Chioma Davido ewepụchaala ọtụtụ foto Davido n'igwe Instagram ya

Ebe foto si, thechefchi/Instagram
Ọ bụ etu a ka BBC Igbo si wee hụ ya mgbe ha gara n'igwe Instagram Chioma enyi nwaanyị Davido.
A hụrụ na nwaada Igbo a e ji eme ọnụ ewepụchala ọtụtụ foto Davido n'igwe Instagram ya dịka anyị hụrụ ebe a.
Naanị foto ọ hapụrụ n'akara ya bụ foto ebe Davido ku nwa ha nwoke bụ Ifeanyi nakwa ụfọdụ ndi ọzọ ha sere dịka ha nọ n'ebe oriri.
Nke na-abịa dịka kepkepu fegharịrị na-ebo ebubo na Davido na-ayị Mya Yafai bụbu enyinwaanyị otiegwu rap mba Amerika a ma dịka 'Young Ma.'
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Ị ma onye Chioma Davido bụ...?

Ebe foto si, @Chefchi
Ị ma ihe mere ndị mmadụ ji hụ Chioma n'anya?Chioma Avril Rowland bụ onye ndị mmadụ matara site na ọyị ya na otiegwu a ma ama bụ Davido na-ayị.
Ha abụọ malitere ịyị onwe ha mgbe ha zutere na Mahadum mana ugbua, ọ fọziri obere ka ha bụrụ di na nwunye.
N'afọ 2019, Davido depụtara na ọ gaala hụ ezinaụlọ Chiome nke Bekee kpọrọ "Introduction".
Mana ewezụga Davido, ị ma na o nwere ụfọdụ ihe ị maghị maka Chioma?Lee ya ebe a
1. Chioma bụ osinri kajara akaja nke mere na "Chef chi" a na-etu ya abụghị na nkịtị.
Ị chọọ ịma maọbụ eziokwu gaa na peeji Instagram ya @Thechefchi
2. Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Babcock nke dị n'Ogun steeti ebe ọ gụrụ "Economics"
Ọ bụkwa ebe ahu ka o zutere Davido na-agụ "Music" n'otu mahadum ahụ kwa.
3. Chioma, nne ya na nna ya nakwa ụmụnwanne ya bụ ndị Imo steeti.
Ha ncha bụkwa ndị ụka "Seventh Day Adventist"
4 O nweghi onye ma oke ihe maka ezinaụlọ ya mana o nwere otu nwanne ya nwaanyị a na-akpọ Jennifer na-akwa akwa.
5. Chioma mụọrọ Davido nwa nke atọ ya na nwa nwoke mbụ n'ọnwa Ọktoba afọ 2019.
Ha gụrụ nwa ahụ David Ifeanyi Adeleke. Nke a mere ka ufọdụ mmadụ na-akpọ Chioma "Mama Ifeanyi".
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
6. N'ụbọchị 27 nke ọnwa Maaachị afọ 2020, Davido kwuru na Chioma butere ọrịa Coronavirus.
Akụkọ a pụtara ihe dịka ha si njem mba Amerịka bata Naịjirịa.
Mana n'ụbọchị 19 nke ọnwa Eprelu, Davido depụtakwara na ọ gbakeela n'ọrịa ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post











