Lyon na Mancity: Ntakịrị Lyon agbanyụọla 'mic' ndị Manchester City

Ebe foto si, Getty Images
Otu egwuregwu bọọlụ Olympique Lyon azaala ogbu agụ ọzọ dịka ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu dulaa Manchester City n'asọmpi Champions League n'abalị Satọde.
Cheta na ọ bụ Lyon dulara Cristiano Ronaldo na ndị Juventus n'asọmpi a n'izu gara aga.
Cornet nyere otu goolu ebe Mousa Dembele nyere goolu abụọ Lyon ji merie.
Kevin de Bruyne bụ onye nyeteere Man City otu goolu ha ji gbaa aka ahịa.
Nke a pụtara na ọ bụ Lyon na Bayern Munich ga-ezute onwe ha iji mara onye ga-etozu iso gbaa asọmpi nke ikpeazụ nke iko Uefa Champions League.





