Insecurity in South-East: Lee ebe niile e nwere mwakpo n'ala Naịjirịa kemgbe izu a

Ogige ndị uweojii na Nkporo n'Okpuru Ọchịchị n' Abia steeti.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị o ji egbe wakporo isiụlọọrụ ndị uweojii bụ Divisional Police Headquarter dị na Nkporo n'Okpuru Ọchịchị Ohaji n' Abia steeti.

Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ kwuru na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ mwakpokama a gbara ọgbatutu ndị uweojii nakwa ihe ụfọdụ ọkụ.

N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ndị uweojii gbochiri na ihe e mebighị dịka ndị mere mwakpo ahụ siri kwado.

Ọgbatumtum gbara ọkụ n'ogige ndị uweojii na Nkporo n'Okpuru Ọchịchị Ohaji n' Abia steeti.

Ọ sịrị, "Ha tụrụ ogbunigwe n nke mebiri oche. Ha gbakwara ọgbatumtum nndị uweojii dị n'iro, kụwasịa ugegbe ụgbọala ndị uweojii ma zuru ọgbatumtum abụọ bụ ihe akaaebe ndị mmadụ ndị uweojii jichiri."

Ogbonna, onye kwuru na o nweghị onye nwụrụ na mwakpo ahụ kwuru na ha amalitela nnyocha iji mata ihe mere n'uju.

Umahi amachiela ngagharị dịka e gburu ndịagha abụọ, ndị ọzọ n'Ebonyi steeti

Dave Umahi

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahii amachiela ngagharị na Steeti ahụ malite n'Elekere Asatọ nke abalị rue Elekere isii nke ụtụtụ dịka e gburu ndịagha abụọ,otu onye uweojii, otu onye nkịtị ebe egbe tụrụ onyeisi ụlọakụ n'ụkwụ dịka mpiti kwere na steeti ahụ na ngwụcha izuụka.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abaliliki Isiobodo Ebonyi steeti ụbọchị Wenezde oge ọ na-agwa ha ihe ha jetara n'ọgbakọ nchekwa ha nwere, Umahi sị: `Anyị enyeela iwu ka ịmụanya abalị niile kwụsị n'Elekere isii nke mgbede. Ndị ọrụ okpuruọchịchị, Ebubeagụ nakwa ndị Ọrụ nchekwa ga-ahụ na-agbaso iwu a. Onye ọbụla dara ya bụ mmachị ga-akwụ otu nde naira."

Umahi boro ndị obodo Agila dị na Benue steeti ebubo na aka ha dị na mkpamkpa ahụ kpara na Mgbo dị n'Okpuru Ọchịchị Ohaukwu dị na steeti.

Aha onyonyo, Ebonyi steeti: Ihe mere na Ngbo, Ebonyi Steeti

O sịrị na ndị Agila na-akwụ ndị Fulani ụgwọ ka ha bata na steeti ahụ na-ezu ohi ma na-egbusịsị mmadụ ma na-ebo ya ndị otu Ipob na ESN.

"Anyị ma maka ọgbụgbụ e gburu otu onye uweojii, ndị agha abụọ, otu onye nkịtị na ngwụcha izuụka."

Ndị ekperima gbuchaa ha tinye ya na sochal midia si na ọ bụ ndị Ipob na ESN, ma Ipob na ESN na-agọ na aka ha dịghị ya."

Umahi onye jụrụ ajụjụ ma ịgba mbọ nnwereonwe ọ pụtara igbusisi ndị aka ha dị ọcha kwuru sị, " Ihe m ma bụ na mpụ bụ mpụ, enyela m ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha kpochapụ mpụ niile na steeti a."

O gara n'ihu kwu na ndị niile aka ha dị n'ogbugbu ndịagha na ndị uweojii na ha ga-azara ọnụ ha n'ihu iwu.

N'aka nke ọzọ, o nyere ndị dibia niile nọ na steeti abalị asaa ka ha denye aha ha n'aka gọọmentị steeti ahụ.

Umahi nyekwara ndị na-agba ọkada iwu ka ha malite otu nche ga- na-ejide ndị ji ọkada eme mpụ, enmmeghị etu ahụ ya amachie ha na steeti ahụ.

Lee ebe niile njinji jiri n'ala Naịjirịa kemgbe izu a

Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa ekwuola ugboro ugboro na ha-emeri Boko Haram

Ụjọ na gbagharịa ji ụfodụ ọtụtụ mmadụ ugbua maka akụkọ metụtara ọnọdụ nchekwa obodo na-aakawanye njọ si na gburugburu Naịjirịa apụta.

Ọtụtụ ha mere n'Ọwụwa anywanwụ ebe ndị ọzọ na-eme kwa ebe ọzọ n'ala Naịjirịa.

Lezie ngụkọ akụkọ ndị ahụ bụ ndị BBC Igbo chọpụtara mere kemgbe izu a.

N'Ebonyi steeti

- Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị ugbua na-ekwu na awakpoola otu ụlọakụ dị n'ebe a na-akpọ Onueke n'okpuruọchịchị Ezza.

Nke a mere n'ụbọchị 27 ọnwa Eprelu afọ 2021, otu onye uweojii nwụrụ ebe ndị mmadụ gbachiri ụlọahịa ha gbawa ọsọ ndụ.

- Na nke yiri ya ke mekwara taa bụ Tuusde ụbọchị 27 nke ọnwa Eprelu 2021 bụ na a wakporo ụlọikpe etiti nke dị Abakaliki dị n'Ebonyi steeti n'ụbọchị Tuzde.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ kwuru na o nweghi onye nwụrụ na ya bụ mwakpo.

Ụlọikpe etiti dị na Abakaliki agbara ọkụ

N'Anambara steeti

Ndị a maghị ndị ha bụ gburu mmadụ itoolu n'Igbariam, Anambara steeti. Nke a mere ka ụmụakwụkwọ bi n'akụkụ ebe ahụ gbapụ ọsọ ndụ maka ụjọ mmegwara n'aka ndị Fulani.

Gọọmentị Anambra steeti kwuru na ha na-enyocha ya bụ okwu mere n'ụtụtụ Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021.

Ụmụakwụkwọ na-agbapụ ọsọ ebe ha bi maka egwu ihe nwereike ịme

Ebe foto si, Geraldmjay

- Ndị omekome wakporo ndị uweojii na Kebbi steeti gbuo ndị uweojii asatọ nakwa ndị nche obodo abụọ.

Nke a mere na Monde ubochi 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021.

Ndị uweojii Naijiria

Ebe foto si, AFP

- Ndị ntọ egbuola mmadụ abụọ n'ime ụmụakwụkwọ Mahadum Greenfield atọọrọ na Kaduna.

Achọtara ozu ha na mpaghara steeti ahụ na Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Eprelu dịka Gọvanọ steeti ahụ katọrọ ya bụ ihe mere,

Mahadum Greenfield

Ebe foto si, Greenfield University website

- Ndị ojiegbe bụ "Unknown gunmen" gburu ndị ọrụ nchekwa ruru itoolu na Rivas steeti dịka awakporo ogige "check point" ha.

Nke a mere na mgbede ụbọchị ụka bụ 25 n'ọnnwa Eprelu afọ 2021 dịka akụkọ nchekwa na akawanye njọ.

Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

- Ndị agbero na ndị ọkada kwakọtara isi n'Iyana Iba dị na Legọs steeti.

Nke a mere n'ụbọchị Monde 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

- Ihe rụrụ mmadụ iri ise nwụrụ n'aka ndị ojiegbe akpọrọ "unknown gunmen" na steeti Rivas, Kebbi, Anambra, Borno, Ebonyi nakwa Imo steeti.

Mwakpo ndị a niile mere na Monde ụbọchị 26 nke ọnwa Eprelu afọ 2021.

Ndí agha Naíjiría

Ebe foto si, Nigerian Army/Twitter

- Awakporo ụlọorụ ndị uweojii n'Okigwe Saụt dị n'Imo steeti n'abalị ụbọchị Monde 26 ọnwa Eprelu afọ 2021.

Akụkọ pụtara bụ na ndị uweojii mmadụ ise nwụrụ na ya bụ mwakpo amabeghi ndị mere ya.

- Ndị amaghị ndị ha bụ na-agbapụ egbe n'Amawusa nakwa Douglas Road.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na a na-akwa mgbọ abali niile rue ụtụtụ mana

Etu Douglas road dízi ugbua

- Awakporo be Sunday Adeyemo a ama dịka "Sunday Igboho" n'Oyo steeti n'abalị ụbochị Sunde 25 ọnwa Eprelu afọ 2021.

Ọnụ na-ekwuru ya bụ Dapo Salami gwara BBC na ụda egbe malitere n'etiti abalị ma rue ụtụtụ nakwa na amaghị ọnụọgụgụ ndị ahụ bịara ịwakpo ụlọ ya.

- Ndị amaghị ndị ha bụ gbara ụlọ Igwe Ifitedunu ọkụ n'abalị ụbọchị Sunde.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

- Ndị agha elu mere mmehie gbagbuo ndị agha ibe ha n'ala dịka otu Boko Haram na-awakpo ha.

Ụgbọelu nke ndịagha elu Naịjirịa

Ebe foto si, @NigAirForce/Twitter