Nwaanyị Ngbo ndị Agila gburu gafere ebe gọọmentị sị onye agala - Ndị uweojii Ebonyi steeti

Obodo Izzi dị n'Ebonyi
Nkọwa foto, E ji ihe gbochie okporoụzọ n'obodo Izzi dị n'Ebonyi dịka ha na ndị Ukelle na-azọ ala. Ọzụzọ okeala ebutela ọnwụ ọtụtụ mmadụ n'Ebonyi steeti

Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ọ bụ nnupuisi iwu gọọmentị tinyere, butere ọnwụ otu nwaanyị na nwa ya n'obodo Umugudu-Akpu dị na Ngbo na steeti ahụ.

Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na nwaanyị ahụ na nwa ya so gaa n'ọrụ ugbo ha dị nso okeala ndị Ngbo na ndị Agịla dị na Benue steeti, bụ ebe gọomentị Ebonyi steeti kwuru sị ndị mmadụ agazịla iji gbaara ụdịrị okwu na ụka a ọsọ.

Odah kwuru na esemokwu a tara isi mmadụ abụọ a, mere n'ụbọchị 20 nke ọnwa Mee 2020.

O kwuru na ha bụ ndị uweojii anwụchiela Igwe nakwa onyeisi otu obodo Umugudu-Akpu, n'ihi na ha gharịpụrụ n'ihe ha kwesịrị ime, nke bụ ịhụ na ndị ha na-achịkọta gere ntị ma ghara itinye onwe ha na ụdịrị nsogbu a.

Odah kwukwara na ihe mere e ji sị ndị obodo abụọ a agala nso okeala ahụ bụ n'ihi na e ji ya mere ihe akaebe nke Bekee kpọrọ "exhibit", na nnyocha ndị uweojii na-eme.

Marakwa na nke a abụghị nke mbụ, nke abụọ maọbụ atọ okwu ala na okeala na-ebute nkwafu ọbara n'Ebonyi steeti.

Ọnwụ nke ọnwa Mee a na-abịa na-erughi ọnwa atọ ụdịrị okwu a tara isi ihe ruru mmadụ iri n'obodo Ndiagu Orie, dị n'Umugudu-Akpu.

N'ọnwa Mee nke afọ 2019, mmadụ anọ nwụkwara n'ụdịrị okwu a. Ha bụ ndị nọ na kọmitii e kewapụtara ka ha mara etu a ga-esi kwụsị esemokwu a dị n'etiti steeti abụọ a.

Ihe nkiri a na-akọwa maka esemokwu dị n'etiti ndị Izzi na ndị Ukelle:

Aha onyonyo, Onye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ