PDP agwala Yahaya Bello na ọgbaghara agaghị azọpụta ya

Yahaya Bello

Ebe foto si, @GovBello/Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu PDP zipụla ozi dọọ APC na Yahaya Bello nke Kọgi steeti aka na ntị gbasara ntụlịaka imeụlọ ha.

N'akwụkwọ ozi ha wepụtara ụbọchị Wenezde, ha boro Bello bụ aka na-achị Kogi steeti ebubo ibute ọgbaghara na ntụliaka ha mere na mgbede Tuzde.

PDP sị, "mwakpo na ọgbaghara agaghị azọpụta gị n'ihi na ndị Kogi ekpebiela ịchụ gị na patị gị n'ọnwa Novemba."

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Ha kwuru na ihe niile na-aga ọfụma na ya bụ ntụlịaka imeụlọ tupu ndị bu egbe na-akpọ aha Bello dabata n'ọgbọ ahụ wakpo ha.

Cheta na otu PDP mere ntuliaka ha ụnyaahụ bụ Tuzde iji họpụta onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'aha ha na Kogi steeti.

Ọzọ,

Ebere Amarizu

Ebe foto si, Ebere Amarizu

Ndị uweojii n'Enugwu amalitela mkparịtaụka n'etiti ha na obodo dị icheiche na steeti ahụ.

Obodo ebe ndị ha metụtara bụ Nsukka taa, Udi echi nakwa Agbani n'ụbọchị isii nke ọnwa sepụtemba.

Na akụkọ ofesi,

Ndị uweojii na mba Italy

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii mba Italị anwụchiuela otu nwoke jị nwa ya dị afọ asataọ ebu ọgwụike.

A zụụ nwata ahụ etu e si ama nke bụ ike nakwa akara nzuzo metụtara ụgbọala oji aga ya bụ ozi.

N'egwuregwu

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Emmanuel Dennis bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa n'otu Brugge esorola na ndị Gernot Rohr kpọrọ o ku isonye Super Eagles.

Cheta na Naịjirịa na-akwado izute mba Yukraine n'ụbọchị iri nke ọnwa Sepụtemba n'asọmpị enyi na enyi.

O ruola mgbe Naịjirịa ga-adọbi ụdọ mmekọ ha na South Afrika - Ekweremadu

Ekweremadu

Ebe foto si, Ike Ekweremadu

Ndị ọnụ na-erụ n'ọkwụ n'ala Igbo bụ Ike Ekweremadu na Enyinnaya Abaribe itinyela ọnụ n'okwu gbasara mkpamkpa na-akpa na mba Saụt Afrịka.

Ekweremadu sị na ihe na-eme na mba ahụ egosighị ezi agwa njirimara mba Afrịka ma ọlị.

O kwusiri ike na ọge erụọla mgbe Naịjirịa ga-adọbi ụdọ ọgbụgba ndụ ha na Saụt Afrịka.

N'otu aka ahụ, cheta na ụnyaahụ, Enyinnaya Abariba gwara gọọmenti Naịjirịa na oge ịgba egbeọnụ agaala.

Ha tinye okwu ha n'ọrụ iji kwụsị kpam kpam arụ ndị mba Saụt Afrịka na akpasa ndị Naịjirịa.

Ndị agha Naịjirịa akpachiela Boko Haram

Ndị agha Naijiria

Ebe foto si, AFP

Ndịagha Naịjirịa akpachiela ụgbọala bu ngwa nrị, ngwa ọgbatumtum na mmanụ ụgbọala e che na ọ bụ nke ndị Boko Haram n'ịmo ọhịa dị na Borno Steeti.

Onyeisi ndịagha Lafiya Dole bụ Olusegun Adeniyi kwuru na ọ bụ site n'ịkpachị ụzọ ndị a ga ha ga-eji nye Boko Haram ọsọ.

Ụlọọrụ EFCC ejidele mmadụ abụọ ọzọ ndị FBI kpọrọ aha

Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa

Ebe foto si, EFCC/Facebook

Ụlọọrụ EFCC anwụchiela ndị Naịjirịa abụọ ọzọ aha ha so na mmadụ iri asaa na asaa ndị ụlọọrụ FBI wepụtara maka iji kọmputa eme mpụ.

Onyeisi ụlọọrụ a n'Abuja bụ Aminu Aliyu sị na ha nwụchiri Chika Augustine na Godspower Nwachukwu n'Abuja na Tuusde abalị atọ ọnwa Seputemba 2019.

Mwakpo mba Saụt Afrịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii na Saụt Afrịka bụ Bheki Cele, Premier nke Gauteng bụ David Makhura na Elias Mawela mgbe enwere mwakpo na mba Saụt Afrika

Kọmishịọna ndị uweojii na Gauteng mba Saụt Afrịka bụ Elias Mawela ekwuola na ha achọpụtawala ndị ndu otu na-eme ọgbaaghara.

O kwukwara na a ga-anwụchi ha n'oge na-adịghi anya.

Super Falcons na Tokyo 2020

Cameroon meriri mba New Zealand

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons gbara ndị ogbo ha Ọọjerịa otu ọkpụ goolu iji gafee n'agba nke atọ itozuoke n'asọmpi Olympic Tokyo 2020.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị