Ịta 'red meat' a dị gị mma n'ahụ? Lee ihe mere anyị ji ajụ

Ebe foto si, Foodace
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ịta anụ na-amasị ọtụtụ ndị Naijiria, mana ajụjụ dị mkpa bụ na ị na-atatara onwe gị nsogbu?
Ụfọdụ oge ka ị ga-anụ ka a na-ekwu na ọ dịghị mma ịta anụ, ọkachasị anụ nnama, mana ọ bụ eziokwu?
Dịka ihe niile nọ n'ụwa, anụ ọkachasị nke a na-akpọ "red meat", nwere uru ma nwekwaa ọghọm.
Ọghọm dị n'ịta anụ dịka "red meat":
- Ịtabiga ụdịrị anụ a oke nwere ike ibutere gị ọrịa akpụ a na-akpọ "bowel (colorectal) cancer", nke bụ kansa nke ime afọ
- Ịtabiga anụ ndị a na-esi na red meat a emepụta dịka nke Bekee kpọrọ "bacon" nakwa "sausage" nwanne ya, nwereike itinye nwaanyị na nsogbu ibute kansa nke ara - dịka ndị ọkammụta si kwuo
- Ọ na-ebute mgbali abụba bụ nke Bekee kpọrọ "cholesterol", n'ọbara mmadụ
- O nwekwara ike ibute mkpọnwụ ahụ.
N'ihi na o nwejuru ihe ndị sayensị na-akpọ "nitrate" nakwa nnu na oke abụba kpụkọrọ ọnụ, ndị ọkammụta sayensị ekwuola na ọ dị mma iwebilata aka n'etu e si ata anụ a, ka ị nwee ike gbaara ọrịa na-eso oke "cholesterol" a ọsọ.
Oke cholesterol n'ahụ mmadụ nwereike ibute nsuchi obi, nke nwereike ibute obi nkoropu maọbụ ọrịa obi ndị ọzọ.

Ebe foto si, Foodace
Kedụ ụdịrị anụ bụ "red meat" a?
Ọ gụnyere:
- Anụ nnama
- Anụ ewu
- Anụ atụrụ
- Anụ ezi, wdgz
Mana ọ bụghị iwu na ị ga-agbachara ya ọsọ kpam kpam, n'ihi na ndị ọkammụta sayensị na-ekwu na e nwere ụzọ ọ ga-abụ i were ya mezie anụ a, dịka ị na-ewebilata aka na ya, ọ dị mma oriri ma ghara itinye gị n'oke nsogbu.
Uru dị n'ịta "red meat":
- Anụ dịka anụ nnama, nwa atụrụ nakwa nke ezi, bụ otu ebe ị ga-esinwu nweta ndozi ahụ nke Bekee kpọrọ Protein.
- Ọ na-enyekwa Zinc, Vaịtamin (B12) nakwa mineralụ, nke dịrị ahụ mmadụ mma.
Kedụkwanụ maka umeju anụ?
Ịta umeju anụ nwekwara uru nwee ọghọm.
Uru ya:
Imeju anụ na-enye ahụ mmeem (iron), ma na-enyekwa Vaịtamin A.
Vaịtamin A dịrị anya mma maka ịhụ ụzọ n'ime itiri, idozi ime ahụ mmadụ dịka imi nakwa inyere ahụ mmadụ aka n'ịlụso ọrịa ọgụ.
Ahụ nwoke toro eto chọrọ ntakịrị gram 700, ebe nke nwaanyị chọrọ 600 kwa ụbọchị.
Ọghọm dị na ya:
Ọ dịghị mma ịta oke imeju anụ, n'ihi na ka ị na-eri ya ka vaịtamin A ahụ nwereike ị na-adọ gị n'ahụ ebe ọ dị ukwuu.
Ahụ mmadụ na-adọkọ Vaịtamin A ọ na-ejighi rụọ ọrụ ruo ọdịniihu, bụ ebe ọ nwereike ibutere gị nsogbu mgbajisi ọkpụkpụ mgbe ị kawara nka.
Ịta anụ ọ dị nwaanyị dị ime mma n'ahụ?
Ị ga-atanwu anụ dịka nwaanyị dị ime, mana gbaa mbọ hụ na ị gbalahụrụ:
- Anụ na-eghechaghị eghe: gbaa mbọ hụ na e siziri anụ na-ata nke ọma tupu e rie ya, ka e nwee ike gbanarị ihe a na-akpọ "toxoplasmosis" ọsọ. Nke a bụ ọdụdọ afọ ime nke nwereike ime ka afọ ime ahụ pụọ. Ọ bụrụ na afọ ime ahụ apụghị, o nwereike imerụ nwa e bu n'afọ ahụ, ọkachasị ma ọ bụrụ n'isi mbido afọ ime.
- "Pate": Ụdịrị anụ a nwereike ibu nje a kpọrọ "listeria", nke nwereike ịmerụ nwa e bu n'afọ ahụ.
- Umeju na eriri afọ anụ: Anụ a nwere nnukwu Vaịtamin A; oke vaịtamin A nwereike ịmerụ nwa e bu n'afọ ahụ.
Ọkammụta Tim Key nke Cancer Research UK, kwuru sị: "Ọ bụghịkwa na ị ga-ekpebi na ị ga-akwụsị ịta anụ kpam kpam, mana ọ bụrụ na ị bụ ọta anụ, ị ga-etinye uche n'etu ị ga-esi webilatatu aka".
Etu ka mma isi emezi anụ ka ọ dị mma ọtịta
Ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na-edozi ahụ kwuru na ọ ka mma isi anụ esi ma ọ bụ mịa ya n'ọkụ na-etinyeghi ihe ọbụla, karịa ighe ya eghe, n'ihi na ighe ya eghe dị ka ịtụkwasị mmanụ n'elu abụba dị n'anụ.

Ebe foto si, Instagram/Ojinis_kitchen
Ha kwukwara na ọ ka mma ịta anụ ọkụkọ maọbụ torotoro, mana ọ ga-aka mma ịdọpụ azụ anụ ahụ ya iji webilata abụba dọkọrọ n'ahụ ya, tupu i rie ya.
Ha kwukwara na ọ ka mma ịta akụkụ ara ọkụkọ, ma gbaara anụ ndị dịka "sausage" nakwa nke a na-akpọ "pate" bụ anụ ahụ na-adị n'etiti achịcha burger ọsọ, n'ihi na ọ na-ebu oke nnu nakwa abụba.













