Nwodo: Biafra agaghị abịa site n'ọgụ

Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ipob na Massob bụ otu abụọ chọrọ nwereonwe Biafra

John Nnia Nwodo bụ onyeisi Ọhanaeze ndigbo n'ụwa niile akpọkuela ndị na-achọ nwereonwe Biafra dịka Mba ka ha minye nma n'abọ n'ihe gbasara ọgụ Biafra.

Nwodo kwuru nke a mgbe ọ na-ekwu okwu na ọgbakọ mmụta ihe ndị ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka, Enugu Steeti.

O kwuru na nnwereonwe Biafra abụghị site n'ịlụ ọgụ, esemokwu maọbụ ịkparị ndị mmadụ ọkachasị ndị nọ n'ọchịchị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

"Anyị agaghị enweta Bịafra site n'ịlụọgụ na ịkparị ndị mmadụ, anyị agaghị edọzi obodo site n'itimkpu, anyị ga-enweta ya site n'usoro ndọrọndọrọ. na-ikwu eziokwu." Nwodo kwuru.

Ndị na-eme ngagharị iwe maka nwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharị iwe maka nwereonwe Biafra

Na nzaghachị, mgbe BBC Igbo gbara onye ọdeakwụkwọ ndị Ipob bụ Emma Powerful ajụjụọnụ, o kwuru na ihe ha chọrọ bụ ntuliaka nwereonwe nke akpọrọ 'Referendum' n'asụsụ Bekee na ọ bụghị ọgụ.

O kwuru na ọ bụ ihe ihere na onye dịka Nnia Nwodo bụ onyeisi ndigbo ga-ekwu ụdị okwu a.

Powerful kwuru na ọ bụ Nwodo kpara nkata mere ndị agha Naịjirịa jiri wakpo ụlọ onye ndu Ipob bụ Nmamdi Kanu ma gbuo ọtụtụ ndị Ipob nke mere na-amaghị ebe Nnamdị nọ ruo taa.

BBC Igbo gbara mbọ ị nweta Nnia Nwodo n'ekwentị, ka ọ zara ọnụ ya n'ihe Emma Powerful kwuru gbasara ya, mana ọ zaghị.

Gee ihe Emma Powerful kwuru ebe a;

Aha onyonyo, Anyị chọrọ ntuliaka 'referendum' ọ bụghị ọgụ.