Mali coup: A họpụtala Bah Ndaw dịka Onyeisiala mba Mali nwa mgbe nta

Ebe foto si, EPA
Mba Mali enwetala onyeisi nwa mgbe nta bụ Bah Ndaw.
Ndaw, onye bụbu Minista Nchekwa bụ onye isi dị agha weghara ọchịchị na mba ahụ bụ Colonel Assimi Goita, họpụtarala ka o jide ọchịchị ma hazie ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ọnwa iri na-asatọ na-abịa.
Goita ga-abụ osote Ndaw bụ onye ofe ụgbọelu larara ezumike nka.
A na-atụ anya na nhọpụta ya ga-eme ka Ecowas wepụ ntarahaụmụhụ ha tinyere Mba Mali maka ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ.
Ụkọ ngwaahịa mere azụmahịa kụọ afọ n'ala na mba Mali dịka
Ụlọikpe Ecowas nọ n'Abuja nọọ n'ehihie Fraide(sept 25,2020) kụchapụrụ akwụkwọ nke otu abụọ na Mali gbara maka ntaramahụhụ nke otu Ecowas nyere mba ahụ n'ihi nchutu ndịagha chuturu onyeisiala ha.
Ndịisi agha nọ n'ọchịchị Mali na ndịisi Ecowas na-enwe ọgbakọ taa

Osote Onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo awuchiela mba Gana maka ịnọchite Onyeisiala Muhammadu Buhari n' ọgbakọ dị n'etiti ndịisi mba dị na Ecowas na ndị isiagha weghara ọchịchị n'ike na mba Mali na Gana.

Ebe foto si, Gov of Nigeria/Twitter
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na ndị agha mba Mali weghara ọchịchị n'ike n'aka Ibrahim Boubakar Keita, bụbụ Onyeisiala mba Mali n'ọnwa Ọgọstụ.
Ecowas anabataghị nkwa inyeghachi ọkwa ọchịchị n'aka ndị nkịtị n'afọ atọ nke ndị agha ahụ kwere, ebe ndị agha ahụ achọghịkwanụ inyeghachi Keita ọkwa ahụ dịka Ecowas si chọọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ibrahim Boubakar Keita, Onyeisiala mba Mali e nyere ọsọ nọ n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Reuters
Ibrahim Boubakar Keita bụbu onyeisiala mba Mali tupu ndị agha mba ya achụpụ ya n'oche, nọ n'ụlọọgwụ kemgbe ụbọchị Tuzde.
Mamadou Camara bụbu onyeisi nchịkọta ndị ọrụ ya gwara Abdoula Karim Ba bụ onye ntaakụkọ BBC nke a n'ụtụtụ Wenezde, Septemba 2.
Camara kwuru na ọ nọ n'ụlọọgwụ dị n'isiobodo Bamako, kwuru sị "Onyeisiala Keita gara nlekọta o kwesịrị ịga kemgbe otu ọnwa gara aga, mana e nyere ya akwa ka o wee ghara ịla".
O kwukwara na ọ bụ dọkịta Keita kwuru kaa ọ nọrọ ka e lekọta ya, na ọ gaara esikwa n'ụlọọgwụ lawa n'ime otu ụbọchị ahụ.
Otu onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu nso Keita kwuru sị na ọ ga-esikwa na mba ahụ pụọ ịga nweta nlekọta na mba ọzọ n'oge na-adịghị anya.
Cheta na ndịagha chụpụrụ Keita n'oche ọchịchị n'izu ụka abụọ gara aga.
Ecowas, Buhari enyela ndị agha mba Mali ọnwa iri na abụọ iji hafee ndị nkịtị ọchịchị

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Otu jịkọrọ mba dị n' Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ 'Economic Community of West African States' (Ecowas) agwala ndịagha mba Mali ka ha hazie ntuliaka ma hafee ndị nkịtị ọchịchị n'ime otu afọ na-abịa abịa.
Nke a bụ nkwekọrịta ha nwere n'ọgbakọ gbatagbata ha mere n'ụbọchị Fraịde, nke onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari sonyere na ya.
N'ọgbakọ ahụ, Buhari gwara ndịagha Mali ka ha buru ọdịmma ndị ha na-achị n'obi ma hapụ ịchọ naanị ihe ga-adị ha onwe ha mma.
Buhari kwuru sị: "Ọ gaghị adị mma ka mba Mali nọrọ naanị ya. Nke a mere o ji dị mkpa na ha ga-agba mbọ wepụta atụmatụ ha ga-eji hafee ọchịchị n'aka ndị nkịtị ma banyekwa ọchịchị onye kwuo uche ya."
"Nke a bụ ihe ga-akara Mali nakwa Ecowas mma."

Ebe foto si, Nigerian Presidency
Buhari rịọrọ ndịisi ndịagha Mali ka ha gbado anya n'ichekwa obodo ha karịa itinye anya n'ọchịchị.
Ọ gara n'ihu kwuo sị: "Ana m arịọ ndịisi ndịagha ka ha tọhapụ ndị ọchịchị niile ha ji eji n'egbughi oge ọbụla."
"Ha gbakwaa mbọ malite usoro ịhafe ọchịchị n'aka ndị nkịtị, nke a ekwesịghị ịgafe ọnwa iri na abụọ."
"Naịjirịa na Ecowas ga-enye aka iweta ihe niile dị mkpa a ga-eji mee ntuliaka na Mali ma weghachi ọchịchị onye kwuo uche ya."

Ebe foto si, AsoRock Villa/Facebook
Lee ihe ndị Ecowas na ndị agha Mali kwekọrịtara
Cheta na otu Ecowas wepụtala mpụtara nzụkọ abalị atọ ha na ndị agha were ọchịchị n'ike na mba Mali nwere.
Dịka Ecowas si kwuo, ndị agha ahụ chọrọ ka enye ha ohere afọ atọ maka iweghachi ọchịchị n'aka ndị nkịtị nke ha chọrọ ịhazi afọ atọ fọọrọ onyeisiala ha chuturu n'ọchịchị bụ Ibrahim Boubacar Keita.
Ndị aha ahụ kporo oku ka e nwee Praim Minista nakwa onyeisiala ọhụrụ ndị agaghị enye ohere ịzọ ọkwa n'afọ 2023.

Ebe foto si, Rex Features
Akụkọ kwuburu na ndị agha ahụ atọhapụla Praim Mịnịsta bụ Boubou Cisse nakwa onyeisi ụlọomeiwu bụ Moussa Timbine bu ndị so na mmadụ 19 ndị ọrụ gọọmenti a jichiri kemgbe abalị 18 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2020.
Ụnyaahụ bụ Tọzde, ndị agha a tọhapụrụ Keita bụ onye ha jibụ eji.
Ntọhapụ Keita so na ọnọdụ otu Ecowas nyere ha ha ga-eji wepụ mmachi ha machiri Mali.
Ndị agha ahụ bụ ndị kwuru nke a na Facebook sị na Keita nọzị n'ụlọ ya ka ọ dị ugbua.
O dobeghị anya ma ha asị Keita esila na be ya pụọ.
Ịtọhapụ Keita bụ ihe kacha mkpa ndị agbataobi, ndị mba ofesi na African Union nakwa ogbo ha nke ndị Europe.
Ndịagha Mali ekwebughị ka a kpọghachi Keita dịka onyeisiala ka Ecowas si chọọ

Ebe foto si, EPA
Mkparịtaụka e mere na mba Mali maka idozi okwu na mba ahụ dịka ndị agha weghachara ọchịchị n'izuụkaz hara aga ebilea na enweghị nkwekọrịta ọbụla
Ndị ndu mba dị ga n' Ọdịda-Anwanwụ Afrịka chọọ ka ndị agha nyeghachi ọchịchị n'aka onyeisiala ha chụtuburu bụ Ibrahim Boubacar Keïta.
Mana ndị agha ahụ ekwenyeghị na ihe ndị nnọchiteanya si Ecowas gụnyere Goodluck Jonathan gwara sị na ọ bụ ụzọ kachasị mma ibi ya bụ okwu.
E mere ngagharịịwe kpụ ọkụ n'ọnụ tupu a chutuo Keïta n'ọkwa onyeisiala, ebe ọtụtụ ndị ala ahụ nabatara nchụda a chụdara ya.

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Facebook
Ọnụ na-ekwuru ndị agha na mba ahụ gwara bụ Col Ismael Wague gwara ụlọakụkọ Reuters ka e emechara mkparịtaụka ahụ na ọ bụ ndị Mali ga-ewu ndị ga-achị ha.
Lee ndị isiagha kpara nkata iweghara ọchịchị n'ike na mba Mali

Ebe foto si, EPA
E ji n'aka na ị nụla na ngalaba na-ahụ maka nchekwa n'otu United Nations enyela ndị agha mba Mali iwu ka ha wepụ aka n'ọchịchị mba ahụ ha weghaara n'ike.
Nke a na-abịa dịka otu Afrịka Union nakwa otu Ecowas katọrọ nchutu ndị agha mba Mali chuturu onyeisiala mba ahụ bị Ibrahim Boubakar Keita nakwa Praịm Mịnịsta bụ Boubou Cisse.
Ndị 'UN Security Council' kpọburu oku ka ndị agha ahụ tọhapụ Keita, Cisse na ndị ọzọ niile ha ji eji, ma laghachi n'ogige ha N'egbughị oge.
Ọtụtụ ndị ọchịchị na mba dị icheiche katọrọ mweghara ọchịchị nke ndị agha weghaara na mba Mali.
Ha kwuru n'oge agaala mgbe ndị agha na-eji egbe nakwa iyi egwu eweghara ọchịchị.
Mana ị ma ndịagha kpara nkịta ahụ ghọrọ ngịga?
Ndị agha kpara nkata ịchutu Keita

Ebe foto si, EPA
1) Col.Malick Diaw

Ebe foto si, EPA
Malick Diw bụ osote onyeisi ogige ndị agha mba ahụ nke dị na Kati Camp.
Enweghị ọtụtụ ihe a ma maka Diaw.
Kama ọ bụ nsonso a ka o si mba Rụshịa lọta ebe ọ gara ọmụmụ.
2) Gen Cheick Fanta Mady Dembele

Ebe foto si, EPA
Ọ gara mahadum na Saint-Cyr military Academy nke dị na mba Fransị.
Ọ gụ kwara akwụkwọ na General Staff College nke dị na Koulikoro, Mali.
Dembele nwekwara asambodo nke mahadum dị na Paris ebe ọ gụrụ maka ihe mere nke bụ History na bekee.
Ọ bụbu onyeisi na-ahụ maka esemokwu na nhazị nke otu African Union peace and security Commision dị n'Addis Ababa na mba Ethiopia.
O nwere asambodo mmụta Masters sitere na mahadum Federal Army University dị na Munich, Jamanị.
3) Col Sadio Camara
Col Camara bụbu onyeisi Kati Military Academy.
A mụrụ ya n'afọ 1979 n'obodo Kita.
Camara bụ onye nchịkọta Kita Military academy ma mechaa gaa mba Rụshịa maka ọmụmụ agha.
Gịnị mere na Mali?

Ebe foto si, AFP
O teela ndị mmadụ ji malite ime ngagharịiwe ka Boubakar Keita rituo n'ọkwa mana ọ jụwara isi.
Ndị na-akatọ ya kwuru na nrụrụaka gọọmentị emeela ka ọnọdụ akụnụba mba Mali tikpọọ.
Ọzọkwa bụ na ndị agha ụka alakụba nke Bekee kpọrọ 'Jihadists' emeela ọtụtụ mmadụ na mba Mali ụra aga n'anya.

Ebe foto si, Getty Images
Mana n'ụtụtụ ka a nụrụ ka egbe na-ada aghara aghara n'ogige ndị agha, nke mere ka akụkọ malite ifegharị na ndị agha na-achọ ichutu onyeisiala n'ike.
Na mgbede ya, ọnụ na-ekwuru gọọmentị mba Mali bụ Yaya Sangare gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ndịagha anwụchiela onyeisiala Keita nakwa Praịm Mịnịsta Cisse.
Ngwangwa ahụ ka otu Ecowas ji zipu ozi ma katọọ ya bụ ihe. Mba Denmark nakwa Fransị sochiri ha azụ.

Ebe foto si, Reuters
N'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde, Onyeisiala Ibrahim Keita pụtara n'onyonyo TV kwuo na ya agbaala arụkwaghịm.
O kwukwara na ya ekposaala ụlọomeiwu mba ahụ.
Keïta kwuru sị: "Achọghị m ka a kwafuo ọbara ọbụla makana a chọrọ idowe m n'ọchịchị."
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










