Buhari na ndị ndu ụlọomeiwu kparịtara ụka nzuzo n'abalị

Buhari na NASS

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari jụrụ itinyeaka n'akwụkwọ maka ịmeghị usoro ndọrọdọrọ ọchịchị

Akụkọ ekwuola na Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na ndị isi ọgbakọ omeiwu ukwu na nke nta nwere mkparịta ụnyaahụ, 15 Maachị 2018 n'ụlọ ọnyeisiala mgbe ojiri obere oge gafee elekere itoolu nke abalị.

Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukọla Saraki n'akwa ogbo ya bụ Yakubu Dogara du ndị ọzọ mee ya bụ njem.

Ha nọrọ ihe ruru otu elekere na ya bụ ọgbakọ nke amatabeghị isi okwu ya.

Cheta na nke a na-eme ka Onyeisiala Buharị jụrụ itinye aka n'akwụkwọ ndị ụlọomeiwu degara ya maka imegharị usoro ntuliaka nke bekee kpọrọ "Electoral Act amendment Bill".

Ndị ọzọ nọ na ya bụ ọgbakọ nzuzo bụ Ahmed Lawan, onye ndụ ndị Sịnetị, Lasun Yusuf, osote onyeisi ụlọomeiwu nke nata, Femi Gbajabiamila, onyeisi ụlọ nzụkọ, na Sola Adeyeye.

Buhari na NASS

Ebe foto si, Channels TV

Nkọwa foto, Saraki na Buhari kwerikọtara n'aka kamgbe abalị abụọ a Buhari juru itinyeaka n'akwụkwọ maka imegharị usoro ndọrọndọrọ ọchịchị

Ndị ọzọ bụ Al-Hassan bụ Chif Wip nke ụlọomeiwu n'ọkwa na ogbo osote ya bụ Pally Iriase: Philip Aduda nakwa ndị ọzọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ