Anyị ka na-eche ego eji kpe udo na nghọtaghie okeala Ebonyi na Benue - National Boundary Commission

Ọgbaghara si n'okwu ndọrọndọrọ ala dapụtara n'obodo ise dị n'Ebonyi steeti achụpụla ndị mmadụ na be ha.
Okwu a dị n'etiti ndị okpuruọchịchị Ohaukwu nakwa ndị okpuruọchịchị Ado dị na Benue steeti bụ nke na-akpọtụ kemgbe afọ ole na ole gara aga.
Onyeomeiwu nọchitere anya Ohaukwu n'ụlọomeiwu Ebonyi steeti bụ Chinedu Onah ebela akwa arịrị gbasara ya bụ okwu.
O kpọrọ oku ka gọọmentị etiti gbatara ha ọsọ enyemaka iji kwusị oke ogbugbu nakwa imefu ndụ si na ya bụ okwu apụta.

Ebe foto si, OnahChinedu/Facebook
Onah kọwakwara na ndị ahụ gbara ọsọ ndị enweghi ebe ọbụla ha ga-edebe isi ha maọbụ ihe oriri ha ga-eri.
"Mmefu ndụ, ngwa obibi nakwa osisi ndị na-amị ego na-eme ebe a na-ewute anyị n'obi" ka o kwuru.
Ọ na-akpọku gọọmentị etiti ka ha kpọbata ndị 'National Boundary Commision' iji kpebie udo n'ala ahụ ọfụma ka esemokwu an ogbugbu dị n'ime ya kwụsị.
Mana ndị ọrụ ngalaba NBC kọwarala BBC n'ekwentị ihe ji nkịta ọnwụ.
Austin Omale na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ onyeisi NBC kọwara na ọ bụ ego ji ha ịrụpụta ọrụ dị n'ike oke ala ahụ ọfụma.
O kwuru na o teela aka ngalaba ya na-eche ka gọọmentị eititi wepụta ego a ga-eji ga Ebonyi steeti ruọ ọrụ a.
"Kemgbe ọnwa Septemba afọ 2019 ka anyị na-eche ka ego a ruo anyị aka mana o nwebeghi isi" ka o kwuru.
O kwukwara na mgbe ikpeazụ ha gara ebe ahụ ịrụ ọrụ na ndi obodo dị nso ebe ahụ wakporo ha.
Okwu ala ataala isi mmadụ abụọ n'Ebonyi

Mmadụ abụọ anwụọla ebe ọtụtụ ihe ndị mmadụ mebiri dịka okwu ala dapụtara n'etiti ndị obodo Nguji Ojiegbe Onunwakpu na ndị Ndiegede nke dị na Igbeagu, dị na mpaghara okpuru ọchịchi Izii, Ebonyi steeti n'ụbọchị Wenesde.
Akụkọ na-akọwa na esem okwu a bidoro kamgbe afọ 2012.
Onye ntaakụkọ gwara BBC na mmadụ abụọ aha ha bụ Sunday Odom, dị afọ iri abụọ na anọ bụ onye obodo Onunwakpu, na Emmanuel Uguru nke Ndiegede bụ ndị nwụrụ n'ọgụ gbasara ala a.
Ọ bụ n'ịzuụka abụọ gara aga ka kọmịshọna na-ahụ maka oke ala na iweta udo bụ Stanley Okoro Emegha nke Ifeanyichukwu Igurube nọchịtere anya ya bịara njem nyocha na ntule ya bụ ala na-ese okwu ma gwa ndị obodo abụo a ka ha wepụ aka n'ala ahụ tupu gọọmenti ekpebie maka ya.
Otu onye nwa ya nwụrụ bụ Odom Abama kwuru na-egburu nwa ya nwoke na-agbanyeghị na o bụghị onye obodo ndị a na-ese okwu a.
Abama kwuru na nwa ya nwoke na nwanne ya nwaanyị gara ubi dị nsọ ala ahụ na-ebute okwu mgbe ndị okorobịa a na-ache na ha bụ ndị Ndiegede gbara ya egbe n'afọ.
O kwuru sị " A nọ m n'ubi mgbe m nụrụ ozi na a gbara nwa m nwoke egbe, nwa m ka lụrụ nwaanyị nsonso a ma mụa kwa nwa nwaanyị. Gọọmentị biko gbatara anyị ọsọ enyem aka".

Abama kọwara na-akpọrọ nwa ya gaa ụlọọgwụ ebe ọ nọ nwụọ.
Eze Ogbodo Onunwakpu bụ Mbam Nwambam Ekpem, kwuputara na obi adịghị ya mma dịka ihe ndị obodo ya gabigara na ya bụ esemokwu.
Ọ sịkwa na ha na ndị obodo Ndiegede enweela nghọtahie ala mbụ kama ha doziri ya n'udo.
Ekpem katọrọ etu ndị ntoroọbịa siri lụsa ụmụnne ha ọgụ ma rịọ ka Gọvanọ Ebonyi bụ Dave Umahi gbtara ha ọso enyem aka.
Mazị Ominiyi Febian onye bụkwa onyeisi n'obodo Nguji kwuru na agbara ụlọ ya ọkụ ma mebie ubi osikapa ya.

O kwuru sị " Ọ bụ n'ụbọchị wenesde ka m sị ubi alọta mgbe m nụrụ ụda egbe, a gbahachịrị m azụ. Ọ bụ ka ebe niile dere duu ka anyị chọpụtara na-agbara ụlo niile dị na Azungele ọkụ".
N'otu aka ahụ, onye ode akwụkwọ otu a kpọrọ "Igbeagu Stakeholders Forum" katọrọ ihe mere ma sị ka gọọmentị gbatara ha ọsọ were dozie ya bụ esem okwu.
Ka nke a na-eme ka Eze obodo Nguji Ojiegbe bụ Innocent Igbeagụ kagburu ya bụ ọgụ dị n'etiti obodo abụọ a ma kelee ngalaba na-agba mbọ ihu na ewetara udo n'etiti ha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bu Loveth Odah kwenyere na mwakpo mere, mana ọ sị na ọ bu otu nwoke di afọ 75 nwụrụ site na ya.
Ọ sị na a na-achọbu nwoke ahụ, ma mechaa hụ ozu ya.











