George Floyd: Etu mba Amerika si emegbu ndị isiojii

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọnwụ George Floyd akpatara ngagharịiwe n'ụfọdụ obodo dị na mba Amerịka, akụkọ a ga-enyocha ọnụ ọgụgụ dị iche iche na ihe ọ na-egosi maka ndị isi ojii na etu iwu mba Amerịka sị emegbu ha.
Cheta na a na-ebo ndị uweojii mba Amerịka ebubo imegide ndị isi ojii na mba ahụ.
Ndị kachasị na ọnụ ọgụgụ ndị uweojii kacha agbagbu bụ ndị isiojii

Ọnụọgụgụ ndị uweojii nwere ike ịgbagbu maọbụ gbuo na mba Amerịka na-egosi na ọ bụ ndị isiojii kachasị.
Ọnụọgụgu nke afọ 2019 gosiri na ndị isiojii mezuru ihe karịrị pasenti iri abụọ na atọ n'ime ọnụ ọgụgụ ndị ruru otu puku ndị uweojii gbagburu.
Nke a bụ na-agbanyeghị na ha mezuru naanị passenti iri na anọ n'ime agbụrụ e nwere n'Amerịka.
Etu a ka ọ dị kemgbe afọ 2017 ebe ọnụọgụgụ ndị isiọcha ndị uweojii na-egbu na agbadata.
Akacha anwuchị ndị isiojii maka ọgwụ ike

Ọnụọgụgu ọzọ na-egosi na akacha anwụchị ndi isiojii maka ọgwụike.
N'afọ 2018 ka ọnụ ọgụgu na-egosi na anwụchịrị ndị isiojii narị asaa na iri ise n'ime mmadụ otu narị puku maka ọgwụ ike.
Nyocha na mba Amerịka na-egosi na ọnụ ọgụgu ndị isiọcha na ndị isiojii na aṅụ ọgwụike yiri onwe ha kama ọ bụ ndị isiojii ka akacha anwụchị.
Iji maa atụ, nyocha ndị "American Civil Liberties Union" gosiri na ndị isiojii nwere ohere atọ na ụma (3.7) ị danye n'aka ndị uweojii maka ise igbo na-agbanyeghị na ọ bụ etu ha sị ese ya ka ndị isiọcha sịkwa ese ya.
Ndị isiojii kacha a ga nga

Dịka ọnụ ọgụgụ ewepụtara ọhụrụ na-egosi na ndị isiojii nwereike ị ga nga ugboro ise karịa ndị agbụrụ ọzọ na mba Amerịka.
N'afọ 2018, ndị isiojii mejupụtara ọtụ n'ime mmadụ atọ nọ na nga n'Amerịka na-agbanyeghị na ha sọ nanị passentị iri na atọ ndị nọ n'Amerịka.
Kama ndị isiọcha ndi mejuru nanị ihe dịka passentị iri atọ ndị nọ na nga na-agbanyeghị na ha mezuru ihe dịka passentị iri isii ndị nọ n'Amerịka.
Ọnụọgụgụ ndị isiojii nọ na nga n'Amerịka agbadatala n'ime afọ iri kama ọnụ ọgụgụ ha ka kachasị elu.









