Nnamdi Kanụ: Otu onye enweghị ikike ịgbanwe ọkọlọtọ Biafra - Massob

Ọkọlọtọ Bịafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nnamdị Kanu gbanwere ọkọlọtọ Bịafra tinye ya 'Kpakpando nke David.'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọnụ na-ekwuru otu ọzọ na-achọ Biafra bụ nke Bekee kpọrọ 'Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob)' bụ Comrade Samuel Edeson, ekwuola na ihazigharị Ọkọlọtọ Biafra "abụghị okwu otu onye ga-ebi."

Comrade Edeson sị: "Biafra abụghị ihe otu onye ga-ekuli n'ụra, ọ gbanwe Ọkọlọtọ e ji mara Biafra. Ọ bụ ihe kwesiri na ndị Bekee kpọrọ 'stakeholders' ga-anọ were kpaa maka ya."

Edeson jụrụ sị, "Ya bụ ihe o mere, kedụ ndị ya na ya kpara ya tupu ya mee ya? Ka o mere ya n'aha Ipob, kaa ọ bụ na ndị Bịafra kwekọrịtara mee ya?"

"A ka ga-eleba ya anya maọbụrụ na ndị Igbo nabata, ndị Biafra anabata ya, anyị ewere."

O kwuru na Biafra Massob na-ele anya ya bụ ebe onye nwere ikike okpukperechi masiri ya, ikike onye ikwu uche ya, na ọ bụghị nke onye ga-kwuo uche ya, akpọwa ya iyi.

Gee ihe Edeson kwuru n'uju:

Aha onyonyo, Samuel Edeson: Nnamdi Kanu enweghị ikike ịgbanwe Ọkọlọtọ Biafra

Oge BBC Igbo kpọrọ Ralph Uwazuruike bụ onye ndu otu Biafra Indepedence Movement (Bim) n'ekwentị ịnụta echiche ya banyere ọkọlọtọ ọhụrụ a Kanu wepụtara, o kwuru na ya agaghị asa ya bụ ajụjụ.

Onye ndu 'Indigenous People of Biafra (Ipob), Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AFP/Getty

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu, onye ndu otu Ipob

Nnamdi Kanu, onye ndu otu na-agba mbọ maka ikewa Naijirịa jiri nwete mba ha kpọrọ Bịafra bụ nke Bekee kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob), akọwaala ihe mere o ji gbanwee ọkọlọtọ ndị hibere mba Biafra mere.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Na nkọwa ya, Kanu sị na ọ bụ naanị "Kpakpando nke David bụ ihe ndị Briten chịkọtara Naijiria tinyere n'ọkọlọta ha bụ ihe na-egosi njirimara ndị Igbo".

Kanụ, onye gara n'ihu kwuo na ha 'agaghị agbanwe njirimara 'Coat of Arm'.

O kwukwara na ndị na-akatọ ọkọlọtọ ahụ na-ekwu na ha abụghị ndị Juu, maọbụ na-asị na ya chọrọ ịmanye ha ịbụ ndị Juu' bụ enweghị nghọta zuru oke na-enye ha nsogbu.

Ọkọlọkọ Biafra

Ebe foto si, Ipob

Nkọwa foto, Okoloto Kanu weputere na nke Biafra wepụtere n'oge mba ahụ pụtara

Ọkọlọtọ Bịafra bụ akwa nwere uhie ọbaraọbara, ojii na ndụndụ nke eserese anyanwụ n'awapụta awapụta nọ n'etiti ya.

N'ozi ọ gbasara n'ikuku n'abalị Wenezde, Nnamdi Kanụ kwuru na "ọ bụghị m wepụtara akara ọkọlọtọ, mana anyị tinyere 'Kpakpando nke David' dị na ya,".

Ọ gara n'ihu kwuo na ọkọlọtọ ahụ na-egosi ntọala ebe ndị Igbo si.

O kwuru na "Onye ọbụla nke jụrụ ọkọlọtọ ọhụrụ a "ị mara na o nwere Ekwensu n'ime ya."

Ebe ka Ọkọlotọ Biafra si?

Emeka Ojukwu dịka ọ kwụ n'ihu ọkọlọtọ Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Generalụ Emeka Ojukwu dịka ọ kwụ n'ihu ọkọlọtọ Biafra n'oge Biafra

Dịka websaitị 'Flags of the World' (FOTW) si kwuo, ọkọlọtọ Bịafra malitere n'abalị iri atọ nke ọnwa Mee afọ 1967 ya nke e ṅomiri nhazi ọkọlọtọ nke otu 'Universal Negro Improvement Association and African Communities League bụ otu 'Marcus Harvey malitere.

Ya bụ ọkọlọtọ bụ ihe ndị otu Massob nke Uwazuruike bụbu onye ndu ha wepụtara oge ọ malitere ịgba mbọ maka nnwereonwe Biafra.

Otu Ipob jikwara ya bụ ọkọlọtọ Biafra mere njirimara ha wee ruo ụbọchị Wenezde mgbe Kanu mara ọkwa na ha emegharịala ya bụ okọlotọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: