Child Responsibility: Jiri ụzọ asaa a kuziere ụmụaka maka ego

Ebe foto si, Emmanuel Isidahomen
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ego, akụnaụba na mkpata na mmefu ya ekwuola na ọ dị mma ibido n'oge kuziwere nwatakịrị maka ego.
Ikuziri nwatakịrị maka mkpata na mmefu n'oge ga-eme ka ọ mara etu ọ ga-esi chekwa ego na akụnaụba, nke ga-enyere ya aka ruo mgbe ọ ga-abụ okenye.
Ụmụaka na-esi na ngosipụta amụta ihe, nke bụ na ị bụrụ onye na-emezi ego ọfụma, ọ gaghị ara ha ahụ ịmụta ya n'aka gị.
Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ikuziri ya nka ndị o nwereike iji akpata ego bụ nke Bekee kpọrọ "skills".
Kedụ etu ị nwereike isi mee nke a?
Bido na inye ya ego mmachi akpa ma ọ rụọ ọrụ n'ụlọ, kwado ya ịhụ ma ọ ga-enwe ụzọ ọzọ ọ ga-esinwu rite uru site na ime ka ego ahụ mụta ego.
Uche Iheanacho bụ ọkachamara n'ihe gbasara mkpata na mmefu akụnụba gwara BBC Igbo ụzọ dị iche iche ị ga-eji kuziere nwatakịrị.
Lee ihe ụzọ ole o kwuru ị ga-eji kuziere ha:
1) Kolo: Nke a bụ ihe Bekee kpọrọ "piggy bank" bụ otu ụzọ e si akuziri nwatakịrị iji nwayọ nwayọ na-atụkọ ego.
Iheanacho kwuru na iji kolo etikọ ego na-enyere ụmụaka aka ịma na ọ dị mkpa ihazi nakwa ịtụkọ ego maka mgbe ọ ga-abara onye ahụ uru n'ọdịnihu.
Ọ sị na ọ dị mma iji ihe ga-enye ha obi aṅụrị ka ebe a na-egwu egwu, dịka iji komkom glaasị (ọ na-eme obi aṅụrị ma ị na-ahụ ka ego gị na-eto), nakwa iji komkom nke na-ekwu okwu (na-agwa gị ego ole ị tụkọtarala) dịka nke ndị ọgbara ọhụrụ na-arụ.
Ha mụta ntụkọ uru ego na nwatakịrị, ọ gaghị ara ha ahụ ma ha too.
Kúziere nwa gí etu e si edowe ego maka echi

Ebe foto si, Getty Images
2) Kuziere ha onye rụọ o rie: Ndị Igbo na-ekwu okwu sị na "aka aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ".
Iheanacho sị na ọ dị mma ịkpọrọ nwatakịrị gaa ọrụ maọbụ gosi ya ebe ndị mmadụ na-arụ ọrụ iji kpata ego, n'ihi na nke a ga-akuziri nwa ahụ na ego anaghị esi n'eluigwe adakwasị mmadụ, ma kuzikwaara ya ụdịrị mkpa ọ dị itinye uchu n'ọrụ.
Ọ ga-enyerekwa ha aka ịhụ ụdịrị ahụhụ nne na nna maọbụ ndị okenye na-ata ịkpata ego ahụ e nyere ha n'efu.

Ebe foto si, Getty Images
3) Kuziere ha maka ịhọrọ nke ka mkpa: Ọ dị mma ikuziri nwatakịrị ka ọ họrọ nke ka ya mkpa n'etiti ịma atụ "ịzụta ihe nracha na ịzụta ihe ga-abara ya uru".
Ọ ghọta na n'ime ihe abụọ a na-ere otu ọnụahịa na otu nwereike ịka ọzọ dịrị mkpa, ọ ga-enyere ya aka.
Ọ dị mma ikuziri ya ihe a bụ nke Bekee na-akpọ "opportunity cost"
4) Kuziere ha na aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ: Inye nwatakịrị ego maka ọrụ ọ rụrụ dị mma, dịka "saa efere a ma rite uru ego a n'aka m".
Kama inye ha ego n'efu, nye ha ego mgbe ha rụrụ ọrụ. Ọ ga-akuziri ha maka ịga ozi n'ụlọ ma kuzikwaara ha maka ego.
Ha ga-eji ohere ahụ mara ihe ụwa na-akọ, nke bụ na a na-akpa ego akpa, a naghị aghọrọ ya n'osisi.

Ebe foto si, Getty Images
5) Kuziere ha maka "budget": Nke a dị ezigbote mkpa maka ụmụaka toliterela ịgụ ihe dịka akwụkwọ sekọndrị.
Ọ bụ maka mkpata na mmefu ego na ebe ego ị nwere kwesịrị ịga, ebe ọ na-aga na ebe o nwereike ịga.
Gwa ha ka ha detuo ihe dị ha mkpa na ihe ha chọrọ iji ego ha eme.
6) Kuziere ha maka afọ ojuju: Ụfọdụ na-ekwu na "a na-ata akụ akụ a na-abịa", mana ọ bụcha n'ezi?
Iheanacho sị na ọ dị mkpa ikuziri nwatakịrị ka ihe o nwere ju ya afọ, ka ọ ghara inwe anya ukwu n'elu ihe na-abụghị nke ya ọkachasị n'ihe gbasara ego na akụnaụba.
Ịma atụ; na nwa onye a nwere ịnyịnya igwe apụtaghị na ọ ga-enwerịrị nke ya ọkachasị ma ọ bụrụ na ndị okenye gbara ya gburugburu agaghị azụtanwuru ya.
Ị nwereike ịgwa ya na ị gaghị azụtanwu ya ugbua mana ị nwereike ịgba mbọ zụta ya mgbe ọzọ, mgbe ị nwere ego ya.
7) Onyinye: E nwere egwu a na-agụ sị "onye na-enye m bụ onye m ga-enye", mana ụzọ a adịchaghị mma n'ihi na akwụkwọ nsọ sị na ọ ka mma inye enye karịa ịnara anara.
Ọ dị mma ikuziri nwatakịrị maka inye mmadụ ihe ghara ịdọ asị, n'ihi na nwatakịrị mụtara na ya na mmadụ ga-eke ihe ga-amụta etu ọ ga-esi jikwata ego ya ka o zuoro ya ma rukwaa ndị ọzọ.

Ihe nkiri ga-amasị gị:











