Personal Finance: Ebe asaa i nwereike itinye ego ị tụkọtara
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Ichekwa ego na kom-kom, okpuru akwa maọbụ n'ụlọakụ maka echi dị mma, mana itinye ego n'ebe ọ ga-amụtara gị ihe kacha mma.
Ihe nke a jị dị mkpa bụ maka na mbuli ọnụahịa (inflation) na-eme ka uru ego gị gbadaa ma ọ bụrụ n'ị hapụ itinye ya n'ọrụ nke na ihe ọ zụtanwuru n'afọ a, ọ gaghị azụtanwu ya n'afọ ọzọ.
Ọmụmaatụ:
N'afọ 2015, otu akpa osikapa na-ada puku naira 12 mana n'afọ 2019, onye dowere puku naira iri abụọ na kom-kom n'afọ 2015 agaghị eji ya zulie otu akpa osikapa dịka ọnụahịa ya kwụzị naira puku 17.

Dịka NBS siri kwụọ, mbuli ọnụahịa dị pasent 9.02 n'afọ 2015 mana ọ gbaliri rue pasent 11.08 n'afọ 2019.

Ebe foto si, AFP
Na nkọwa ya, onye ọkachamara n'ihe gbasara nhazi ego onye bụ Uche Iheanacho rụtụrụ aka n'ebe asaa mmadụ nwereike itinye ego o chekwatara ka ọ mịtara ya ezi mkpụrụ.
Ha gụnyere:
1. Iji ego achụ ego maọbụ ịgbakwụnye ihe ọzọna abụghị isi ọrụ gị na-ewetara gị ego
Ị na-arụ ọrụ Bekee ma ị na-azụ ahịa, i nwereike izipụ ego gị ka ọ na-agara gị ozi ịchụ nta ego.
Ihe dịka itinye ego n'ịgba 'Keke', ụgbọala maọbụ ọkada, ire ahịa maọbụ ịtụbata ahịa so na ihe i nwereike ime ego i dokwara ana-agbalite.

2. 'Treasury Bill'
Nke a bụ akwụkwọ ego gọọmenti na-azụ n'aka ọha ọnwa issi maọbụ otu afọ iji nweta ego ha ji arụ ọrụ.
3. Bond
Nke dịkwa ka 'treasury bill' mana ọ na-ewe ọtụtụ afọ bido afọ abụọ maọbụ iri abụọ.
4. 'Fixed deposit'
Nke a bụ itinye ego gị n'ụlọakụ ọnwa atọ, isii maọbụ otu afọ maọbụ oge ole gị na ụlọakụ kwekọrịtara, na akpaghị ya aka maọlị.
Uru dị ya bụ na ọ ga-amụtara gị nwa karịa ego ichekwara n'ụlọakụ nke ị na-adobiri oge ọbụla ọ masịị gị.
5. Itinye ego n'ego mba ndị ọzọ(Forex)
Itinye ego n'ego igwe dịka paụnds maọbụ dọla ga-echekwa ego gị ọ gaghị ada rue ka ego gị ma ọ bụrụ na ị hapụrụ ya n'ụlọ maọbụ n'ụlọakụ.
6. Ịzụ ala maọbụ ụlọ

Igba ala bụ ezigbo ebe i weere ike iji gị a bara gị ezigbo uru.
7. Itinye ego na ịkwalite nka gị (personal development)
Ịgakwu akwụkwọ maọbụ ọmụmụ ga-enye gị ohere ịmụta nka maọbụ iwelite amamihe n'ihe nke ị ma na-eme maọbụ ọrụ ị na-arụ ga-eme ka ị na-enweta karịa ihe ị na-enwetabu na mbụ.
Gee ya n'ụju n'ihe onyonyo dị n'elu:











