International Criminal Court: Ihe ise ikwesiri ịma maka Chile Eboe-Osuji

Akụkọ ga-amasi gị n'ụtụtụ a:

Onye bụ Ọkaikpe Chile Eboe-Osuji?

Onyeisiala Buhari na Ọkaikpe Osuji

Ebe foto si, @MBuhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari nabatara Chile Eboe-Osuji bụ onyeisi ụlọikpe mba ụwa bụ International Criminal Court n'Abuja taa.

Osuji bụ nwaafọ Anara Isiala Mbano dị n'Imo Steeti rigoro n'ọkwa a n'abalị iri na otu ọnwa Maachi n'afọ 2018.

Ihe ise ikwesiri ịma maka Chile Eboe-Osuji

Chile Eboe-Osuji

Ebe foto si, @MBuhari

  • A mụrụ Eboe-Osuji n'abalị abụọ ọnwa Seputemba afọ 1962 n'obodo Anara Isiala Mbano, Imo Steeti.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba iwu na Mahadum Calabar Naịjirịa, Mahadum McGill Canada nakwa Mahadum Amsterdam dị na Netherlands.
  • E durula Eboe-Osuji n'iyi ọrụ dịka ọkaiwu na Naịjirịa n'afọ 1986, ma duo ya n'ọrụ dịka ọkaikpe n'ụlọikpe Mbaụwa n'afọ 2011.
  • O kpeela ọtụtụ ikpe na mbaụwa nke gụnyere ikpe onye bụbu osote onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto.
  • N'ihi mbalị ya n'ụlọikpe mbaụwa, a họpụtara ya dịka onyeisiala ụlọikpe mbaụwa n'afọ 2018

NBC ebuliela mmachị AIT na Ray Power FM

Njirimara AIT

Ebe foto si, @AIT_Online

Ụlọọrụ na-ahazi mgbasaozi n'ikuku na Naịjirịa bụ NBC n' ịchafụ ebuliela mmachi ha machiri ụlọọrụ ntaakụkọ AIT na nwanne bụ Ray Power FM.

Onyeisi NBC bụ Isaq Modibbo Kawu kwupụtara mkpebi a ụbọchị Fraịde

N'ofesi

Okpomókú na mba Fransí

Ebe foto si, AFP

Mba Fransị nọ n'ihe mgbu n'ihi oke ekpomọkụ kachasị ibe nke ogogo ya karịrị digiri iri anọ na ise gburula ọtụtụ mmadụ na mba Yurope.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba ahụ bụ Agnes Buzyn kwuru na onye ọbụla nọ n'ihe ize ndụ.

N'egwuregwu

AC Millian nke Italị

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwuregwu AC Milan agaghị ahụ gbaa na mba Yorupe n'ime otu afọ na-abịa abịa maka ịda iwu na-echekwa ego ole eji azụ ndị ọgba bọọlụ.

Nke a bụ site na nkwekọrịta ha na otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Yorupe bụ Uefa nwere.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ụmụnwaanyị Naịjirịa na-agba akwụna na Mali - NAPTIP

20,000 siri Edo na Delta na-agba Akwuna na Mali - NAPTIP

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, 20,000 siri Edo na Delta na-agba Akwuna na Mali - NAPTIP

Ngalaba na-achọ ịkwụsị mgbere mmadụ bụ NAPTIP ekwuola na ụmụnwaanyị Naịjirịa puku iri abụọ ọkachasị n'ime ha si Delta na Edo steeti na-agba akwunakwuna na mba Mali.

Onyeisi NAPTIP na Benin bụ Nduka Nwanwenne kwuru nke a ụbọchị Tụsde n'Edo steeti ka ha na-eme emume mgbasaozi nke ha kpọrọ "I am Not For Sale" n'okwu Bekee.

Ọ bụ kwa kemgbe ọnwa Jenuarị nke 2019 ka achọputara umunwanyi buku iri abụọ a na Mali.

Akụkọ azmaha

Africa Union Summit

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị isiala mba Afrika nwere ọgbakọ maka nkwekọrịta azụmahịa

Naịjirịa nwereike sonye n'atụmatụ akpọrọ African Continental Free Trade Area

Nke a na-abịa dịka nkalaba Ehiwere n'afọ 2018 ichọputa ma Naịjirịa a ga-erite uru na ya si na o dị mkpa isonye.

Onyeisioche ngalaba nchọpụta a bụ Desmond Odadiah kwuru na atụmatụ a nwere ike iweta ọghọm kama nchọpụta ha egosila uzọ a ga esi gbochie ọghọm ma rite uru na ya bụ aro.

Lee ihe onye bụbụ Minista na-ahụ maka mgbere gwara BBC Igbo maka atụmatụ a.

Aha onyonyo, Ihe Enelamah kwuru maka African Continental Free Trade Area (AfCFTA)

Akụkọ si Afrịka

Onye na-achọ akụ di n'ime ala n'CongoDR.

Ebe foto si, AFP/Getty

Nkọwa foto, Onye na-achọ akụ di n'ime ala n'CongoDR.

Na mba Congo DR, ihe ruru mmadụ iri atọ na isii anwụọla na mberede mere n'ebe a na-egwupụta ọla nchara.

Ndị gbatagbata kwuru na ndị ihe mberede a metutara dara iwu n'ihi na ha enweghị ikike ichọ Akudinala ma tinye kwa na ha ejighi ngwa ọrụ nke kwesịrị ekwesị.

A na-atuanya ichọta ndị ọzọ aja dachiri na mberede a.

N'egwueregwu,

Red Kardị

Ebe foto si, REUTERS

Nkọwa foto, Red Kardị maka ajọ omume.

Ajọ omume emela ka agba ndị bọọlụ abuo biara asọmpị AFCON ụgbọ nwa mkpị.

Adama Niane nke Mali lara n'ihi na ọ mara onyendu ha akanti

Achụpụru Amr Warda nke Ijipt maka agwa ọkpasịrị ụmụnwannyị.

Gee nkeji a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo, Alex Ekubo Zangwa ngwa

Akụkọ ga-amasị gị: