Tottenham vs Manchester City: Tottenham agbaala Manchester City ose n'anya

Ebe foto si, Reuters
Asọmpi otu egwu bọọlụ Tottenham Hotspur na Manchester City bụ nke kpọtụrụ na mgbede a n'egwuruegwu Premịa Lig.
Tottenham Hotspur ji ọkpụ goolu abụọ merie Manchester City.
N'eziokwu, Manchester City agbanyeghị na ha nọ n'obi ndị Tottenham site ka ha sị gbaa ha bọọlụ.
Na nkeji nke iri atọ na itoolu ka ndị Manchester City newtara penariti mana Ilkay Gundogan tara ya.
Tottenham ezughi ike n'agba nke mbu ebe Manchester City chị ọkụ sodo ha ma gbata akwụkwọ ịdọ aka na nti atọ ebe Tottenham ji otu tupu ha alaa ezumike.
Ka abatachara ezumike ka enyechere Olexandr Zinchenko mpempe akwụkwọ mmeemmee na nkeji 60".

Ebe foto si, Getty Images
Steven Bergwijn nke Tottenham ji otu ọkpụ zaa aha ya na nkeji 63 iji kasie Mourinho obi.
Ọ dị ka nke ahụ ezughị, Son Heung-Min nwaafọ Saụt Koria tinyere Tottenham goolu nke abụọ na nkeji 71.
Mmeri a mere ka ndị Hotspur gbagolite na ogogo nke ise ebe Manchester City ka gwunyere na ogogo nke abụọ ha nọbu.
Ọnwụ Manchester City na-esi ịnapụ Liverpool ndị nke mbụ na Lig kpuru afọ n'ala n'izu a ebe Liverpool ka jicha ihe ruru akara 22 aga ha.

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










