Ipob, South-East Governors: Gịnị na-esere Mbazulike Amaechi na Jim Nwobodo?

Mbazuluike Amaechi na Jim Nwobodo

Ebe foto si, BBC/Jim Nwobodo

Otu onye na ndị so Zik zọta nnwereonwe Naijiria bụ Mbazuluike Amaechi na aka chịburu Anambara steeti ochie bụ Sinetọ Jim Nwobodo na-adụ onwe ha aka n'ọnụ.

Ihe dọtara okwu a gbasara etu ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ si eso okwu banyere nchekwa obodo n'ala Igbo, okwu otu Ipob na ndị ntorobia Igbo egburula.

Aha onyonyo, Emene:Etu ọgbaghara si dapụta n'etiti Ipob na ndị uweojii n'ebe ahụ

Iji maa atụ, Amaechi gwara BBC n'ekwentị na dịka, ndị Ọdịda-Anyanwụ gbara mbọ nweta otu nche ha kpọrọ Amotekun maka nchekwa mpaghara nke ha, na ndị gọvanọ Ọwụwa-anyanwụ gbara ọnyụpa site n'ịkpọ onyeisi ndị uweojii Naijiria oku bịa bụrụ onyeisi otu nche ha chọrọ ikpokọba.

Aha onyonyo, Mbazulike Amaechi: Jim Nwobodo rere ndị Igbo ọtụtụ ugboro

Amaechi na-arụ ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ aka, sị na ha bụ okenye nọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị n'okwu nchekwa obodo nakwa ogbugbu ndị ntorobịa Igbo ọkachasi nke mere na nsonso na Emene,Enugwu.

Ọ jụrụ sị, "Ebe ihe ndị a na-eme n'ala Igbo, kedụzị ihe ndị gọvanọ na-ekwu?"

Mana Nwobodo kwuru na Amaechi amaghị ihe a na-akọ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ọ nọbeghị n'ọkwa ọchịchị mbụ ịghọta ka ihe si aga.

Na nkọwa ya, ọ sịrị na ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ na-arụ ọrụ ha dịka iwu Naijiria si kwado na agbanyeghị na ha anaghị ekwu okwu.

Jim Nwobodo

Ebe foto si, Jim Nwobodo

"Onye ọbụla bụrụla gọvanọ ga-ama na ọ bụghị oge niile ka ọ ga na-ekwu okwu. Mbazulike abụbeghị gọvanọ, ọ maghị ihe dị n'ịbụ gọvanọ.

"Ọ bụbeghi sinetọ, ọ maghị ihe ọ bụ ịzọta ọchịchị. O nweghi ihe ọ ma maka ọchịchị ma ọ lị. Ọ bụrụ na ọ nọbugo n'ọkwa ọchịchị, ihe ọ gaara eme bụ ịkpọ gọvanọ n'ekwentị gwa ya na ihe na-eme adịghị mma. Ọ bụghị ịga na-abara gọvanọ mba n'ụlọntaakụkọ."

Nwobodo gwara BBC na ndị Igbo kwesịrị ị na-achọ ihu mpaghara ndị ọzọ iji nweta ọkwa onyeisiala.

N'ọsịsa ya, Amaechi si na Nwobodo erughịrị ya ime tụmsara n'ihi na ọ bụ obere onye ebe ya nọ.

O kwuru na Nwobodo so na ndị debere ndị Igbo na ọnọdụ ha nọ ugbua na Naijiria, dịka o boro Nwobodo ebubo ịgba Igbo mgba okpuru oge Zik nakwa Ekwueme zọrọ ọkwa onyeisiala.

Nwobodo gwara BBC Igbo na ebubo ahụ achịtaghị aja.

N'ọsịsa ebubo na o rere Ekwueme, o kwuru na o nweghị mgbe ndị agha jiri chọọ inyefe ọchịchị n'aka onye Igbo.

Ọ gara n'ihu kọwaa na atụkọ vootu ya, nke Ekwueme na nke Etiebe na o rughị vootu Obasanjo nwetara.

Gịnị mere na ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ enweghị ihe ha kwuru maka Emene?

Ọwụwa anyanwaụ

Ebe foto si, Presidency/Twitter

Nkọwa foto, Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

N'ịzara ọnụ Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano, Kọmishọna Mgbasaozi na steeti ahụ bụ Don Adinuba sịrị na itinye ọnụ n'okwu metụtara ndị ntọrọbịa Igbo na-ebute mkparị.

Adinuba sị, "Mgbe ọbụla onye Igbo ọbula maọbụ onye ọchịchị ọbụla nyere ha ndụmọdụ, ị hụ ọtụtụ ndị Igbo ka a ga-asị na-akparị gị."

O kwuru na ọtụtụ ndị obere mmadụ na-enwe okwukwe na Biafra bụ ihe rara nnukwu ahụ inweta.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: