Kogi State: Edward Onoja abụrụla osote Gọvanọ Kogi steeti

Ebe foto si, @EKELEHARUNA
Edward Onoja aṅụọla iyi ọrụ dịka osote Gọvanọ nke Kogi steeti.
Nke a mere dịka ndị ụlọomeiwu nke Kogi steeti nyochara ya were nye ya akara ntụrụugo ka ọ bụrụ osote Gọvanọ.
Ọ bụ ọkaikpe kachasị na Kogi steeti bụ Nasir Ajana duru ya n'iyi ọrụ n'ihu Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahya Adoza Bello na ndị omeiwu ndị ọzọ.
Cheta na nke a mere dịka ndị ụlọomeiwu nke Kogi steeti chụpụrụ Simon Achụba dịka osote gọvanọ maka omume ha sị rụru arụ n'abali atọ gara aga.
E mere Achuba osote Gọvanọ n'ọnwa Febrụarị n'ime ọnwa ole na ole o si otu 'Peoples Democratic Party' were banye 'All Progressive Congress'.
Idemmiri achụsasịala ndị bi n'Isheri na Legọọsi.
Mgbe Gift Andrew onye ntaakụkọ BBC gara ji anya ya hụ ihe na-eme, ọ hụrụ na ndị mmadụ agbasasịala hapụ ụlọ ha niile maka idemmirị.

Ndị bi ebe a ekwuola na ha enwebeghi ọkụ kemgbe oge tere aka.

Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ na-ebo gọọmenti na ha na-anara ụlọọrụ na-akụ azụ aka azụ iji dọtị oge ha kwesiri iji gbahapụ mmiri n'ebe eji mmiri emepụta ọkụ akpọrọ "Dam."
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ onyeisi "River Basin Authority" nke Ogun na Osun steeti mana onyeisi ngalaba ahụ bụ Olufemi Odufemi kwere anyị nkwa ịwepụta ọsịsa ya n'akwụkwọ ozi azabeghị anyị ruo ugbua.
Ndịagha egbuola onye ntọ na Kaduna

Ebe foto si, AFP
Iko otu onye ntọ ejula dịka ndịagha gburu ya ma wakpo ogige abụọ ha si arụ ọrụ na Chikun dị na Kaduna steeti.
O bụ Ezindu Idimah kwuchitere ndị nchekwa anya uhie uhie a bụ nke 'Operation Whirlp Punch' were sị na ha napụtara ndị nto a otu egbe, ogbatumtum atọ, n'ihe ndị ọzo.
Gọọmenti etiti ebitela ego maka ọkụ latrịk

Ebe foto si, Federal Ministry of Finanace
Gọọmentị etiti na-ekwu na ha ka na-agbasi mbọ ike iji mee ka ọkụ latrik na-adị mgbe ọbụla na Naịjirịa.
Iji mee nke a, Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Zainab Ahmed kwuru na ụlọakụ mba ụwa ekwela ibinye Naịjirịa ijeri dọla atọ.
Ahmed kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe e mechara nzụkọ nke ndị 'World Bank' na ndị 'International Monetary Fund' na-eme kwa afọ.
Ọ kọwara na ego ahụ ga na-abịa na nkeji na nkeji bido n'ọnwa Eprel nke afọ 2020.
Ahmed kwukwara na ego ahụ nwere ike ịrị ruo ijeri dọla anọ.
A chọtala onye uweojii ndị ntọ tọọrọ

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii agbapụtala otu onyeisi ha atọọrọ na Suleja, Niger state, na mgbede Satọọde.
Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na ha tọhapụrụ onyeuweojii ahụ na mgbede ụbọchị ụka.
O kwukwara na ha nwụchiri mmadụ abụọ a na-eche na ha so na ndị ntọ ahụ.
Na Kaduna
Akụkọ ka na-apụta na Kaduna ebe ndị uweoji tọhapụrụ mmadụ dị otu narị na iri anọ na asaa bụ ndị a kpọchiri n'otu ụlọ n'ụbọchị Satọdee.
Ndị uweojii kwuru na ọtụtụ n'ime ndị ahụ bụ ndị atụrụ ịga n'ụkwụ na aka ihe karịrị afọ asatọ.
Ha kwukwara na ha amalitela ịkpọghachi ha n'ezinụlọ ha.
Ngagharịiwe na Chile

Ebe foto si, AFP
Mmadụ ise nwụrụ na mba Chile mgbe ndị na-eme ngagharịiwe mụnyere ụlọorụ na-arụpụta akwa ọkụ n'ụbọchị ụka.
Ngaghrịiwe a bụ maka mbuli e buliri ọnụego ụgbọ oloko.
Ndị ọchịchị mba ahụ ebutuola ọnụ ego ahụ ka ọdịkwa ka ọ dị na mbụ, mana nke ahụ emeghị ka ngagharịiwe kwụsị.
Ndị kpara opke agbụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Anwuchiela mmadụ abụọ bụ ndị nkwado egwu bọọlụ maka ikpa oke agbụrụ na asọmpi ntozu FA cup na etiti Haringey Borough na Yeovil Town n'Ingland.
Agwa a rere ure mere ka akwụsi asọmpi a.
Man Utd vs Liverpool

Ebe foto si, Reuters
Manchester United tetara n'ụra ụbọchị ụka na asọmpi ha na Liverpool nke biri n'onye lawa onye lawa.
Liverpool che na ha ga-agwọ Man Utd ka abacha, mana ha chọpụtara na ọbụghị etu akị ilu si ada n'ọnụ ka o si atọ.
Gere nkeji anyị

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












