izi ọ ga-eme ma o nwee ohere bụ ịkwụsị ya bụ uwe ogologo nakwa okpu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana @effe_ndi kwuru na ndị ọkaiwu na mba UK ka na-ekpukwa okpu ahụ ma abịa n'ikpe dị aghaa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












