Hope Uzodimma ewetuola obi, gbatia aka udo

Ebe foto si, Hope Uzodimma Facebook page
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma ekwuola na ya ga-anabata mkparịtaụka ọbụla ga-ame ka tigbuo zọgbuo kwụsị na steeti ya.
Gọvanọ Uzodimma kwuru nke a mgbe ọ na-agụpụta ozi emume ụbọchị ncheta nwereonwe Najirịa n'ụbọchị satọde bụ June 12, 2021.
O kwuru na ọdịghị mma ka Imo steeti were obere akụ na ụba ha nwere na-ahazi nsogbu ogbaghara na-ebute maka nchekwa.
Uzodimma kwuru na udo na-eweta ọganihu ya mere o ji di mma ka onye ọbụla tinye mma n'ọbọ ka e jiri nwayọ chọwa ihe dabara na mmiri.
Cheta na kamgbe ọnwa atọ gara aga ka mkpa mkpa a ndị o ji egbe na-akpa n'Imo steeti.
Mkpa mkpa a gụnyere ịgba egbe aghara aghara, ịmụnye ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ nakwa ụlọọrụ gọọmenti nakwa igbu ndị mmadụ ụfọdụ oge.
Hope Uzodimma: 'Enwebeghi amụma Primate Ayodele buru n'isi ya mezurunu' - Emelumba

Ebe foto si, Facebook/Hope Uzodimma
Declan Emelumba bụ kọmishọna mgbasaozi n'Imo steeti, ekwuola sị "nke a abụghị mbụ Primate Ayodele na-ebu amụma maka Gọvanọ Hope Uzodimma, mana enwebeghi nke mezurunu".
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị uche Chineke ga-eme oge ọbụla.
Emelumba kwuru na ọ bụrụ na Ụlọikpe Ukwu mechaa kwuo na ha ga-elebanye ikpe ahụ anya ọzọ, na ha ga-adị njikere.
Nke a na-abịa dịka Primate Elijah Ayodele bụ onyeisi ụlọụka INRI Evangelical Spiritual Church, buru amụma na ụlọikpe ga-enyochagharị ikpe Gọvanọ Hope Uzodimma.
BBC Igbo kpọtụrụ Primate Ayodele dịka akụkọ na-efegharị na o kwuru na Ụlọikpe Ukwu nke Naịjirịa ga-achụpụ Uzodimma n'oche gọvanọ Imo steeti.

Ebe foto si, BBC/Gọvanọ Uzodimma
Mana Primate Ayodele kwuru na enweghi ihe ọzọ o kwuru karịa na Ụlọikpe Ukwu n'oge na adịghị anya, ga enyocha ya bụ ikpe kpọbatara Uzodimma ọchịchị.
O kwuru sị ka "Uzodimma kee nkwụcha n'ihi na Ụlọikpe Ukwu ga-enyocha ikpe kpọbatara ya n'ọchịchị dịka Gọvanọ Imo steeti".
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya na Uzodimma ekwubeghi okwu, na ọ hụtubeghikwa ya mbụ ma kwukwaa na ọ gatubeghi Imo steeti, nke pụtara na ọ bụghị mmegide ka ọ na-achọ imegide ya.
Cheta na Fada Mbaka buru amụma na Uzodimma ga-enweta oche gọvanọ Imo steeti n'ọnwa Jenụwarị.











