'Hope Uzodimma ga-ewetara ndị Imo ọrụ 400,000' - Fr Mbaka
Ụkọchukwu na- elekọta Adọration Ministry Enugwu bụ Fada Mbaka ekwuola na mmeri niile Hope Uzodinma na-enweta n'ụlọikpe si n'aka Chukwu.
Fada Mbaka kpọpụtara ọtụtụ ọrụ Uzodimma ji n'aka dịka ụlọmmepụta ngwaahịa ọhụrụ o si ala bekee eweta n'Imo, nke o kwuru ga-enye mmadụ 400,000 ọrụ n'Imo steeti.
Mbaka toro Uzodimma wee kwuo na nwa mgbe nta ọ nọrọ n'ọchịchị, anaghịzi eji ndị ọrụ ụgwọ ma ncha n'ihi na ndị ọrụ oyibo n'Imo na-erizi ụgwọọnwa kwa ụbọchị iri abụọ na ise n'ọnwa ọbụla.