Ị ma na ịgbọ ncha nwereike ime ka utu gị ghara ị na-ekeli ọsịsọ?

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Mmadụ imetu onwe ya aka maọbụ "ịgbọ ncha" bụ otu okwu ndị mmadụ anaghị ekwukarị maka ya.
Ọ bụghị naanị ndị Afrịka ka okwu a na-anyị arụ ikwu, o nwere agbụrụ ndị ọzọ dịka ndị India nakwa ndị Chaịna anaghị ekwu maka ya.
O nwereike ịbụ n'ihi na ụfọdụ ndị mmadụ chere na ọ bụ ihe ọjọọ maọbụ na ọ bụ ihe atịtị.
Mana o nwere uru dị na ya? Lekwa ihe anyị chọpụtara:
Uru a dị na ya?

Cynthia Fogoe bụ ọkachamara n'ihe gbasara mmkeọahụ chere na o nwere ụfọdụ uru.
Ọ gwara BBC Radio na mkparịtaụka ha nwere na uru dị na mmadụ "ịgbọ ncha".
Lee ihe ndị o kwuru ebe a:
- Ọ na-enye aka izu ike maọbụ ịnweta onwe gị
- Ọ na-enye aka ibelata oke nchekasị echiche
- N'ahụ ụmụnwaanyị, ọ ga-eme ka ha mụta maka ahụ ha nakwa ihe ndị na-amasị ha n'aramara
- Ọ bụ etu mmadụ si egosi nnwereonwe ahụ ya.
Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Chidinma Njoku bụ onye ọrụ ahụike.
O kwuru sị "Ọ bụ ụzọ ị ga-eji mụta maka ahụ gị" ma kwukwaa na:
- Ị gaghị atụ ụjọ ịtụrụ ime
- Ị gaghị ebute ọrịa si na aramara bụ STDs
- Ọ na-enye aka ịrahụ ụra ọfụma
- Ọ ga-enyere ụmụnwaanyị aka ma ha nwee afọ mgbu na nsọ ha.
Ọghọm dị n'ịmetụ onwe gị aka

Fogoe gaara n'ihu kọwaa na o nwere ọtụtụ ọghọm sikwa n'ịgbọ ncha pụta.
O kwuru na ọ na-arara ọtụtụ ụmụnwoke na-eme ihe a ahụ ịnọte aka ma ha na onye ọzọ na-enwekọ aramara.
"Ị na-eme ihe a mgbe niile, ị ga-akuziri ụbụrụ gị na ọ bụ naanị n'ụzọ ịgbọ ncha ka ị ga-esi nyụọ uhie".
Nke a ga-ebute nsogbu dịka, enweghi ike ikeli utu gị, ịnyụ uhie ọsịsọ, ịnọte aka n'aramara tupu ị nyụọ uhie.
Nnyocha ọzọ gosiri na ikiri ihe onyonyo aramara bụ "pornography" na Bekee nke na-eso ịgbọ ncha, na-emetụta ụbụrụ mmadụ n'ụzọ ọjọọ.

Ebe foto si, Other
Ọ na-eme ka ndị na-ekiri ya kwụsị ịnwe agụụ mmekọrịta n'ebe nwunye maọbụ enyi ha nwaanyị nọ.
Ụmụnwaanyị a na-eme ya?
Ụfọdụ na-eche na ekwute okwu mmadụ igbo onwe ya agụrụ mmekọahụ, ọ bụ ụmụnwoke ka a na-ekwu maka ha.
Mana Radhika Sanghani bụ onye ntaakụkọ ma maka aramara kwuru na nke a bụghị eziokwu.
Sanghani kwuru na "ụmụnwaanyị na-eme ya mana ọ bụghị ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya chaa chaa".
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:













