Christopher Columbus: Ihe i kwesịrị ịma maka nwoke a ndị na-eme ngagharịiwe kụturu na mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-eme ngagharịiwe maka ịkpa oke agbụrụ bụ nke ọnwụ George Floyd kpalitere ya ọzọ, akwatuola akpụrakpụ Christopher Columbus.
Floyd bụ onye isi ojii dị afọ 46, nwụrụ n'obodo Minneapolis n'ụbọchị 25 nke ọnwa Mee, dịka onye uweojii ji ikpere pido ya n'olu ihe karịrị nkeji asatọ ka ọ na-anwụchi ya.
Ihe mberede a kpalitere nnukwu ngagharịiwe na mpaghara mbaụwa dị iche iche, ma bute nkụtu na mwepụ akpụrakpụ ndị mere nkwekọrịta nzuzo (confederate) dị na mba Amerịka, nakwa nke ndị zụrụ ma were ndị mmadụ mere ohu mgbe gboo, na mba ndị ọzọ.
Na steeti Virginia dị na mba Amerịka, ndị na-eme ngagharịiwe kwaturu akpụrakpụ Christopher Columbus, mụnye ya ọkụ ma kwaba ya n'ime ọdọmmiri.

Ebe foto si, Reuters
Onye bụ Christopher Columbus?
- Christopher Columbus dị ndụ ihe karịrị afọ 500 gara aga, bụ otu onye a ma dịka onye na-eme njem nchọpụta nakwa onye chọpụtara ebe a ma dịka Amerịka ugbua.
- Christopher Columbus bụ aha ya na Bekee, mana a mụrụ ya na mba Itali n'afọ 1451, nke mere na ezigbo aha ya bụ Cristoforo Colombo.
- Ọ bịara wuo ewu dịka onye chọpụtara ala ọhụrụ ndị a kpọrọ 'The Americas'. Mana ka o sila dị, ọtụtụ mmadụ ebirila ebe ahụ mgbe ahụ.
- Ọ maghị ụma chọpụta 'The Americas' a, ọ kpọkwuru ya n'ụkwụ ebe ọ na-achọ ụzọ ọhụrụ ọ ga-esi aga mba Chaịna na India.
- Columbus bụ ọkwọ ụgbọmmiri. Njem mbụ ya gaara ata isi ya dịka ndị ekperima okeosimiri wakporo ụgbọmmiri ya ma mụnye ya ọkụ. Ọ zọrọ onwe ya ndụ site n'igwuru mmiri ruo elu ala.
- Ndị otu Columbus ejighi anya ahụ ya. Ha hapụrụ ya n'agwaetiti nke mba Jamaịca. Agụụ gaara egbu ya n'ihi na ndị obodo ahụ ekweghi enye ya nri.
- O mechara welata mkpụrụosisi akwụoro na tọkị si n'Amerịka.

Ebe foto si, Alamy
Gịnị mere ndị na-eme ngagharịiwe ji ewesara Christopher Columbus iwe?
O teela Christopher Columbus ji bụrụ onye a na-enyo omume ya enyo n'akụkọ mgbe gboo, n'ihi etu o si kpaso ndị obodo ndị o zutere na njem ya agwa, nakwa ọrụ ọ rụrụ n'iji ike weghara ọchịchị n'aka ha.
Ndị nwe obodo Amerịka na-azọchitere ndị mmadụ ikike ruru ha akwadoghi ugwu a na-akwanyere Columbus, ha kwuru na njem ọ gara n'Amerịkas butere mweghara ọchịchị n'ike nakwa ogbugbu ndị nna nna ha.

Ebe foto si, Alamy
Na nso nso a, ọtụtụ obodo na steeti dị iche iche kwụsịrị ịkpọ ụbọchị a kpọrọ "Columbus Day" ma kpọwazie ya "Indigenous Peoples Day", iji cheta ụfụ na ihe ọjọo niile ndị mmadụ gabigara n'aka Columbus na ndị ọcha ndị ọzọ na-eme ụdịrị njem ahụ.
Ụfọdụ ndị na-eme ngagharịiwe kwuru sị na ha na kwaturu ma mebie akpụrakpụ Columbus ndị ahụ iji gosi na ha kwadoro ndị nwe obodo.
Ihe nkiri a gbasara nwaafọ Naịjirịa ndị uweojii mba Amerịka gburu, ga-amasị gị:









