IPOB: Ụmụ Biafra kwadonu Referandum na Feb.16

Onye ndu Ipob ekwuola na ndi otu ya ga-eme ntuliaka 'referedum' n'ọnwa Februwarị iri na isii.
Kanu kwuru na ntuliaka a ga-eme ka ha mara ndị chọrọ ndọrọndọrọ Naịjirịa maọbụ nwereonwe Biafra site na atụmaatụ n'enweghị ntụpọ emere n'udo.
Akwụkwọ ozi onye na-ekwuchitere IPOB ọnụ bụ Emma Powerful depụtara kwuru na Kanu esila mba Israel ga mba Uk ihazị ihe niile gbasara 'Referendum' a.
O kwuru na IPOB ga-eme ya bụ ntụliaka ụbọchị a ga-eme ntụliaka ịchọpụta onye ga-abụ onyeisiala Naịjirịa bụ Februwarị iri na isii.
Akwụkwọ ahụ kwụkwara na Kanu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na mba ofesi na-enwe mkparịtaụka maka etu Referendum ga-esi gaa nke ọma.
Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa ekwuputela uche ha gbasara mkpebi a Kanu mere.
Onye ụlọrụ Inec bụ Nnenna Okoronkwo kwuru na ọ bụ sọsọ ntuliaka onyeisiala ka Inec ma ga-eme ụbọchị Februwarị iri na isii.
N'okwu ya, ọ bụrụ na o nwere ihe ga-agbanwe, Inec ga-eme ka ụmụ Naịjirịa mara.
N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere Ohaneze Ndigbo bụ Chuks Iloegbunam kwuru na e nwere usoro eji eme "Referendum".

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na ya bụ mkpebi gosiri na obi adịghị ndị otu Ipob mma ma na-ekwu na ha nwere ikike ịchọta ihe ha na-achọ dịka Ohaneze Ndịgbo na-achọ nhazigharị obodo.
Onye na-ekwuchitere pati APC na Lagos bụ Joe Igbokwe kwuru na Nnmadi Kanu enweghị ikike ịnọ na mba ọzọ na-gwa gọọmenti etiti ihe ga-eme n'ala Naịjirịa.
O chetaara Kanu etu agha Biafra si mebie ọtụtụ ihe , ma na-aju ya ebe ọ nọ mgbe a lụrụ ya bụ agha.
Igbokwe kwuru ka a napụ Kanu igwe eji ekwu okwu makana o ga-eme ka ọ kwụsị ị na-akọgheri akọgheri.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka mkpebi a na soshal midia:
@interpocf86 kwuru na Nnamdi Kanu enweghị ike ị nọ n'ala onyeọzọ na hazi 'Referendum'.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Onyeabuo kwuru na okwu Kanu atala nchara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ebe @preciousakande kwuru na ọ chọrọ ka Naịjirịa kewaa n'afọ a maọbụ Buhari na Atiku achịwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Akụkọ ga-amasị gị:








