"Donatus Nwamkpa erubeghị ogo anyị ịsa ya okwu" - Ọnyeozi Abaribe

Ọnụ na-ekwuru Enyinnaya Abariba bụ Uchenna Awom asaala Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche otu All Progressives Congress (APC) n'Abia steeti okwu ọ gwara onyeisi ya.
Uchenna sị na Donatus erughi onye ha ga-asa okwu maka na ya na Abaribe ahaghị.
Uchenna sị na "okwu Abaribe kwuru kemgbe abịlị olemole gara aga ka Nwamkpa tetere ura taa bia ikwu."
O kwukwara na Abaribe kwuru okwu dị ka onyeisi pati nke nta n'ụlọemeiwu nke Bekee kpọrọ Minority Leader; na o rughiri Abaribe na Nwamkpa ịsakọrịta okwu.
Akwụkwọ akụkọ Vanguard buru na Onyeisioche pati APC n'Abia Steeti bụ Donatus Nwamkpa gbara omeiwu Enyinnaya Abaribe ụkwụ n'ihi oku ọ kpọrọ ka onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọchịchị.
Nwamkpa kwuru na ọ bụ Abaribe kwesịrị iritu n'oche Sịnetọ n'ihi na onwebeghi ihe a na-ahụ anya o mepụtara kamgbe afọ iri na atọ ọ bụụrụ onye omeiwu.
O kwuru nke a na nzahachi okwu Sinetọ Abaribe kwuru n'ọgbọ ụlọomeiwu n'izu gara aga bụ ebe ọ kpọrọ oku ka onyeisiala Muhammadu Buhari rituo n'ọchịchị maka amaghị eme gọọmenti ya ọkachasị na nchekwa obodo.
Nwamkpa bụ onye gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Isochi dị n'Umunneochi nke Abia steeti kpọrọ Abaribe oku ka ọ depụta ihe ọ rụpụtaara ndị ọ na-anọchi anya ha kemgbe ọ malitere ọchịchị afọ iri na atọ gara aga.
Ekwenti Nwamkpa agaghị aga ịmata ma ya bụ okwu esi na n'ọnụ ya n'ezie.










