Enyinnaya Abaribe: Ikike onye kwuo uche ya na-akawanye njo na Naijiria- Abaribe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ikike onyekwuouche ya na-akawanye nj ugbua - Abaribe

Sịnatọ Eyinnaya Abaribe

Senetọ Enyinna ya Abaribe etiela mkpu maka ihe ọ kpọrọ "kpachi ndị mmadụ ikwu uche ha na Naijiria."

Abaribe, onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere ụbọchị Wenezde n'ihe gbasara iwu 'social media' na iwu 'Hate Speech', gbadoro ụkwụ na nwụchi a nwụchiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ, na ndị kwuru uche ha maka ihe na-aga n'obodo.

Dịka Abaribe kwuru na ya maghị n'uju ihe dị n'iwu 'Social media' na iwu 'Hate speech' n'uju, gara n'ihu gwaa ndị na-akpa nkata ime iwu a ka ha saa anya mmiri.

Abaribe onye gụpụtara ọtụtụ okwu Lai Mohammed kwuru n'oge ọchịchị Jonathan sịrị na : "Ọ bụrụ na iwu 'hate speech kwuru ka akwụgbuo onye dara ya di ire n'afọ 2012 rue 2015 oge Lai Mohammed na-ekwu ụdị okwu ọjọọ ndịa maka Jonathan, Lai Mohammed ọ kara adị ndụ ugbua?"

Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:

  • Ọ bụ anabataghị echiche ndị ọzọ mere ka ụfọdụ na-achọ ịkwado iwu 'hate speech'
  • Ihe na-eme, ihe na-atụ ndị mmadụ egwu bụ na iwu a nwere ndị e bu n'obi achọ iwepụta ya
  • Ihe ga-enyere anyị aka weta ịdịnotu bụ: Onye ọ sọrọ ya bụrụ onyeisiala, onye omeiwu, gọvanọ, ọkaikpe bụ ikpemkwụmọtọ, mee onye ọbụla ka i mere ibe ya
  • Anyị nwere iwu gbasara mmadụ ikwu okwu asị megide agbụrụ ndị ọzọ mana nsogbu bụ itinye ha n'ọrụ
  • Mgbe ụfọdụ sọchal midia na-eweta mgbakasị ahụ mana ị ga-eji maka nke a sị ka a kwugbuo ha?
  • Anyị anaghị ahụ site n'aka gọọmenti na ndị chọrọ ime iwu, obiọcha ime onye ọbụla dara iwu ka e mere ibe ya dịka Iwu Naijiria si kwuo.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta ọsịsa Lai Mohammed nye okwu a Abaribe kwuru, mana ọ zaghị ekwentị ya.

Kogi state: Ụlọomeiwu ukwu ekwela ka e binye Kogi steeti nde iri

Buhari

Ebe foto si, Twitter/presidency

Dịka Kogi steeti na-akwado maka ntuliaka gọvanọ n'oge na-adịghị anya, ụlọomeiwu ukwu ekwenyela ka e binye ha ego..

Ụlọomeiwu ukwu akwadola arịrịọ onyeisiala Muhammadu Buharị rịọrọ ka e binye Kogi State ijeri naịra iri ka ha were kwụọ ụgwọ ha jigasị.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-atamu na ego ahụ nwere ike ịghọ ihe ndị APC ga-eji zụọ vootu na steeti ahụ na ntuliaka a ga-eme n'oge na-adịghị anya.

Ọnwụ ezutela ndị uweojii

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Ndị omekome agbagbuola ndị uweojii abụọ na Kaduna steeti dịka Ali Ali Janga bụ kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ si kwuo.

Cheta na akụkọ kwuru na a gbagburu ndị uweojii abụọ na Bayelsa ụbọchị Tuuzde.

David Villa achịliela akpụkpọụkwụ ya

Nwaokorọbịa gbabuuru otu Barcelona nakwa mba Spen bọọlụ aha ya bụ David Villa alaala ezumike nka.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Villa, onye nọ Japan agba bọọlụ ugbua, kwuru na ya ga-awụsa ọwa n'ọnwa Disemba mgbe afọ bọọlụ nke mba Japan ga-abịa n'isi njedebe.

Gịnị na-esere Obaseki na Oshiomhole?

Esemokwu dị n'etiti gọvanọ Edo Steeti bụ Godwin Obaseki na nna ya ukwu bụ Adams Oshiomhole agafewela ọgụ nne na-agbara nwa ya.

Otu jikọrọ ndị gọvanọ APC akwanyela Oshiomhole ọkụ n'ike ka ọ kpọọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu maọbụ kwara ngwongwo ya rituo.

Oshiomhole na Obaseki

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oshiomhole na Obaseki

Dịka ntuliaka maka ọkwa gọvanọ na-erute nso na Edo State, esemokwu dị n'etiti gọvanọ Obaseki na Oshiomhole na-akawanye njọ.

Esomokwu a etisaala pati APC ụzọ abụọ, otu ụzọ na-ekwu na ha achụpụla Oshiomhole na pati ha.

Mana otu ndị nke ọzọ kwuru na ọbụ Obaseki ka ha chọrọ ka o si na APC pụọrọ ha.

O nwebeghị onye ma nke bụ nke.

Esemokwu Oshiomhole na Obaseki pụtara ihe n'ọnwa Juun.

N'oge ahụ ka onyeisi ọkaikpe nke Edo Steeti ji abalị wee duo ndị omeiwu steeti ahụ n'iyi ọrụ.

N'ime mmadụ iri abụọ na anọ bụ ndị omeiwu steeti ahụ, naanị mmadụ itoolu ka e duru n'iyi ọrụ n'oge ahụ.

Akụkọ kọrọ na ndị ahụ e duru n'iyi ọrụ bụ ndị na-akwado Obaseki ebe ndị ọzọ bụ ndị otu Oshiomhole.

Ikpe ọnwụ ọ na-eche onye kwuru okwu asị?

Aliyu Sabi Abdullahi

Ebe foto si, Channels TV

Nkọwa foto, Aliyu Sabi Abdullahi bụ onye wepụtara iwu ọhụrụ a

Akụkọ gbasara iwu ọhụrụ ndị ụlọomeiwu ukwu na-atule iji gbochie okwu asị ka na-akpọtụ n'elu n'ala Naịjirịa.

Onye wepụtara iwu a bụ Aliyu Sabi Abdullahi bụ onye ji ọkwa Chief Whip.

Ihe kpatara iwu ọhụrụ ji ewu ewu bụ na ndị mmadụ kwuru na e nwere ike iji ụdọ kwụgbuo onye a mara ikpe maka ikwu okwu asị.

Ntaramahụhụ ndị ọzọ gunyere ịtụ onye dị otu ahụ mkpọrọ ndụ ha niile maọbụ ogologo afọ.

Iwu ahụ kwukwara ka e kewapụta ngalaba ga na-ahụ maka mgbochi ikwu okwu asị.

Nigeria National Assembly complex

Ebe foto si, Shiraz Chakera

Cheta na Aliyu Sabi wepụtaburu iwu a n'afọ 2018 mana ọ gafeghị.

Nke a mere ka o wepụtakwa ya ọzọ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tuzde.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ agbarụọla ihu maka ya bụ iwu.

Moghalu Kingsley kwuru na iwu ahụ kwesịrị ka a kwụgbuo ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Shehu Sanị kwuru na iwu ahụ gosiri aka ike ndị nọ n'ọchịchị.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Onye ọzọ kwuru na iwu ahụ n'onwe ya bụ okwu asị.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ihe Atiku kwuru

Atiku Abubakar

Ebe foto si, @atiku/Twitter

Nkọwa foto, Atiku Abubakar

Onye bụbu osote onyeisiala Naịjịrịa bụ Atiku Abubakar gwara ndị ụlọomeiwu Senate ka ha gbara ọgwụ ha ṅụọ gbasara iwu ọhụrụ a.

Atiku kwuru na iwu ahụ ga-emegide ikike nkwuwa okwu bụ nke Bekee pkọrọ 'Freedom of speech'.

O kwukwara na ọ dị ọtụtụ ihe na-emebi emebi na Naịjirịa bụ nke ndị omeiwu kwesịrị ileba anya.

A ga-amachi ịrịọ arịrịọ na Borno

Beggars
Nkọwa foto, Ndị arịrịọ

Ekeresimesi bidoro nnọọ n'oge maka ndị arịrịọ bị na Borno State.

Gọvanọ ha bụ Babagana Umara ji puku naịra iri atọ gbachaa ha niile ahụ n'otu n'otu.

Governor Babagana Umara

Ebe foto si, FACEBOOK/@govborno

Nkọwa foto, Govanọ Babagana Umara

Ihe ruru mmadụ puku asaa ketara ego a.

Mana gọọmentị kwuru na onyinye ahụ bụ iji kwadoo ha maka mmachi ịrịọ arịrịọ bụ nke a ga amalite n'oge na-adịghị anya.

Na Bolivia

Jeanine Anez (C)

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Jeanine Áñez ji aka ya mee onwe ya onyeisiala, ụlọikpe kwadoro ya

Nwanyị onye omeiwu na mba Bolivia aha ya bụ Jeanine Anez ejirila aka ya mee onwe ya onyeisiala dịka onyeisiala Evo Morales gbachara arụkwaghị m.

Anez kwuru na dịka iwu obodo sị dị, ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu ka o ruru n'aka irigoro n'okwa onyeisiala.

Ụlọomeiwu kachasị na mba Bolivia kwadoro Anez maka ihe o mere.

Ngagharịiwe na-aga n'ihu na Bolivia maka ọchịchị ọjọọ.

Mmiri ejula elu na ala na Venice

Venic Flood

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụlọahịa ndị mmadụ jupụtara na mmiri

Mmiri etojuola elu na ala n'obodo Venice dị na mba Ịtali.

Nke a mere ka ụlọ obibi nakwa ụlọahịa ndị mmadụ nakwa ụlọụka dị icheiche jupụta na mmiri.

Venic flood

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Mmiri tojuru ma n'ime ụlọụka.

Ụdị ihe dị etua emebeghị n'obodo ahụ kamgbe afọ iri ise gara aga.

Mgbe ikpeazụ ihe dị otu a mere bụ n'afọ 1923.

Naịjịrịa na Bene Repọblik

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Ụlọ ejula ugbua n'ogige ndị Super Eagles dịka ha na-akwado izute mba Benin Republic na mgbede Wenezdee.

Asọmpi a bụ iji tozuo maka iko mba Afrịka nke afọ 2021.

Ọ ga-ebiri ọkụ n'elekere ise nke mgbede taa n'ama egwuregwu nke dị na Uyo, Akwa Ibom Steeti.

Ka ọ dị ugbua, ndị otu 'Super Eagles' niile zuru ezu n'Uyo na-eche ka oge ekeremgba ruo.

Ụmụ Naijirịa ewepụla onwe ha ihere

Dream Eagles celebrating a goal

Ebe foto si, Twitter/NFF

Otu egwu bọọlụ Dream Team nke Naịjirịa emechapụla onwe ha ihere mgbe ha ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie mba Zambia n'asọmpi iko mba afrịka maka ndị akarịghị afọ iri abụọ na atọ.

Otu atọ kacha mee ọfụma n'asọmpi a ga-etozu ịnọchite anya Afrịka n'asọmpi Olympics nke 2020.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Rice processing: Usoro e ji emepụta osikapa ọdịnala