Azubuike Ekwegbalu: 'Ndị ọjọọ gbara na be nwanne m magbuo ya' - Chief Ekwegbalu

Ebe foto si, Nnamdi Ekwegbalu
Akụkọ BBC Igbo nwetere n'ụtụtụ Monde bụ na ndị ekperima amabeghi ndị ha bụ gara na be Azubuike Ekwegbalu n'elekere mbụ nke isi ụtụtụ were mma magbuo ya.
Azubuike Ekwegbalu bụ onye enyemaka pụrụiche nke Gọvanọ Willie Obiano nke Anambra steeti, n'okwu gbasara nchekwa.
BBC Igbo kpọtụụrụ nwanne ya nwoke bụ Ikechukwu Ekwegbalu bụkwa onyeisi ndị ahịa n'Anambra steeti niile gbaa gburugburu.
O kwuru na ndị uweojii Anambra steeti ka na-eme nnyocha gbasara ọnwụ nwaamadị ahụ. Ọ bụ mgbe ha mechere ya bụ nnyocha ka ha ga-amata nke bụ eziokwu.
Nwa Chief Ekwegbalu bụ Nnamdi Ekwegbalu kwuru na ọnwụ nwanne nna ya dara ha na mberede maka na ọtụtụ ndị ezinaụla ha tụkwasara ya obi.
Gee olu nwa nwanne Azubuike Ekwegbalu
Ọ kọwara ka ndị ajọ mmadụ a siri bata n'ụlọ ya gbuo ya.
Azubuike ji nwaanyị na ụmụ atọ tupu ọ hapụ ụwa.

Ebe foto si, Nnamdi Ekwegbalu
Nnamdị kwukwara na o nweghị mgbe a tụrụ anya na ụdị ihe a ga-eme mana nke bụ eziokwu bụ na ọrụ Azubuike dịka onye ọrụ nchekwa nwereike ibute ajọ echiche maka ndị ajọ mmadụ na-eche na ọ na-anọchiri ha ụzọ.
O kwukwara na ndị uweojii ka na-etinye anya na ya bụ okwu ma sịkwa na ha nwere olileanya na ha ga-ejide ndị mere ihe a ma kpụpụ ha ụlọikpe.











