Enyimba Economic City: Gịnị ka ọ bụ?

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu
Dịka Onyebuchi Ememanka si gwa BBC Igbo, ọ bụ atụmatụ ndị ụlọọrụ abụghị nke gọọmentị gbakọtara chọọ ịrụpụta, nke ga-eme ka e nwee ebe dị ka obodo Dubai na steeti ahụ.
Ememanka bụ ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti, kwuru na ọ bụrụ na a rụọ ya, na o nwere ikike inye ihe karịrị ihe karịrị mmadụ 700,000 ọrụ n'ime ihe ruru afọ iri.
O kwuru na gọọmentị etiti nwere pasentị iri abụọ n'ime EEC a, ebe gọọmentị Abịa nwekara nke ha.
O kwukwara na gọọmentị etiti enyela Abịa steeti ihe ọ kpọrọ 'export processing zone license' nakwa 'license for inland port'.
O kwuru na ego gọọmentị agaghị aba n'ime ya, mana Gọvanọ Ikpeazụ na-akwadosi ya ike.
Ikpeazu ọgaala ịchọta ego o ji arụ 'Enyimba Economic City'?
Aka na-achị Abịa steeti bụ Ikpeazu agaala mba Saụt Afrịka ịga chọta ego o kwuru na ọ chọrọ iji rụọ ihe ọ kpọrọ 'Enyimba Economic City'.
Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Ememanka gwara BBC Igbo nke a ka anyị na ya kpara n'ekwentị.
Ememanka bukwa ụzọ tinye ya n'elu Facebook ya.

Ebe foto si, Chimamaka Ihenacho
Ndị ụlọomeiwu bịara Aba ịchọpụta ihe mere na Ndịegoro

Ebe foto si, Hon Ossy Prestige
Kọmitii ndị na-ahụ maka ndị uweojii, ọgwụike na ikike dịrị onye n'ụlọomeiwu nta gara Aba, Abia Steeti ịchọpụta nke bụ eziokwu n'ihe mere n'etiti ndị uweojii na ndị bi na Ndịegoro.
Cheta na ọgbaghaara dapụtara n'etiti ndị mmadụ na ndị uweojii nke mere e ji gbaa ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ọkụ.
Ndị ụlọomeiwu a zutere ndị ihe metụtara, kọmishọna uweojii n'Abia bụ Ene Okon, ndị ọkaiwu nakwa ezinụlọ Adibenma John Chinonyerem nwoke nwụrụ n'obi nkolopụ n'ihi ụda egbe.
Onyeisi kọmitii a bụ Ayeni Babatunde sị na ha abịaghị Aba ịkatọ maọbụ ikpe onye ọbụla ikpe kama ọ bụ isi imi n'ala chọpụta "etu mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ".

Ebe foto si, Hon Ossy Prestige
O kwere nkwa na ha ga-achọpụ nke bụ eziokwu ma kpee ikpe ziri ezi.
Onye du ha bịa njem a bụ onye na-anọchite anya Aba South n'ụlọomeiwu nta bụ Ossy Prestige bụ onye mere ka ụlọomeiwu mata maka ọgbaghaara ahụ.
Ndị ụlọomeiwu ọzọ so bịa njem a gụnyere Nkem Abonta, Ikengboju Gboluga Dele na Tijani Kayode na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Hon Ossy Prestige
Ndị DSS chụsara ndị na-eme ngagharịiwe

Ndị uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ 'DSS' gbakanyere egbe na anwụrụ anyammiri were chụsasịa ndị na-eme ngagharịiwe ka a tọhapụ Omoyele Sowore n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.
Ndị DSS jichiri Sowore n' agbanyeghi n'ụlọikpe enyere iwu ka a tọhapụ ya ka ọ nọchara ọnwa atọ na mkpọrọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
E merụrụ ụfọdụ ndị ntaakụkọ gụnyere nke ụlọakụkọ Guardian ahụ na ọgbaghara ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ụlọomeiwu chọrọ ime iwu megide okwu ịkpọ asị

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Ndị ụlọomeiwu ukwu ewepụtala atụmatụ iwu ga-ehiwe ngalaba ga na-enyocha okwu asị na Naịjirịa.
Iwu a bụ nke onye bụbu ọnụ na-ekwuru ha bụ Sabi Abdullahi kwadoro a gafeela ngụpụta nke mbụ ya n'ụlọomeiwu.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Ụgbọelu agha ndị Izrel agbagbuola otu onye ndu ndị na-eyi ndu egwu bụ Baha Abu al-Ata na nwunye na Palestine.
Ndị otu a sị na Abu ai-Ata nwụrụ mgbe ogbunigwe gbara n'ụlọ ya, ebe ụmụ ya anọ na onye agbataobi ha merụrụ ahụ.
Praịm mịnịster mba Izrel bụ Benjamin Netanyanhu sị na Abu al-Ata bụ ogbunigwe na-echere oge ọ ga-agba na mba Izrel.
N'egwuregwu

Ebe foto si, PA Media
Nkeji
Terry G ọ ka Naira Marley agụ egwu?
Okwu na-ewu na soshal midia ugbua bụ etu otiegwu a ma dịka Terry G si bụrụ ekwuchaa ọgwụ ma a bịa n'egwu n'afọ ole na ole gara aga.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Nke a malitere dịka ndị mmadụ ji ya atụnyere ndị nke na-agụ egwu ugbua dịka Naịra Marley.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
N'egwuregwu,
Kedụ ndị ga-eji ibe ya gwọrọ abacha mgbe Zambia na Naịjirịa ga-esukọta isi n'asọmpi Iko Mba Afrịka nke ndị na-akarịghị afọ iri abụọ na atọ?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Cheta na Aịvọrị Kost ji otu ọkpụ a na-asaghị asa merie ndị Dream Team Naịjiria abalị atọ gara aga.
Igbo nwere mmadụ,
Nwaafọ Naịjirịa bụ Chike Ofili eritele ntụrụgo akpọrọ 'TruLittle Hero awards' n'ihi nchọpụta o mere maka mgbakọ na mwepụ na mba Briten.
Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a
Iwe ji ndị mmadụ makana Aisha Buhari sị ka ekpewere Naịjirịa ekpere

Ebe foto si, Twitter/Aisha Buhari
"Ọ bụ ekpere ga-azọ Naịjirịa?" Ajụjụ a ka ndị mmadụ na-ajụ banyere oku nwunye onyeisiala Naịjirịa kpọrọ.
Iwe ji ụfọdụ ndị Naịjirịa n'elu soshal midia maka oku Aisha Buhari kpọkuru ndị ụka alakụba nọ n'ọkwa gọọmentị ka ha kpewere Naịjiria ekpere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6

End of X post, 7
Ha kwuru na iwe ha bụ etu e si asị kpewere Naịjirịa ekpere oge ọbụla kama ịrụ ọrụ ndị mmadụ na-atụ anya na ha kwesịrị ịrụ.
Lee ụfọdụ iwe ha:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 8

End of X post, 9

End of X post, 10

End of X post, 11
'Kwụọnụ ụtụisi unu'
Ngalaba na-ahụ maka nhibe ụlọọrụ a kpọrọ Corporate Affairs Commission akpọkuola ndị hibere ụlọọrụ na Naịjirịa ka ha gbaa mbọ na-akwụ ụtụisi ha ma ọ bụrụ na ha achọghị ka a kachapụ aha ha n'akwụkwọ ndị hibere ụlọọrụ.
CAC kwuru na ọ dị mkpa na ndị mmadụ kwụrụ ụgwọ a, makana ọ ga-eme ka ha mara ụlọọrụ ndị ka kwụ chịm ma ndị nke na-akwụghị.
Ọkụ na-agba ebe ruru 50 na mba Ọstrelia

Ebe foto si, Reuters
I nwere ezinaụlọ maọbụ ndị enyi na mba Ọstrelia?
Biko dọọ ha aka na ntị ka ha kee nkwụcha maka ọkụ jaa jaa na-abịa.
Nke a si na mkpu ndị mba ahụ na-eti maka ọkụ na-agba ọzara maliterela n'ihe karịrị ebe iri ise na steeti New South Wales, nke a sị ka ga-enwuru zaa na-aga.
Ọ kwaala Sterling

Ebe foto si, PA Media
Gareth Southgate bụ onye nkuzi otu egwuregwu mba Ịngland ekwuola, na Raheem Sterling agaghị eso ha gbaa asọmpi ha na mba Montenegro n'ụbọchị Tọọzde na-abịa.
O kwuru nke a maka mba Sterling na Joe Gomez bara mgbe Liverpool kwọriri Man City ụbọchị ụka gara aga.
Ihe nkiri a ga-amasị gị