WAEC 2020: Ule Waec nke afọ 2020 amalitela ugbua, lee etu o si aga

Dịka a malitere ule Waec n'ụbọchị 17, nke ọnwa Ọgọst 2020, BBC Igbo gagharịrị Enugwu steeti iji mata ka ụfọdụ ụlọakwụkwọ siri rube isi n'iwu Covid-19.
N'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ụmụnwaanyị nke Trans-Ekulu dị n'Enugwu, ụmụakwụkwọ niile yi mkpuchi imi ma nọsapụ anọsapụ dịka iwu si kwuo.
Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Ijeoma Okpe, dugharịrị anyị n'ime ụlọ ebe a na-ele ule a, ma gosikwa na onye ọbụla ma ndị nkuzi ma ụmụakwụkwọ, ga-akwọ aka tupu ha abanye ule.

Mara na e ji mgbakọ na mwepụ bụ "Mathematics" na Bekee, malite ule a n'ụlọakwụkwọ Trans-Ekulu.

Ule 'maths' Waec ọ gbapuru?
Akụkọ pụtara na akwụkwọ e ji aza ule maths gbara n'ezi, mere ka ọtụtụ ndị kpụrụ ya n'ọnụ ma tinyekwara ụfọdụ nọ na-achọ ya ọkụ ọkụ.
Mana ngalaba West African Examination Council (Waec) ekwuola na ọ bụkwa akwụkwọ adịgboroja ka ha hụrụ na-efegharị n'elu soshal midia na ebe ndị ọzọ.
Ụlọọrụ Waec nke dị na Naịjirịa gwara BBC na ọ bụ ndị wayo na-ekesa akwụkwọ adịgboroja ndị ahụ, nke ha chọrọ iji gwuru ndị mmadụ ego ha.
Demianus Ojijeogu bụ ọnụ na-ekwuchitere Waec na Naịjirịa, kwuru na ọ bụghị eziokwu na e leela ule maths na Ghana dịka kepukepu si ekwu.
Ojijeogu kwuru sị "Ahụrụ m atọ n'ime akwụkwọ ndị ahụ na-efegharị ụnyaahụ, ha niile bụcha adịgboroja.
"Ọ ga-atụ nwata akwụkwọ ọbụla ji ya bata n'ebe a na-ele ule n'anya mgbe ọ ga-ahụ na ọ dị iche na nke ọ ga-ele".
Mara na ihe ruru ndị ụmụakwụkwọ otu nde na ụma malitere ule Waec taa.
Lee usoro e si ele Waec nke afọ a
Ngalaba na-ahazi ule sekọndịrị bụ Waec n'aha ịchafụ ahazigharịala etu a ga-esi dee ule ahụ ọzọ.
Ha wepụtara usoro ọhụrụ a n'ụbọchị asaa nke Ọgọstụ n'akara Twitter ha.

Ebe foto si, Delta State Government
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ngalaba na-ahazị ule sekọndịrị bụ Waec n'aha ịchafụ kwuru na ule 'waec' afọ a ga-amalite n'abalị iri na asaa nke 'ọnwa Ọgọstụ rue abalị iri na abụọ nke ọnwa Septemba.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Tuuzde ka ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị na Naịjirịa malitere agụmakwụkwọ ọzọ maka ndị nọ n'afọ ikpeazụ na sekọndịrị.
Lee akwụkwọ niile nakwa ụbọchị ndị ewepụtara a ga-ele ya n'uju ebe a:








Ụjọ ji ụmụakwụkwọ maka ule WAEC bịaara ha na mberede

BBC Igbo kpagharịrị n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Enugwu Steetị ịmata ka ụmụakwụkwọ ji akwadọ maka ule WAEC na-abịa n'izuụka abụọ n'ihi mmepegharị ụlọakwụkwọ.
Ụfọdụ ụlọakwụkwọ BBC Igbo gara gụnyere Trans Ekulu, bụ ebe ụmụakwụkwọ malitere akwụkwọ taa mana ụmụakwụkwọ ebidobeghi ọmụmụ.
Ụmụakwụkwọ a kwara arịrị na maka ule WAEC na-achọ ịmalite 17 Ọgọstụ na ha adịghị njikere n'ihi ịnọte aka n'ụlọ na-enwe ezi ọmụmụ ihe.

N'ụlọakwụkwọ Geofrey Okoye dịkwa n'Enugwu, agụmaakwụkwọ amalitebeghi kama a sị ha ga-amalite n'ụbọchị 5 ọnwa Ọgọstụ.
Ụlọakwụkwọ Urban Sekọndịrị nke ụmụakwụkwọ sị na a kpọkọtara ha ma sị ha lawa bidokwa echi.

N'ụlọakwụkwọ Queens, ọ bụ eziokwu na ụlọakwụkwọ emepeela mana ụmụakwụkwọ nọ na-akpagharị n'ezi ụlọakwụkwọ ahụ.

Dịka ewepụla mmachị ma nye ikike ka ụlọakwụkwọ bido agụmakwụkwọ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Ọgụst bụ Monde.
Iwu a bụ nanị ndị nwere ule ọpụpụ ka gọọmentị nyere ikike ibido.

Ndị ntaakụkọ anyị gara n'ụlo akwụkwọ dị iche iche iji hụta etu ya bụ mmepe agụmakwụkwọ si gaa.
Ụlọakwụkwọ n'Enugwu ekela nkwụcha maka agụmakwụkwọ ndị nke ọpụpụ.
BBC gagharịrị Enugwu iji mata ka ha si dị nkwadebe.

Na ụlọ akwụkwọ Trans Ekulu girls sekọndịrị skull, principal ya bụ ụlọ akwụkwọ bụ Oriaku Ijeoma Fidelia Okpe kwuru na ha emechaala nkpocha na nzachi classroom nakwa gburu gburu niile.

Okpe gosiri ka o si dọta tanki mmiri nakwa ebe a na-akwọ aka maka ụmụ akwụkwọ na ndị nkuzi.
Ọ kọwara na ule ha ga-ebido n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọgụst 2020.

Ule ndịa gụnyere WAEC, NECO na BECE bụ maka ndị ọgba nke JSS3.
Ndị nkuzi na Nike grammer school na Government Technical College Enugwu kwukwara na gọmenti Enugwu emeela"fumigation" makwa "decontamination" n'ụlọ akwụkwọ ha nakwa njikere ndị ọzọ.


Anambra Steeti
Nnamdi Azikiwe Secondary School Abagana.
Onyeisi ụlo akwụkwọ Nnamdi Azikiwe secondary School bụ Fidelis Obalum kwuru na ha adịla njikere ka ụmụakwụkwọ bido agụmakwụkwọ.

O kwukwara na ha ehiwechala ma tinye ihe niile gọọmentị nyere dịka usoro iji chekwa ụmụakwụkwọ.
Obalum na-atụ anya na ihe dịka n'ime ụbọchị abụọ na ha ga-ebido agụmakwụkwọ.














