Lee ka ị ga-esi mee aramara ghara ibute coronavirus

Ndị dịna n'akwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Leanne anaghị anyụ ma onwee mmeko

Ị makwa na etu esi eme aramara socha n'ihe gbanwere maka mkpa mkpa coronavirus na-akpa n'ụwa.

Ụlọrụ Terence Higgins adụọla ndị mmadụ ọdụ ha gbahapụ isusu ọnụ, yie mkpuchị imi ma ghọrọ ọnọdụ na-agụnyeghị nchekọrịta ihu ma a na-eme aramara.

Ụlọrụ ahụ kwuru na ha ma na ọdịchaghị mfe mana ndị mmadụ kwesiri ịchọta ụzọ ha g-esi hazie agụrụ aramara na ụjọ ibute coronavirus.

Ka ị ga-esi chekwa onwe gị

Nwoke na Nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Onye aramara ibe gị kachasị mma n'oge a bụ gị maọbụ onye gị na ya bi n'ụlọ.

Ịgbọ ncha, iji ihe egwuregwu aramara, maọbụ isonye n'aramara a na-eme n'ekwenti nakwa intanet bụ ụzọ ndị kachasị mma na-agaghị eme ka ibute coronavirus.

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka inyere ndị mmadụ aka na-ekwusi ike na ọ dịmma ka ndị mmadụ ka na-anọpụ anọpụ mana ịgaghị akwụsịli ndị mmadụ inwe aramara.

Mana ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị onye bee gị na-eme aramara, ọ dịmma ịwelata aka na ndị di otu aramara ịnwere.

Dịka a na-akpachapụrụ ihe nile anya n'oge a, mara maka ihe ọbụla gosiri n'ahụ gị maọbụ onye nke gị ebutela ọrịa covid-19, ma dopu onwe gị maọbụrụ na inwere ha.

Ọ bụrụ na gị na onye ahụ na-ahụ onwe unu nke mbụ, ụlọọrụ Higgins kwuru ka ị jụọ onye ahụ ma ha maọbụ onye ha na ha bi enwere ihe gosiri na ha ebutela coronavirus.

A na-ebute covid 19 site n'aramara?

Nwoke ji nwaanyị n'olu

Ebe foto si, Getty Images

Nje coornavirus na-efesa site asọ mmiri, mụkọ, nzipu imi, maọbụ n'ume onye bu ọrịa ahụ kuputere nakwa ebe a na-ebisa aka.

"Ọ bụrụ na unu abụọ ga-emetụ ọtụ maọbụ amụ ụnụ aka , unu ga-esusuriri ọnụ nke bu otu ụzọ esi ebute ọrịa dịka dkt Alex George si gwa ụlọọrụ radio BBC n'ọnwa Maachị."

Ụlọọrụ ahụ kwuru na ha achọpụtala nje coronavirus n'uhie si n'amụ apụta nakwa nsi mmadụ nyụpụtara nke mere na ikwesiri iji okpunnabuenyi mee aramara maka igbochi mbute ọrịa a.

Ọ ga-adịkwa mma ma ịkwọchapụ aka ruo tịnkọm tịnkọm iri abụọ maọbụ were ude na-egbu nje wee hịchapụ aka gị tupu imalite maọbụ imecha aramara.

Ụlọrụ ahụ kwukwara na ọ ga-adịmma ka ndị mmadụ mee nyocha, chọpụta ma o nwere nje ọzọ so aramara ha bu tupu ha mewe nsori ma oge mmachị bie.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: