Sexual Appetite: Ihe mere ndị mmadụ ji eze ihe nsori

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị ka o ji bụrụ na chị bọọ ahụ ọzọ?
Nchọpụta mba UK mere edepụtara n'akwụkwọ ozi 'British Medical Journal' ekwuola ihe mere mmekọrịta dị n'etiti nwoke na nwaanyị ji datụọ.
Mana gịnị kpatakwaranụ enweghị agụ mmekọrịta nwoke na nwaanyị a?
Anyị wedatara akụkọ a na Naịjirịa ka anyị mata ma agụ aramara agbalitere ka ọ gaturu agbatu nakwa ihe butere ya.
Ụkọchukwu Chukwudi Peace kwuru na nwoke na ihe na-eme maka etu obodo Naịjirịa si kwụrụ ugbua.

Ebe foto si, Getty Images
Nwaanyị ọzọ na-achọghị ka a kpọpụta aha ha kwuru na nwoke ịgba n'iro nakwa nke na anaghị egwu egwu ịhụnanya nwere ike imee ka nwaanyị mechie ụkwụ ya.
Nwaanyị ọzọ kwuru na o ruola otu afọ kemgbe o mere aramara kwuru na nwaanyị di ya gbawara obi agaghị ekwe nyetụ ya nchọnchọ.
Ihe ndị ọkammụta na-ekwu maka ya
Peter Saddington bụ ọkammụta n'ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na-ekwu na ihe kachasị mkpa bụ mmekọ ezigbo karịa mmekọ kwamgbe kwamgbe.
O kwukwara na ọ bụrụ na mmekọ gị na onye nke gị na-amasị gị, ị ga na-eje n'ihe mgbe ọbụla.








