South East attacks: "unknown gunmen" gburu mmadụ atọ n'Owerri Imo state ụnyaahụ

Ndị unknown gunmen e setere n'Owerri taa
Nkọwa foto, Ndị unknown gunmen e setere n'Owerri taa

Ndị uweojii Imo steeti sị na mmadụ atọ nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara dapụtara n'akwaụgbọala gara Orji n'Owerri, isiobodo Imo steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Imo bụ Bala Elkana sị na onweghị onye otu ha nwụrụ na ya bụ mgbo a ha na ndị omekome a kwarịtara.

Ọ sị na ka ọ dị ugbua, na udo alọghachitela na ebe ahụ dịka ha na-etinye anya ịmata ndị bụ ndị mere ihe ahụ.

Ọsọ gbara na mpaghara Ojị dị n'Owerri ka ndị mmadụ chị obi ha n'aka, dịka ndị amaghị ndị ha bụ bu egbe na-agha egbe aghara aghara na mpaghara Ọjị, dị n'Owerri isi obodo Imo steeti na mgbede Tọzde.

Kepukepu na-ekwu na mgbọ tụrụ ụfọdụ ndị mmadụ na nso Orji Flyover mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bala Elkana kwuru na ya anatebeghị ozi banyere mkpamkpa na-akpa.

Ndị bi na mpaghara ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị bu egbe na-akpagharị n'ụgbọala Hilux nakwa bọsụ na enweghị onye gbaghara ha okwu.

Nke a mere oke n'ọsọ, ngwere n'ụzọ dịka ndị nwere ọdọahịa, ụlọakụ nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ were ọzọ mechie.

N'otu aka ahụ ndị ọkwọ ụgbọala waara ọzọ nke mere okporoụzọ Owere gawa Okigwe nke na-ekwokarị ekwo tọgbọọ chakoo.