Ihe iri Afrịka rụpụtara n'ihi Covid-19

Ebe foto si, Ecole Supérieure Polytechnique Dakar
Dịka mba Afrịka gafere ọnụọgụgụ otu nde na ndị butere ọrịa coronavirus, ndị na-arụpụta akụrụmgwa na-enye aka n'ịlụso ọrịa agha site n'ịrụpụta ihe ga-enyere ndụ aka n'oge a.
Lee ihe iri n'ime ndị ahụ anyị họpụtara:
1. "Doctor Car robot"
Ụmụakwụkwo na Polyteknik Dakar nke dị na Senegal arụọla otu ịgwe ga-enyeaka belata mfesa ọrịa ahụ site na dọkịta rue na onye ọ na-agwọ.
Igwe ahụ nwere oseefoto nke ha tinyere ya n'ime a ga-esinwu n'ebe toro aka na-apị. Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na igwe a nwereike ịnye ndị mmadụ edopuru iche nri na ọgwụ.
2. Igwe nkwọmaka

Ebe foto si, James Wamukota
Nwata akwụkwọ mba Kenya dị naanị afọ itoolu mepụtara ọsịsị igwe nkwọmaka iji belata mfesa covid-19.
Igwe ahụ nyere ndị mmadụ aka ịkwọ aka n'emetụghị ihe ọbụla aka kama jiri ụkwụ ha emetụya. E nyere Stephen ntụrụgo n'ọnwa Juun maka nke a.
3. Igwe nkutume'RESPIRE-19'

Ebe foto si, Instagram / Usman Dalhatu
Dịka ụkọ nkutume na-abawanye n'ụlọọgwu na Naịjịrịa, nwata akwụkwọ dị afọ 20 aha ya bụ Isman Dakhatu gbalịrị ịnye aka.
Dalhatu na-agụ 'Engineering' rụpụtara igwe ahụ ga-enyere ndị mmadụ aka ịku ume. O kwuru na ọ na-achọ ịrụ ihe ruru iri abụọ.
4. Ịbipụta mkpuchimi nke 3D

Ebe foto si, Getty Images
Natalie Raphil bụ onye chọpụtara ụlọọrụ "Robots Can Think" na mba Saụt Afrịka. O ji ihe mbipute nke 3D arụpụta akwa mkpuchi imi ruru otu narị kwa ụbọchị.
Ọ na-ekesakwa nke a n'ụlọọgwụ ndị a ma ama n'obodo Johannesburg. Ọ kara ọnụọgụgụ ndị bu coronavirus na mba Afrịka nọ na mba Saụt Afrịka.
5. Ite ịkwọaka nke ji 'Solar' arụ ọrụ
Ọrụakpụụkwụ bụ Richard Kwarteng na nwanne ya nwoke bụ Jude Osei chepụtara ma rụọ ite ikwọaka nke ji anwụ arụ ọrụ iji kwalite ndebe ebe ọbụla ọcha.
Mgbe aka mmadụ bịara igwe ahụ nso, ọ wepụta mmiri ncha ma kpọọ oku mgbe ntabianya 25 gachara iji chetara onye ahụ ya kwodebe aka ya dịka iwu WHO si kwuo.
6. Nnyocha ngụ site n'ịntanetị

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ injinia na mba Tunishia arụpụtala peeji ịntaneetị na-elebanye anya na nnyocha ngụ mmadụ ịma ma onye ahụ enwereike ibu coronavirus.
Ndị nnyocha na National Institute of Applied Science and Technology n'obodo Tunis sị na o ji pasentị iri itoolu achọpụta ma mmadụ ebu ọrịa a n'ezie.
Aka na-ahazị ya bụ peeji ọfụma ka o nwee ike na-enweta nnyocha ahụ ọfụma nakwa ịghọta etu covid-19 si emebi ngụ mmadụ.
7. Ndịuweojii nke igwe kọmpụta

Ebe foto si, EPA
Gọọmentị mba Tunishia wepụtara ndị uweojii igwe kọmputa n'okporoụzo isi obodo ha bụ Tunis n'ọnwa Eprelu iji kwụsị ndị mmadụ ịpụta n'ilo.
Igwe ndị a akpọrọ 'PGuards' jụrụ onye ọbụla ha hụrụ n'ilo ihe ha na-eme ebe ahụ ma jụkwa ha maka akwụkwọ ikike ha nwere.
O nwere ihe dị icheiche dị n'ime ya dịka oseefoto, ihe na-achọta ọkụ nakwa ihe na-egosi ya ụzọ.
8. Osịsị na-ehicha ego
Otu onye na-arụ ọrụ ego bụ Danson Wanjohi rụrụ osisi a na-ehicha ego ma etinye ya n'ime ya bụ igwe.
O ji injin, rọba nakwa 'gear' were rụọ ya bụ osisi nke na-ehicha akwụkwọ ego ọbụla etinyere n'ime ya site na mmiri 'sanitizer' dị ya n'ime.
9. Ngwa nyocha covid-19 nke nsonso
Ndị ji ego achụ ego abụọ na mba Sawụt Afrịka bụ Daniel Ndima na Dineo Lioma arụpụtala ngwa nyocha covid-19 nke na-ewepụta mpụtara n'ime naanị nkeji 65.
Ọ na-ewebu ihe ruru ụbọchị atọ tupu mpụtara ndị enyochara maka ọrịa a apụta. Akpọrọ ngwa nyocha a qPCR nke a na-elebanye anya tupu enya ya ikike ịrụpụta.
10. Ịnọte aka akpụ isi

Na mba Itiopia, ndị na-akpụ isi achọtala ụzọ ọhụrụ ha ga-esi kpụ ndị mmadụ isi n'emetụghị ha aka.
Ndị ahụ na-akpụ isi na anọ n'ime igwe arụpụtara na-ekewa ha na ndị ha na-akpụ isi nke nyere aka belata mfesa ọrịa coronavirus.









