Igbo Language: Ụzọ ndị ụlọ akwụkwọ sị ata ụmụaka ahụhụ ma ha sụọ Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Anambra steeti amanyela iwu gbochiri ụlọa kwụkwọ na steeti ahụ ịta ụmụakwụkwọ ahụhụ maka ịsụ asụsụ Igbo.
Ha kwuru na o megidere iwu ji steeti ahụ ịtya nwata ọbụla ahụahụ maọbụ ịda ha nha ma ha sụọ Igbo n'ụlọ akwụkwọ.
Dịka ọ dị ugbua amaghị ma mmachị a ọ gụnyere Mahadum mana ọ bụ n'ụlọ akwụkwọ pramarị na sekọndrị ka ihe a kachasị eme.
O nwere ụfọdụ ụzọ ndị ụlọ akwụkwọ si akwụsị ụmụaka ị sụ asụsụ Igbo nke ụfọdụ che na ọ bụ ihe Bekee na-akpọ 'Vernacular' n'ime ụlọ akwụkwọ.
Ha na-ada anyị nha

Ebe foto si, Getty Images
Chukwuname Obiejesi bụ onye ntaakụkọ BBC gụrụ akụkwọ nỌwụwa Anyanwụ Naịjirịa kọwara na mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ praịmarị, a na-ada ha nha
"A na-edetu aha ndị sụrụ Igbo ma napụta ha naịra iri na ngwụcha ụbọchị" ka o kwuru.
Ịma njakịrị
Kelechi Agbanelo kwuru na ya na onwe ya ahụghị iwụ ọbụla machiri ịsụ asụsụ Igbo mgbe ọ gụrụ akwụkwọ.
"E nweghi iwu pụrụiche megidere ị sụ Igbo mgbe ahụ mana ụmụakwụkwọ ị be gị ga na-amasa gị njakịrị" ka o kwuru.
Ị ta ahụhụ
Onye ọzọ anyị jụrụ ajụjụ bụ Chimezie Ucheagbo kwenyere n'ihe Maazi Agbanelo kwuru.
O kwuru na a na-ata ha ahụhụ ndị dịka ịsị ha sekpuru ala maọbụ bara ha mba.
Damian Okeke-Ogene bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo nke Anambara steeti kwuru na atụmatụ ahụ magburu onwe ya ma rịọ ka nkuzi Igbo siwanye ike n'ụlọakwụkwọ dị icheiche.
O kwuru na ụlọakwụkwọ dị icheiche kwesiri ịtinye aka ka awụlite asụsụ Igbo kama ị na-akwụsị ya.
Ọ fọziri ị ma ma steeti ndị ọzọ n'ala Igbo a ga-eṅomi atụmatụ a.
Na Legọs steeti, ọ bụzi iwu na onye ọbụla chọrọ ka ọ gụọ mahadum ga amarịrị ịsụ Yoruba.










