Etu mmadụ 20 si nwụọ ebe a na-azọ otite mmanụ nsọ

Karama mmanụ olive

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ruru mmadụ iri abụọ nwụrụ ebe iri na isii merụrụ ahụ n'ụbọchị Satọde 1, Febụwarị 2020 n'oge ofufe Kraịst n'ogboegwuregwu dị na mpaghara ugwu Tanzanịa.

Ndị a nwuru ebe ha na-azọ onye ga-ebu ụzọ nata otite mmanụ nsọ a kpọrọ "Blessed oil" dịka onye ọrụ gọọmentị si kwuo.

Nke a mere mgbe onyeisi nchụaja bụ Pastọ Boniface Mwamposa nke ụlọụka 'Arise and Shine Ministry Tanzania' wụpụrụ mmanụ ọ kpọrọ mmanụ nsọ n'ala.

Mmanụ a nke ọ sị ga-agwọ imirikitimi ọrịa, mere igwe mmadụ jiri sọkọta isi na-azọ onye ga-ebuzọ rụrụ mmanụ nsọ a.

Igwe mmadụ a ji ụkwụ zọgbuo mmadụ iri abụọ n'ime ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Anya hụrụ ka o si mee gwara ndị ntaakụkọ AFP na ọ dịka ebe a tụpụrụ nkịta ọkpụkpụ n'ala.

Ọ sị na ndị mmadụ zọrọ onwe ha ụkwụ na-enweghi obi ebere, na e nwekwara ndị ji mpi aka na-akpọ onwe ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: