UK Asylum to Ipob: Mba Briten ewepụla atụmatụ ịnabata ndị na-achọ nnwereonwe Biafra n'ọba ịntanetị ha

Ọkọlọtọ mba Uk

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ngalaba gọọmentị Briten a kpọrọ "Home Office" ewepụla ozi dịbụ ba ọba intanetị ha na-akọwa etụ a ga-esi nye ndị na-agba ọsọ ndụ maka ha so n'otu na-achọ nwereonwe Biafra.

Cheta na akụkọ pụtara na mba Briten etinyela uchu na okwu inye ndị na-achọ Biafra ihe Bekee na-akpọ "asylum" site na ịwepụta usoro a ga-esi na-ahazị akwụkwọ ndị di etu ahụ wetere.

Ọ bụ onye ntaakụkọ Kadaria Ahmed bu ụzọ gbaa ama na akwụkwọ usoro a adịghịzị ma kwuo na ozi mba UK zitere ha sị na a na-ahazigharị ya bụ akwụkwọ.

Ọ sịkwa na ha si na ha ga-etinyegharị ya ma ha mechaa nhazi a.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

BBC Igbo zigara "Home Office" ozi ịmata etu ihe siri kwụrụ ugbua mana ha asabaghị.

Atụmatụ "nhazigharị" inye ndị na-achọ Biafra ohere ịgbata ọsọ ndụ na Briten bịara ka Naịjirịa gbarụchara ihu maka ya

Inye ndị Ipob 'Asylum' bụ mkparị nye anyị- Gọọmenti Naịjirịa

Mohammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari o ga-enwe ike merị Boko haram?

Gọọmenti Naijiria egosila iwe ha na ohere mgbapụ ka ala Bekee nke mba Briten nyere ndị otu nwereonwe Biafra bụ Ipob.

N'oge ọ na-asa ndị ntakụkọ okwu na nsonso a, Minista Mgbasaozi bụ Lai Mohammedd kwuru na atụmatụ ọhụrụ ahụ Briten hiwere maka ịnabata ndị Ipob gọọmenti na-akpagbu bụ "mkparị".

Usoro ọhụrụ mba UK ga-eji nabata ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) nakwa Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (Massob) na-agba ọsọ ndụ bụ ihe ụwa kpụ n'ọnụ ugbua.

N'ime akwụkwọ usoro ahụ dị na ọbaozi gọọmentị mba Briten ha bụ ụzọ depụta ihe nwereike ime ka ekwuwe okwu nnabata ndị a na-agba ọsọ ndụ nke gunyere mmegbu makana onye ahụ so n'otu Biafra.

Lee usoro ndị ọzọ:

1. Nyocha onye ahụ na-agba ọsọ ndụ:

Ọkọlọtọ mba Uk

Ebe foto si, Getty Images

Mba UK kwuru na ha ga-ebuzo nyocha ma o nwere ihe ziri ezi gbasara onye ahụ so n'otu Ipob maọbụ Massob agba ọsọ ndụ.

Ha ga-ele ma itinyebuola akwụkwọ igba ọsọ ndụ maọbụ akwụkwọ ipụ apụ na mbụ ọbụla.

Ha ga-ele ma o nwere visa ọbụla aha onye ahụ na-agba ọsọ ndụ dị na ya tupu agba ya ajụjụ ọnụ maka nnabata maka ọsọ ndụ.

A ga-enyocha onye ahụ na-agba ọsọ ndụ maka nwalee isụ asụsụ.

2. A ga-elebanya n'okwu ndị na-agba ọsọ ndụ n'otu n'otu

Ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-elebanya mara ma e nwere ihe siri ike dị iche a ga-eji maka ya nabata ndị a na-agba ọsọ ndụ.

A ga-elebanya anya n'okwu gbasara ndị a na-agba ọsọ ndụ n'otu n'otu na-abụghị dịka igwe mmadụ.

O bụrụ na onye ahụ esoghị n'atụmaatụ 'Refugee Convention' agaghị enye ya nchekwa ikike dịara onye.

3. Ihe siri ike mere onye ahụ ji agba ọsọ ndụ

Nke a gụnyere na ndị na-egosi nkwado atụmaatụ ndọrọndọrọọchịchị ọbụla erughị ogo ka anabata ha dịka ndị na-agba ọsọ ndụ.

Ajụjụ a na-ajụkarị bụ imata ma onye ahụ e nwere ihe ngosi zuruoke na-egosi na ụjọ ji ha maka mmegbu a na-emegbu ha gbasara echiche ndọrọndọrọọchịchị ha.

4. Ihe ize ndụ

Nke a pụtara ihe ize ndụ ndị otu ahụ na-agabiga maka ihe ha na-achọ maọbụ nke ha buterela mba ha.

Akwụkwọ ozi ahụ mara atụ sị na onye ọbụla na-akwado Ipob nwere ihe ize ndụ gụnyere nwụchị, ịga ụlọmkpọrọ nakwa mmegbu.

E depụtara na ha ga-enyocha okwu onye na nke ya iji mata ma o were ihe gosiri na ha na-agabiga ihe ize ndụ mmkpagbu.

N'akwụkwọ ozi ahụ ndị ọnụ na-eru n'okwu kwesiri ịnyocha mara ma ntuzi gọọmenti nyere otu Ipob na massob ndị a ọ bụ ima ha ikpe ka ọ bụ imegbu ha.

N'okwu ha, ndị na-agba ọsọ maka ikpe mara ha maọbụ ntaramahụhụ maka arụrụala ha rụrụ abụghị ndị na-agba ọsọ ndụ.

Mana ima ikpe nwereike ibute mkpagbu maọbụrụ na ndị nọ n'ọchịchị ji aka ike na-emeso ịma ikpe ahụ.

5.Nchekwa

Ọ bụrụ na onye ahụ gosi na ezigbo ụjọ ji ya maka mmegbu mba ya, nke a pụtara na ha agaghị enweta ezi nchekwa n'aka gọọmenti mba ahụ, dịka akwụkwọ usoro ahụ si kwu.

6. Mgbapụ ọsọ ndụ n'ime mba onye ahụ na-agba ọsọ ndụ si

Ọ bụrụ na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ gosiri na ezigbo ụjọ ji ya maka mmegbu si n'aka gọọmenti mba ya, ọ ga-arịa ahụ onye ahụ igbaga ebe ọbụla izere ọdachị ahụ.

7. Mkpebi

Ọ bụrụ na ajụ ịnabata mkpesa ndị otu a na-agba ọsọ ndụ, o gosighị na mkpesa ahụ bụcha asị.

Nke a bụ dịka akwụkwọ iwu ndị mbiarambiara na-agba ọsọ ndụ nke afọ 2002 nke nị mba UK .

Ihe ndị otu Massob kwuru maka usoro ndị a

Onyeisi otuMovement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (Massob) bụ Raph Uwazurike kwuru na ha anabataghị usoro ndị a.

O kwuru na ndị mba UK e jighị obiọma wee na-eso ndị Igbo makana ọ bụ akụ na ụba ndị Igbo na-edenyụ anya.

O kwuru na ndị UK kwesiri igwa ndị ọchịchị Naịjirịa ka ha gee otu ndị na-achọ Biafra nti ma mere ha ihe ha na-achọ bụ nwereonwe.

Ipob ọ kwukwaranụ gịnị?

Ọkaiwu ndị Indigenous People of Biafra bụ Alloy Ejimakor kwuru na onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu achọghị ka ndị na-achọ Biafra gbawa mba Britein kama ihe ha chọrọ bụ Biafra.

O kwuru na ihe Britein gosiri site n'inabata ndị otu Ipob na-agba ọsọ ndụ bụ na ha abụghị otu na-eyi egwu dịka Naịjirịa si kpọ ha.

O kwuru na gọọmenti Naịjirịa kwesiri iche echiche mara uzọ ọzọ dị mma ha ga-eji soro ndị otu Ipob ka e wee meta ha mma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: