Ipob n'Emene: Ana m agara onwe m ụka mgbe a gbara m egbe- Nwoke a kụrụ ịga n'Ụlọgwụ 'Orthopaedic Enugwu'
Otu nwoke nọ n'ụlọ ọgwụ Orthopedic Enugwu aha ya bụ Abraham Ani etiela mkpu sị ndị uwe ojii wepụ ya ịga ha kedoro ya n'ụkwụ n'ihi na ya abụghị onye IPOB.
Abraham gwara BBC na nsogbu ya malitere ụbọchị ụka 23 August oge ndị IPOB na ndị uwe ojii nwere nsogbu.
Abraham Ani sị na ndị uweojii kedoro ya n'akwa dị n'ụlọgwụ Orthopaedic dị n'Enugwu n'ihi na ha na-ebo ya na ọ bụ onye Ipob.
"Onye ọrụ nchekwa gbara m egbe n'ụkwụ n'ụbọchị 23 Ọgọst ndị IPOB na ndị uweojii nwere nsogbu n'Emene."

Ebe foto si, BBC
Okwuru na ya na-aga ụka oge ya zutere ndị na-eme ọgba aghara n'ihu St Josephs catjolic Churcj Emene, ngwa ngwa ya mere ka ya gbapụ ọsọ zoo, otu onye army agbajie ya ụkwụ.
Abraham nọzị ugbua n'ịga ndị uwe ojii tụrụ ya wee na-akwa arịrị na ya na anyụzị nsị na mamịrị na bed n'ihi ịga atụrụ ya n'akwa ụlọ ọgwụ.

Ka ọ dị taa, Abraham kwuru na ya enweghịzị ego, were anya mmiri kwo na gọmenti kwesịrị inyeghachi ya ụkwụ ka ọ dị n'mbụ n'ihi na aka ya dị ọcha.

Mgbe BBC Igbo kpokuru ndị uweojii ka ha tinye ọnụ n'okwu a, ha asị na ọ nọ n'ụzọ njem, na ọ ga-asa anyị n'oge adịghị anya.
Akatọrọ m ogbugbu ndị ntorobia Emene mana anaghị m akwado otu IPOB - Annkio Briggs

Ebe foto si, Ankkio Briggs/Facebook
Otu nwaanyị a ma ama maka ịgba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Annkio Briggs agọọla si na o nweghị mgbe ya kwuru na ya na-akwado otu Ipob.
Briggs pụtara n'akara Facebook ya kwuo na o nweghi mgbe okwu o kwuru iji katọọ ogbugbu mmadụ n'Emene ji ghọrọ na ọ na-akwado otu Ipob.
O kwuru na ọ bụ ikike ruru ya ịkwụnyere otu ọbụla masịrị ya mana o nweghi mgbe o ji sonye otu Ipob.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Cheta na o kwuburu na ndị ọrụ nchekwa enweghi ikike ọbụla ịga ebe ndị a na-enwe nzukọ na-ejighi egbe maọbụ mma ga-amalite ọgbaghara banyere n'igbu ndị mmadụ.
Aloy Ejimako: 'Akwụkwọ gosiri ndị Ipob e gburu n'Emene bụ eziokwu'
N'aka ọzọ ọkaiwu Ipob bụ Aloy Ejimako sị na o kwenyere n'akwụkwọ otu a kpọrọ 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' wepụtara maka ndị Ipob nwụrụ n'Emene.
Ndị 'International Society for Civil Liberties & the Rule of Law' depụtara aha ndị ha sị bụ ndị Ipob nwụrụ n'Emene n'ụbọchị ha na ndị DSS na ndị uweojii nwere
Ọ sị na otu a bụ otu a ma ama dịka ndị na-eme nyocha nke ọma tupu ha a pụta kwuo maọbụ dee ihe ọbụla.
Ejimako sị na ọ na-atara ozi ahụ n'akara e-mail ma leba ya anya, na ihe niile ha dere bụ eziokwu kama na o zuchabeghi ezu.
Ọ sị na o kwenyere na ya ma kpọọ oku ka ndị Igbo na Naịjirịa niile kwenyere n'akwụkwọ a.
Ọ gara n'ihu katọọ ogbugbu ụmụafọ Igbo n'Emene ma kwuo na ndị aka ha dị na ya ga-ata ahụhụ mgbe oge ruru.
Otu a kpọrọ 'Intersociety' na-ahụ maka ikike dịrị onye wepụtara akwụkwọ ozi bu aha gụnyere aha ndị ha sị na e gburu, a nwuchiri nakwa a na-achọ achọ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na ndị Ipob n'Emene, Enugwu Steetị.
Akwụkwọ ha a gosiri aha mmadụ isii e gburu egbu nakwa ndị ọzọ ha sịrị na a nwuchiri na ndị na-efu efu.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ị chọpụta ihe ndị uweojii nwere ikwu maka aha ndị a.
Igwe Felix Ugwu, bụ eze ọdịnala nke obodo Emene dị n'Enugwu steetị gwara BBC ihe ọ ma maka ọgbaghara dara n'etiti ndị DSS na ndị Ipob nke butere ogbugbu mmadụ.
Igwe Ugwu kwuru na ọ nweghị onye Emene so na ndị e gburu na nsogbu ahụ.
Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha jiri nwayọ eso ihe nwere onwe maka ọ bụ ihe ejibu kwafuo ọtụtụ ọbala na gboo.
Ọ sị: "Ya bụrụ na ọ bụ uche Chukwu, anyị ga enweta nkewa Naịjirịa. Ya bụrụ na Chuwku ekweghị, anyị ka ga-anọkwa ebe anyi nọ.
Anyị agaghị agbaghara ụdịrị ihe emere anyị n'Emene ọzọ - Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AFP/Getty
Cheta na onyeisi otu na-achọ Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu kwuru na ndị otu ya agaghị ekwezi ka ụdịrị ihe mere na Emene mee ọzọ, ọkachasi ebe o metụtara ogbugbu mmadụ.
N'okwu okwuru na mgbasaozi o mere n'akara Facebok ya n'Abalị ụbọchị Wenesde, Kanu sị na ya agwala ndị otu ya ka ha dịrị njikere maka mwakpo ndị nchekwa obodo.
Nke a na-abịa dịka aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi si ka ndị nara ndị uweojii ngwa agha ha weghachite ha.
Ugwuanyi kwuru okwu a oge ọ na-ekwupụte ebumnuche a banyere ọbala a kwapuru n'Emene.
Ihe Peter Obi kwuru maka ogbugbu ndị mmadụ n'Emene

Onye bụbu gọvanọ Anambra Steetị bụ Peter Obi sokwa na ndị katọrọ ogbugbu mmadụ a mere n'Emene.
Obi depụtara nke a n'akara twitter ya ma kpọọ oku sị ka e mee nyocha iji chọpụta ihe kpatara ya ma gbochie ya n'ọdịnihu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onye na-agara onwe ya bụ onye e gburu, gbaa ọkụ n'Emene - Anya hụrụ ihe mere

Ndị hụrụ ihe mere n'ụbọchị mkpamkpa kpara n'Emene sị na onye ahụ bụ onye na-agara nke ya ka e gburu maka na o ji ekwenti ya ese ka ihe na-eme.
Mana amaghị ndị mmadụ gburu ya ma ree onye ahụ ọkụ.
Ma ndị Ipob, ndị uweojii na ndị DSS ekwebeghị kwuo mmadụ ole n'ime ha nwụrụ kpọmkwem kemgbe ya bụ ihe mere n'ụbọchị Sọnde 23 Ọgọst, 2020.
Otu foto ndị mmadụ na-eke esighi Emene
Otu foto ndị mmadụ na-eke banyere mkpa mkpa kpara n'Emene abughị ebe ahụ ka o si.
[Gbado anya maka foto ndị n'akara e tinyere ebe a na-egosi ozu na ọbara mmadụ]
Foto a bụ nke otu onye Ipob tinyere na Twitter ha. Mana, ya bụ foto si Mba Cameroon, ebe ndi oji egbe na gọọmentị enye nsogbu maka nwere onwe ndị a na-akpọ Ambazonia. Lee ebe o bu ụzọ sepute isi na Twitter n'ebe a. Foto ọzọ si Nairaland ebe nke nwaanyị ji ọkọrọtọ Biafra si ebe a, n'oge ndị Ipob na ndị agha Naijirịa zutere n'afọ 2018.
Lee mpaghara Enugwu mkpamkpa kpara ụbọchị ụka

Ebe foto si, Google
Aga-eme nchọpụta n'ihe mere n'Emene - Ohanaeze Ndigbo

Ohanaeze Ndigbo agbarụọla ihu n'ogbugbu ndị mmadụ mere n'Emene dị n'Enugwu Steetị n'ụbọchị ụka mgbe Ipob na ndị nchekwa kwasutara onwe ha.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi onyeisi otu a bụ Nnia Nwodo wepụtara nke Emeka Attamah bụ ndụmọdụ ya tinyere aka na ya.
Ohanaeze sị na ihe mere ha ji gba nkịtị kamgbe ihe a mere bụ maka ha chọrọ ịmatacha etu ihe a si malite.
Ha sị na ozi ahụ na-efegharị bụ nke a sị na Nnia Nwodo dere bụ okpotokpo asị na Nwodo ekwubeghi okwu ruo ugbua.
Mana ha kpebiri iwepụta ozi a site na mkparịtaụka ha na gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu Steeti nwere n'ụbọchị Wenesde.
Ohanaeze sị na gọọment Enugwu ekwela nkwa ime ka ha mata ihe niile ha chọpụtara banyere mmadụ niile nwụrụ n'ọgbaghara a.
Ha gara n'ihu kwa arịrị maka ọnwụ ụmụafọ nakwa ndị ọzọ nke a metụtara ma ṅụọ iyi isi imi n'ala chọpụta ihe mere.
Ohanaeze nyere ndụmọdụ ka onye ọbụla dere juu ruo mgbe kọmitii gọọmentị Enugwu hiwere ga-emecha nyocha ha.

Ebe foto si, Enugu state Government
Aka na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi akpọọla oku nzukọ kwam kwam nke ndị niile aka ha dị na nchekwa na steeti ahụ.
Oku Ugwuanyi bịara abalị atọ ndị ọrụ ncheka na ndị otu Ipob kwakọrọ isi na steeti ahụ, nke butere ogbugbu ihe ruru mmadụ anọ.
Ndị Ipob na-ekwu na ọ bụ mmadụ 21 ndị otu ha nwụrụ na ọgbaghara ahụ ebe ndị ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) sị na mmadu abuọ ndi ọrụ ha nwụrụ.
Briggs na Ezekwesili akatọọla ogbugbu ndị Ipob n'Emene

Ebe foto si, Briggs/Ezekwesili/Facebook
Otu nwaanyị ọnụ na-eru n'okwu bụ Annkio Briggs akatọọla ogbugbu e gburu ndị otu Ipob n'Emene dị n'Enugwu Steetị n'ụbọchị ụka gara aga.
Ọ sị na ndị ọrụ nchekwa enweghi ikike ọbụla ịga ebe ndị a na-enwe nzukọ na-ejighi egbe maọbụ mma ga-amalite ọgbaghara banyere n'igbu ndị mmadụ.
Ọ sị na ndị otu a nwere ikike igbere chi ọbụla dị ha mma, ma ọ bụ ụka ndị Jew maọbụ nke Kraịst.
Ọ dọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ hapụ ị na-agba nkịtị mgbe ọbụla e gburu ndị mmadụ n'ala Igbo maọbụ na Kaduna nakwa Naịjirịa gbagburu.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Ihe Oby Ezekwesili kwuru
N'otu aka ahụ onye bụbu mịnịsta agụmaakwụkwọ bụ Oby Ekwesili katọkwara otu ihe a mere n'Emene.
O depụtara nke a n'akara twitter ya ma sị ka e mee nyocha banyere ihe kpatara ogbugbu ndị a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Hiwe 'panel' ga-enyocha ihe mere n'Emene - Ipob

Ebe foto si, Getty Images
Ọtu na-achọ mwereonwe site na Naịjirịa bụ Ipob akpọọla oku ka e hiwe otu ga-enyocha ma chọpụta kpọmkwem ihe mere n'Eneme n'ụbọchị ụka.
Otu onye so n'ọnụ na-ekwuru Ipob kpọrọ oku a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere banyere ọgbaghara dapụtara n'etiti Ipob na ndị ọrụ nchekwa.
Ọ gara n'ihu sị na onweghi mgbe ndị Ipob mere ọgbakọ ji megide ndị ọrụ nchekwa gara kwasuo ha n'Emene dịka ime ọgbakọ bụ ikike dịrị onye n'iwu na Naịjirịa.
O kwukwara na ndị uweojii ekwesighi igbu ndị Ipob, na ihe ha gaara eme bụ inwuchi ma kpọpụ ha n'ụlọikpe karịa ịgbagbusi ha.
Onye ọzọ so na mkparịtaụka a bụ Chukwuka Ofoegbu (Ijele) sị na ndị Ipob kwesịrị ịma na iwu na Naịjirịa kpọrọ ndị na-eyi ndụ egwu nke bụ na ọgbakọ ha megidere iwu.
Ofoegbu sị na "ndị Ipob kwesịrị ịkwanyere onwe ha ugwu, na ọ dị njọ onye a na-azọ ndụ iji aka ya dabanye n'ọnụ agụ".
Ọ gara n'ihu sị na o wutere ya etu ndị mmadụ si nwụọ n'ụzọ na-ezighi ezi site n'ọgbaghara ahụ mere n'Enugwu.
Kirie ihe ha kwuru n'uju ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 3
Anya a na-ele ndị Igbo adịghị mma - Guy Ikokwu

Ebe foto si, Guy Ikokwu
Ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu esorola katọọ ogbugbu e gburu ndị ntọrọbịa Igbo n' ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị nchekwa na Ipob n'ụbọchị Ụka.
Guy Ikokwu, otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu ma bụrụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị welitere isi n'oge ọchịchị Shehu Shagarị gbarụrụ ihu maka ya.
O kwuru na ndị na-achị anụ na-eji egbe na-emebi ihe mana o nweghị onye ọbụla n'ime ha ejiderela, kama na-egbusi ndị ntorobịa Igbo ejighị egbe ọbụla.
Ikokwu sị na "O nweghị obodo ụdị ihe ga-eme, ndị mere ya ala na nkịtị."
"Ihe ha mere ụmụ anyị Osebuluwa ga-akwụ ha ụgwọ."
N'otu aka ahụ, onyeisi otu na-ahụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ 'Billie Human Right initiative' bụ Innocent Amadi.
N'okwu ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị, Amadi sị na ihe nke a gwụrụ ike n'ihi na ndị a na-agbu bụ ndị na-ejighi egbe maọbụ mma.
Ọ sị na ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa bụ nke ndị a na-emegbu emegbu mana o nweghi onye na-ekwu okwu banyere ya.
Amadi gara n'ihu dụọ ndị Igbo ọdụ sị ka ha kwanyere onwe ha ugwu n'ihi na anya a na-ele ndị Igbo adịghị mma.
Abaribe o kwuru gịnị maka mkpamkpa kpara n'Emene?

Sinetọ Enyinnaya Abaribe akatọọla ogbugbu e gburu ndị mmadụ n'Emene.
Ọ na-asị ka ndị gọmenti hibe otu nnyocha ga-eleba anya n'etu ihe jiri mee n'Ọgọst 23, 2020 n'Emene dị n'Enugu.
Abaribe kwuru nke a site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Awom.
O kwukwara na etu oke ogbugbu si eme mgbe ọbụla gosiri na o nwere ihe ọzọ so ya n'azụ.
Ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ na-akwado ime ọgbakọ maka Emene
N'otu aka ahụ, onye nchịkọta otu gọvanọ ọwụwaanyanwu bụ ọkamụta Uchenna Ortuanya ekwuola na otu ahụ na-akwado ime ọgbakọ nlebanya gbasara mkpa mkpa mkpa kpara n'Emene.

Ebe foto si, Presidency/Twitter
Ortụanya gwara BBC na ha na-eche ka oge ha ji eme ọgbakọ ruo ma na-ekwukwa na ha ga-eji aka ha kwupute ihe ha metere n'ọgbakọ ahụ.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ mmadụ nọ na soshal midia akatọ nkịtị otu a gbara kamgbe ihe a mere.
'Kpọpụta aha ndị otu Ipob na DSS a sị nwụrụ n'ọgbaghara a'

Ebe foto si, Getty Images
Nke ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ na ha chọrọ ka ewepụta aha ndị Indigenous People of Biafra(Ipob), DSS nakwa uweojii nọ n'Enugu kwuru nwụrụ n'ọgbaghara ahụ.
BBC Igbo kpọrọ ndị isi Ipob nakwa ndị DSS ụnyahụ bụ ụbọchị iri abụọ na anọ ka wepụta ya bụ aha mana Ipob jụrụ ajụ ebe DSS kwuru na ha aghahị ewepụta aha ọbụla ugbua.
Ohaneze ndị Igbo na-eme nnyocha

Ebe foto si, Ohaneze Ndigbo
Otu Ohaneze Ndịgbo nke Enugwu steeti ekwuola na ha na-enyocha ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị otu 'Indigenous People of Biafra' na ndị uweojii na steeti ahụ n'ụbọchị ụka.
Onyeisi ha bụ Alex Ogbonna kwuru nke a oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka na mgbede Mọnde.
Ogbonna kwuru na ya bụ ọgbaaghara nke butere ọnwụ ụfọdụ mmadụ, wutere ha nke ukwu.
O kwuru sị: "Anyị na-eleba okwu a anya iji matachaa etu ihe niile si mee."
"Anyị na-akpọkwa oku ka gọọmentị leba anya n'okwu ma gbaa ya n'anwu."
"Nkwa anyị na-ekwu bụ na ndị niile aka ha dị na ọgbaaghara ahụ agaghị ala na nkịtị.
Oge BBC Igbo kpọkwara onyeisi Ohaneze Ndigbo na Naịjirịa bụ Nnia Nwodo, o kwuru na onweghi ihe ọbụla ya ga-ekwu n'ihi na ọ maghị ihe niile gbasara ya bụ okwu.
N'otu aka ahụ, ọkaiwu ndị IPOB bụ Alloy Ejimako akatọọla mkpa mkpa kpara n'Emene.
O kwuru na o jọgburu onwe ya na ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa ga-ahapụ ndị niile na-enye ala ahụ nsogbu ma chụwa ụmụ ntorọbịa na agbọghọbịa ala igbo na-ejighị ngwa ọbụla achọ okwu.
Gere ihe o kwuru n'uju ebe a.
Ihe nkiri gosiri etu dị mmadụ si gba ọsọ maka mkpamkpa a
'Kwụsị ọgbakọ ndị otu Ipob niile n'Enugwu' - Nnamdi Kanu
Okwu Ejimako na-abịa dịka onyendu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu gwara ndị otu ya nọ n'Enugwu steeti ka ha kwusịtugodu ọgbakọ ọbụla ka elu na ala jụlatatụ oyi.
Kanu kwuru nke a n'okwu ya ụnyaahụ na Radio Biafra mgbe ọ na-ekwu maka mkpamkpa kpara n'Emene Enugwu n'etiti ndị uweojii na Ipob.
Olu ndị uweojii gbasara ọgbaghara ndị Ipob na ndị uweojii

Ebe foto si, Enugu State Police Command
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii nke Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe, ha na-akọwa na ihe ruru ndị otu Ipob mmadụ narị ise kwuchiri ụzọ na-agba taya ọkụ n'ụzọ niile, wee nwuchie ndị uweojii nzuzo bụ DSS.
Akwụkwọ ahụ kwukwara na Kọmishọna ndị uweojii bụ Ahmad AbdulRahman zipuru ndịọrụ ya ka ha ga bịanyụọ ọgbaghara ebe ahụ.
Ndịọrụ nchekwa ahụ gụnyere ndị DSS, ndị uweojii na ndị agha Naịjria gara ebe ahụ mgbe ndị otu Ipob malitere ịkwa ha mgbọ.
Mgbe ha saghachịrị ha site n'ịkwa mgbọ, mmadụ abụọ ndị otu Ipob nwụrụ ebe mgbọ merụrụ ọtụtụ n'ime ha gbapụrụ ọsọ ahụ.
Ọ sị na ha zọpụtara otu n'ime ndị DSS ahụ ndị Ipob jidere, were hụ mmadụ abụọ ndị otu ha ndị ọzọ n'ozu ka ha tọgbọrọ.
Ndukwe kwukwara na e jidere mmadụ ise ndị otu Ipob bụ ndị kwetere na ha so na ya bụ otu a machiri amachị.
Ọ sị na ndị ahụ sị na ha nọ ebe a na-enye ha ọzụzụ mgbasị ahụike.
Ha sị na ha hụrụ mma, okpiri akụnyere ntu na ekwentị dị icheiche ebe ahụ.
'Ndị uweojii gburu ndị Ipob 21, nwụchie mmadụ 47 n'ọgbaaghara mere n'Emene'- Emma Powerful

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, Emma Powerful, bụ ọnụ na-ekwuru ndị otu Ipob, katọrọ mwakpo ahụ nke ndị uweojii wakporo ha n'Emene dị n'Enugu.
Powerful kwuru na ndị otu ha nwụrụ mgbe a na-akwa mgbọ egbe ruru iri abụọ na otu ebe, ndị uweojii nwụchịrị mmadụ iri anọ na asaa.
Gọvanọ Enugu emeela njem itiaka n'obi n'Emene, Enugu

Ebe foto si, Louis Amoke
Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyị agaala ebe ndị uweojii na Ipob nwere ọgbaghara .
Ndị ọrụ nchekwa na ndị bi n'ogbe ahụ mere ka ọ ghọta na ihe adajụọla kamgbe ọgbaghara ahụ dapụtachara ụnyahụ bụ ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọstụ.
Ugwuanyị na ndị ọrụ nchekwa gara ebe ahụ na mgbede ụnyahụ.

Ebe foto si, Amoke Louis
Mba Nnamdi Kanu bara maka Emene

Ebe foto si, Getty Images
Na mbụ, onye ndu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu tinyere ọnụ n'ihe mere n'Emene.
N'ozi o depụtara n'akara Facebook ya, o kwuru na oge eruola mgbe ndị uweojii ga-aghọta na ogbugbu ndị ejighi egbe ga-akwụsị "n'ala Biafra".
O kwuru na ihe mere n'Emene ka bụ mbido ihe ga-abịa ma kwuo na ọ bụrụ na agaghị ekwe ha (ndị Ipob) mee ngagharịiwe n'udo, ha ga-eme ya n'esemokwu.
Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 4
Lee ụlọọrụ ndị uweojii a wakporo mgbe ọgbaghara dapụtachara n'ebe ahụ

Cheta na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị otu Ipob na ndị uweojii metụtara ụlọọrụ ndị uweojii nta dị n'Emene n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọgọstụ 2020.
A hụrụ ọkọlọtọ dị n'ihu ụlọ uweojii ahụ n'ala nke gosiri na awakporo ebe ahụ mgbe ọgbaghara dapụtara.
Mana ndị mmadụ laghachiwe n'ụlọ ha maọbụ ihe ha hapụrụ wee gbawa ọsọ ndụ.

Ebe foto si, BBC
Mgbe ihe a mechara, ndị uweojii ka anọchichara ụzọ n'ebe dịka Eke Obinagu akụkụ ebe esi abata Emene ma gbochie ndị si Orie Emene apụta ịgafe ezi ahụ.

Nchọpụta anyị gosiri na ọgbaghara ahụ malitere n'ụlọakwụkwọ Community High school Emene si ya fere St patricks college fee Ukwu Mango gaa Orie Emene.
"A hụrụ m ka agbagburu mmadụ abụọ n'Emene" -Anya hụrụ ihe merenu
Maazi Henry nọ mgbe ihe a mere kọwara etu o si hụ ka e gburu mmadụ abụọ n'ihu ya mgbe ọgbaghara a dapụtara.
Ọ kọwara na ihe a bidoro n'ụtụtụ ebe elekere asatọ mgbe ndị Ipob na-eme nzụkọ, na-ekpe ekpere, na-abụ abụ.
"Ndị DSS na SARS nakwa ndị uweojii batara n'ebe ahụ malite iti otu nwoke ihe, kụọ ya egbe ma merụọ ya ahụ.
Nke a mere ka ndị ọzọ nọ n'ime ụlọ ahụ gbapụta bịa ịmata ihe na-eme."
O kwuru na ndị uweojii malitere ịgbasasi egbe ebe ahụ agbanyeghị na ndị mmadụ aka ha adịghị n'ihe merenụ na-eme ngafe ebe ahụ.
"Mgbọ tụtara mmadụ abụọ nwụrụ n'ebe ahụ ebe ihe ruru mmadụ iri isii merụrụ ahụ eburu ha gawa ụlọọgwụ"
Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ozu otu onye na-agba ọkụ ebe ahụ
Mgbe ọgbaghara a dapụtachara n'etiti Ipob na ndị uweojii n'Emene dị n'Enugu, onye ntakụkọ BBC gara ebe ahụ hụrụ ozu otu onye ebe ọ na-agba ọkụ n'Orie Emene.
Ndị bi n'akụkụ ebe ahụ gwara anyị na ọ bụ mgbe ndị otu Ipob maọbụ Massob na-enwe nzụkọ n'ukwu Mango dị ebe a hụ ka ndị uweojii wakporo ha.
Gere ya n'uju ebe a:
Lee foto gosiri etu ọgbaghara ahụ si mee

Ndị agha na ndị uweojii juputere ebe ahụ ugbua.

Etu Emene dị mgbe mkpamkpa a kpachara
















