World Bank Loan: 'Etinye ego a n'ọrụ ghara ịjụ ase, ihe na-ebe ga na-ebe' - Sam Amadi

Ebe foto si, AFP
Ọ bụghịzị ihe ọhụru na gọọmenti Naịjirịa e bitela ego ruru ijeri dọla isii ($3B) bụ nke ha sị na-aga etinye n'ọkụ latrik iji mee ya ka ọ bụrụ anyụ anyụ.
Minista na-ahụ maka okwu ego bụ Zainab Ahmed kwuputara nke a mgbe ha gara ọgbakọ ndị World Bank bụ ndị binyere Naịjirịa ya bụ ego,
Kemgbe ahụ, ndị ọnụ na-eru n'okwu na ya bụ ọrụ na-enyocha ọnọdụ ya bụ ego mgbazite.
Na mkparịta ụka ya na BBC n'ụtụtụ Monde, Sam Amadị, onye bụbu onyeisi ndị Nigerian Electricity Regulation Commission (NERC) sị na ọ bụghị ịnata ya bụ ego bụ ihe kacha mkpa.
Kama na ọ bụ ịhazigharị ọnọdụ ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik nke a kpọrọ 'Distribution Company of Nigeria'.
Amadị kọwara na NERC ekwubuola na ha ga-anapụ ndị 'Distribution Company of Nigeria' ikike n'ihi amaghị eme ha.
O wee jụọ ma "ọ bụ ndị ahụ NERC kwuru na ha amaghị ọrụ ka a ga-enye ya bụ ego ka ọ bụ onye?'

Ebe foto si, Sam Amadi
Amadị kwuru na "gọomenti kwesiri ibu ụzọ gbanwee ndị DISCO a ọnụọgụ ha dị iri na otu tupu ha ekewe ya bụ ego ka ihe mere mbụ ghara ịme ọzọ".
O kwukwara na gọọmenti ugbua kwesikwara ịjụ ajụjụ maka ego ndị a gbazitere mgbe gara aga.
Amadị kọwara na gọọmentị kwesịrị ilebara nkesa ọkụ latrik anya nke ọma.
"Ọ bụrụ na edozie usoro ịbusa ọkụ (transmission) ghara ịdozi ụzọ esi ezịsa ya n'ụlọ ndị mmadụ (distribution), ihe na-ebe ga na-ebe", dika Sam siri kwuo.
Ya mere o jiri dị mkpa na-ekwesiri ịkwadokwa ndị DISCO bụ ndị ọ bụ ọrụ ha izisa ya bụ ọkụ n'ụlọ ndị mmadụ.
BBC gbakwara Okaiwu Sunday Oduntan bụ Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ na-ezisa ọkụ latrik.
N'onu ya, ya bụ ego dị mkpa ịnata ma ọ bụru na-aga etinye ya n'ọrụ dịka okwesiri maka na ọ ga-enye aka ka ọkụ a na-enye gbagota.
Oduntan kwuru na kemgbe enyefere ndị nkịtị ọrụ ịzịsa ọkụ na ha enwebeghị uru na ya bụ ahịa.
"Ụgwọ e ji DISCO ruru otu tarị naịra na ụma atọ (N1.3tn). Ọ bụru na-enye ha ego a, ọ ga-enyere ha aka ịgo akụrụngwa e ji enye ọkụ ma mee ka ọkụ dị gbanyụụ".
Ọ kwekwara n'ezie na ọ bụrụ na etinye ya bụ ego n'ọrụ, na ọnụahịa ọkụ latrịk ga-arị nwamgbenta, mana ọ ga-emecha rituo n'ọdịnihu.
BBC enweghị ike ịnwete ndị Mịnịstrị na-ahụ maka ego ka ha kwuo ka ha ga-esi kwụọ ya bụ ụgwọ mgbe e nwetere ya.











