Coronavirus: Gịnị mere ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa a na Naịjirịa ji arị elu?
Pịa ebe a ka ị hụ ebe coronavirus kachasị emetụta ndị mmadụ n'ụwa.

Ọtụtụ mmadụ na soshal midia na-ada ebube etu ọnụọgụgụ ndị bu nje coronavirus jiri rie elu ruo dịka ndị a chọpụtara nwere ọrịa a ruru 1552, nke gụnyere mmadụ 195 a chọpụtara n'abalị Tuzde.
Ngalaba na-egbochi ọrịa Bekee kpọrọ "Nigerian Centre for Disease Control" (NCDC) bụ ndị wepụtara ọnụ ọgụgu ọhụrụ a n'akara Twitter.
NCDC na-enye akara mmadụ ole gbakerela na mmadụ ole nwụrụla.


Nke a na-abịa ka Naịjirịa nọ ihe karịrị otu ọnwa na mmachi ngagharị nke bidoro n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Maachị.
Dịka onyeisiala Buhari siri kwuo n'oge ọ manyere mmachi ngaghari a, ọ bụ iji belata mbanwanye nje coronavirus ma hazie etu a ga-esi buso ya agha ọfụma mere o jiri wepụta atumatụ ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Nke a mere ụfọdụ mmadụ, dịka onye ji akara @_oluwatobiiii, ji ajụ ihe mere eji ekwu okwu mmepe na-agbanyeghi na nje coronavirus na-abanwanye. Ma sị na ya achọghị atumatu ahu ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye ọzọ ji akara @zizoholic ede sị na etu ihe siri kwụrụ ugbua mere ka ya na-ajụ ọrụ mmachị ngagharị rụrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@MaraAzuh sokwa tie mkpu maka ọnụ ọgụgụ ọhụrụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mana kedụ ihe mere ọnụọgụgụ a ji arị elu kwa ụbọchị?
Ọtụtụ ihe kpatara ọnụọgụgu a ji na-abanwanye mana nke kachasị nke bụ ihe Bekee kpọrọ "community transmission".
Ọzọ bụ mwulite nnyocha ndị mmadụ.
Lee nkọwa atụmatụ abụọ:
1) 'Community transmission"
Community transmission, bụ nke Igbo na-akpọ "mfesa n'ime obodo", pụtara mgbe ndị mmadụ bi n'otu ebe malitere ịbunye onwe ha ọrịa ọbụla n'abụghị nke ha butere n'aka ndị si njem bịa n'obodo ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Onye mbụ a hụrụ ọrịa Coronavirus n'ahụ ya na Naịjirịa bụ otu nwoke onye Italy bịara njem na Naịjirịa mana ugbua, ọrịa ahụ ebidola mfesa n'ime obodo.
Na Legọs ebe ọnụọgụgụ kachasị maọbụ "epicentre" na Bekee, Gọvanọ steeti ahụ bụ Babajide Sanwoolu kwuru na ọ bụ n'ọnọdụ ahụ ka steeti ya nọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Nke a pụtara na ọ dịzi mfe mmadụ ịbunye ya ibe ya nke mere na ọtụtụ mba ka machiri ọgbakọ ọha mmadụ nakwa ịmanye iwu akwa mkpuchi ihu iji belata ya bụ mfesa.
2) Mwulite ihe niile gbasara nyocha
Kemgbe onye mbụ butere ọrịa ahụ, ngalaba NCDC na-agbasi mbọ ike ịwulite nnyocha ndị mmadụ.
Dịka ha si kwuo n'akara Twitter ha "nnyocha bụ isi mbido mbelata mfesa ọrịa a"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ugbua, enweela ụlọ nnyocha iri na asaa ma na-akwado kwa ịtinye ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Ụlọ nnyocha ndị a ebidola iji usoro "COBAS" ga-eme ka e nwee ike inyocha mmadụ narị itoolu na iri isii n'ime elekere asatọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7
Ihe ndị niile na arụtụ aka na onụọgụgụ ka nwere ike ịgbalite dịka a na-achọpụta ndi mmadu ọhụrụ.
Na Amerịka, bụ be ndị bu nje a ruru otu nde ụnyaahụ, Onyeisiala Donald Trump sị na ọ bụ maka nnyocha ha na-emesi ike mere e ji achọpụta ndị mmadụ n'ike n'ike.
Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwukwa na ime nnyocha n'igwe ga-enye aka imata etu ọnọdụ mba ọbụla si kwụrụ n'okwu coronavirus a.










