Lee mwakpo niile 'unknown gunmen' mere na mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ụbọchị April 19, 2021

Ebe mwakpo mere n'ọwụwa anyanwụ n'ụbọchị April 19, 2021
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ mwakpo mbụ si mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa chee ụwa ihu n'ụtụtụ taa bụ April 9,2021 bụ nke mere n'Ukpo dị n'Anambra steeti.

Ndị o ji egbe egbu wakporo ụlọọrụ ndị uweojiii Zone 13 bụ isi ụlọọrụ n'elekere anọ nke ụtụtụ taa mana ndị uweojii kwụsiri ha tupu ha mebiwe ọtụtụ ihe.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Zone 13 bụ Nkeiruka Nwode kwuru na ya ndị otu ya chụmiri ndị omekome ahụ ọsọ ụkwụ eru ala ma napụta ha ngwa ọgwụ gụnyere egbe.

Onye na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya hụrụ ihe merenu kwuru na ndị uweojii abụọ nwụrụ n'ọdachị ahụ.

Mbọ niile onye ntakụkọ BBC gbara inụta n'ọnụ onụ na-ekwuru ndị uweojii ebe ahụ kpụrụ n'ala makana o bughị ekwe nti ya.

Kirie ka ebe ahụ dị ugbua.

Onụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenganyia kwetere na ya bụ mwakpo mere mana o kwughị na o nwere onye nwụrụnụ.

Ụgbọala gbara ọkụ

Ka ọ dị ugbua , ndị mmadụ na-agagharị eme ihe nke ha mana ọtụtụ ndị uweojii juputere n'akụkụ ebe mwakpo a mere.

Njiji jikwara n'Uzuakoli dị n'Abia steeti

Ụlọọrụ ndị uweojii

Ndị uweojii nke ụlọọrụ dị n'Uzoakoli kwuru na enweghị onye ọbụla nwụrụ na mwakpo ụloọrụ ha dị n'Ụzọakọlị, nke okpuruọchịchị Bende dị n'Abia steeti.Onye ntaakụkọ BBC garụru ebe ahụ kwuru na ọ bụ n'ihe dịka elekere iri abụọ nke ụtụtụ ka ndị a wakporo ya bụ ụloorụ a.Ha gbara ụlọọrụ ndị uweojii a ọkụ ya na ụgbọala ndị nọ ebe ahụ.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Anyị ejidela mmadụ ise aka ha dị n'ogbugbu mmadụ n'Awka n'ụbọchị Sọnde - Ndị Uweojii

Unizik Junction

Taa ka ndị Uweojii nọ n'Anambara steeti kwuptere na aka ha akparala mmadụ ise a na-eche na aka ha dị n'ogbugbu mmadụ mere n'ụbọchị ụka n'isi obodo steeti ahụ bụ Awka.

Nke a na-abịa dịka ndị amabeghi ndị ha bụ gburu ihe a na-eche ruru mmadụ ise na Aroma Junction na Unizik Junction n'abalị Sọnde.

Ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ ekweghị ekwu okwu n'onyonyo mana ha kwuru na a na-eche na ọ bụ ndị otu nzuzo kpara ike a.

Mkpa mkpa a na-ebo ndị otu nzuzo na-akpasi ike n'Anambara na nso nso a.

Ndị uweoji kwukwara na ha na-agba mbọ ịkwụsị ya site n'ime ka ndị ntorobịa mata na uru adịghị n'isonye na ụdịrị atụmatụ ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: